2 Timothy 2 (BOICB)

1 Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye. 2 Ihe niile nke ị nụrụ nʼọnụ m nʼihu ọtụtụ ndị ama ka ị ga-enyefe nʼaka ndị kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a. 3 Soro m kere oke nʼahụhụ dị ka ezi onye agha Jisọs Kraịst. 4 Ọ dịghị onye agha ọbụla na-ekekọta onwe ya nʼihe nke ụwa a, kama ọ na-achọ ime ihe ga-atọ onye họpụtara ya dị ka onye agha ụtọ. 5 Otu aka ahụ, onye na-agba ọsọ agaghị enweta okpu mmeri, ma ọ bụrụ na ọ gbaghị ọsọ ya dịka usoro iwu ịgba ọsọ si dị. 6 Onye ọrụ ubi na-adọgbu onwe ya nʼọrụ kwesiri ịbụ onye ga-ebu ụzọ rie mkpụrụ sitere nʼubi ya. 7 Na-atụgharị uche nʼihe m kwuru, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enye gị nghọta nʼime ha niile. 8 Echefula Jisọs Kraịst, onye a kpọlitere site nʼọnwụ, onye sikwa nʼagbụrụ Devid, nke a bụ oziọma m. 9 Ọ bụ nʼihi na m na-ekwu eziokwu ndị a ka m ji nọọ na-ahụ ahụhụ dị otu a dị ka onye ọjọọ, ma otu ọ dị, ekeghị okwu Chineke agbụ. 10 Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi. 11 Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi:Ọ bụrụ na anyị esoro ya nwụọ,anyị ga-esokwa ya dị ndụ. 12 Ọ bụrụ na anyị anagide,anyị ga-esokwa ya chịa ọchịchị.Ọ bụrụ na anyị ajụ ya,ọ ga-ajụkwa anyị. 13 Ọ bụrụ na anyị ekweghị ekwe,ọ ga-anọgide nʼikwesị ntụkwasị obi,nʼihi na o nweghị ike ịjụ onwe ya. 14 Na-echetara ha nke a, na-agwasikwa ha ike nʼaha Chineke ka ha ghara ịrụ ụka banyere okwu efu. Nʼihi na okwu ndị a abaghị uru, ha na-ewetara ndị na-anụ ya ịla nʼiyi. 15 Gbalịsie ike ka iche onwe gị nʼihu Chineke dị ka onye a nabatara. Onye ọrụ nke ihere na-apụghị ime, onye na-akọwa eziokwu ahụ nke ọma. 16 Zere onwe gị nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, nʼihi na ọ na-aga nʼihu iduba ndị mmadụ nʼọnọdụ amaghị Chineke karịa. 17 Ozizi ha ga-agbasa dị ka nsị, Haimeniọs na Filetus soo na ndị dị otu a. 18 Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, na-asị na oge mbilite nʼọnwụ agafeela. Site nʼokwu ha, ha na-ekpu okwukwe mmadụ ụfọdụ ihu nʼala. 19 Ma ntọala Chineke hiwere na-eguzosi ike. Nʼelu ya ka eji ihe e dere kaa akara: “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya,” ya na, “Ka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ibi ndụ ajọ omume.” 20 Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla. 21 Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ. 22 Gbanarị ihe ọbụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorobịa na-enwe nʼime gị, kama, na-agbaso ezi omume na okwukwe, na ịhụnanya na udo, ka gị na ndị na-akpọkukwa Onyenwe anyị site nʼobi dị ọcha na-emekọrịta. 23 Wezuga onwe gị nʼịrụ ụka nzuzu na nke amaghị ihe niile, nʼihi na ị maara na ha na-eweta ise okwu. 24 O kwesikwaghị ka ohu Onyenwe anyị bụrụ onye na-ese okwu, kama, ọ ga-abụ onye obiọma nye mmadụ niile, na onye ma otu e si ezi ihe, onye dị njikere ịnagide ihe ọjọọ e mere ya. 25 Ọ ga-ejiri obi dị nwayọ mgbe ọ na-adụ ndị iro ya ọdụ. Eleghị anya Chineke nwere ike mee ka ha chegharịa, bịa mata eziokwu. 26 Mgbe ahụ, ha nwere ike gbanahụ ọnya ekwensu, ka o jidechara ha ka ha mee uche ya.

In Other Versions

2 Timothy 2 in the ANGEFD

2 Timothy 2 in the ANTPNG2D

2 Timothy 2 in the AS21

2 Timothy 2 in the BAGH

2 Timothy 2 in the BBPNG

2 Timothy 2 in the BBT1E

2 Timothy 2 in the BDS

2 Timothy 2 in the BEV

2 Timothy 2 in the BHAD

2 Timothy 2 in the BIB

2 Timothy 2 in the BLPT

2 Timothy 2 in the BNT

2 Timothy 2 in the BNTABOOT

2 Timothy 2 in the BNTLV

2 Timothy 2 in the BOATCB

2 Timothy 2 in the BOATCB2

2 Timothy 2 in the BOBCV

2 Timothy 2 in the BOCNT

2 Timothy 2 in the BOECS

2 Timothy 2 in the BOGWICC

2 Timothy 2 in the BOHCB

2 Timothy 2 in the BOHCV

2 Timothy 2 in the BOHLNT

2 Timothy 2 in the BOHNTLTAL

2 Timothy 2 in the BOILNTAP

2 Timothy 2 in the BOITCV

2 Timothy 2 in the BOKCV

2 Timothy 2 in the BOKCV2

2 Timothy 2 in the BOKHWOG

2 Timothy 2 in the BOKSSV

2 Timothy 2 in the BOLCB

2 Timothy 2 in the BOLCB2

2 Timothy 2 in the BOMCV

2 Timothy 2 in the BONAV

2 Timothy 2 in the BONCB

2 Timothy 2 in the BONLT

2 Timothy 2 in the BONUT2

2 Timothy 2 in the BOPLNT

2 Timothy 2 in the BOSCB

2 Timothy 2 in the BOSNC

2 Timothy 2 in the BOTLNT

2 Timothy 2 in the BOVCB

2 Timothy 2 in the BOYCB

2 Timothy 2 in the BPBB

2 Timothy 2 in the BPH

2 Timothy 2 in the BSB

2 Timothy 2 in the CCB

2 Timothy 2 in the CUV

2 Timothy 2 in the CUVS

2 Timothy 2 in the DBT

2 Timothy 2 in the DGDNT

2 Timothy 2 in the DHNT

2 Timothy 2 in the DNT

2 Timothy 2 in the ELBE

2 Timothy 2 in the EMTV

2 Timothy 2 in the ESV

2 Timothy 2 in the FBV

2 Timothy 2 in the FEB

2 Timothy 2 in the GGMNT

2 Timothy 2 in the GNT

2 Timothy 2 in the HARY

2 Timothy 2 in the HNT

2 Timothy 2 in the IRVA

2 Timothy 2 in the IRVB

2 Timothy 2 in the IRVG

2 Timothy 2 in the IRVH

2 Timothy 2 in the IRVK

2 Timothy 2 in the IRVM

2 Timothy 2 in the IRVM2

2 Timothy 2 in the IRVO

2 Timothy 2 in the IRVP

2 Timothy 2 in the IRVT

2 Timothy 2 in the IRVT2

2 Timothy 2 in the IRVU

2 Timothy 2 in the ISVN

2 Timothy 2 in the JSNT

2 Timothy 2 in the KAPI

2 Timothy 2 in the KBT1ETNIK

2 Timothy 2 in the KBV

2 Timothy 2 in the KJV

2 Timothy 2 in the KNFD

2 Timothy 2 in the LBA

2 Timothy 2 in the LBLA

2 Timothy 2 in the LNT

2 Timothy 2 in the LSV

2 Timothy 2 in the MAAL

2 Timothy 2 in the MBV

2 Timothy 2 in the MBV2

2 Timothy 2 in the MHNT

2 Timothy 2 in the MKNFD

2 Timothy 2 in the MNG

2 Timothy 2 in the MNT

2 Timothy 2 in the MNT2

2 Timothy 2 in the MRS1T

2 Timothy 2 in the NAA

2 Timothy 2 in the NASB

2 Timothy 2 in the NBLA

2 Timothy 2 in the NBS

2 Timothy 2 in the NBVTP

2 Timothy 2 in the NET2

2 Timothy 2 in the NIV11

2 Timothy 2 in the NNT

2 Timothy 2 in the NNT2

2 Timothy 2 in the NNT3

2 Timothy 2 in the PDDPT

2 Timothy 2 in the PFNT

2 Timothy 2 in the RMNT

2 Timothy 2 in the SBIAS

2 Timothy 2 in the SBIBS

2 Timothy 2 in the SBIBS2

2 Timothy 2 in the SBICS

2 Timothy 2 in the SBIDS

2 Timothy 2 in the SBIGS

2 Timothy 2 in the SBIHS

2 Timothy 2 in the SBIIS

2 Timothy 2 in the SBIIS2

2 Timothy 2 in the SBIIS3

2 Timothy 2 in the SBIKS

2 Timothy 2 in the SBIKS2

2 Timothy 2 in the SBIMS

2 Timothy 2 in the SBIOS

2 Timothy 2 in the SBIPS

2 Timothy 2 in the SBISS

2 Timothy 2 in the SBITS

2 Timothy 2 in the SBITS2

2 Timothy 2 in the SBITS3

2 Timothy 2 in the SBITS4

2 Timothy 2 in the SBIUS

2 Timothy 2 in the SBIVS

2 Timothy 2 in the SBT

2 Timothy 2 in the SBT1E

2 Timothy 2 in the SCHL

2 Timothy 2 in the SNT

2 Timothy 2 in the SUSU

2 Timothy 2 in the SUSU2

2 Timothy 2 in the SYNO

2 Timothy 2 in the TBIAOTANT

2 Timothy 2 in the TBT1E

2 Timothy 2 in the TBT1E2

2 Timothy 2 in the TFTIP

2 Timothy 2 in the TFTU

2 Timothy 2 in the TGNTATF3T

2 Timothy 2 in the THAI

2 Timothy 2 in the TNFD

2 Timothy 2 in the TNT

2 Timothy 2 in the TNTIK

2 Timothy 2 in the TNTIL

2 Timothy 2 in the TNTIN

2 Timothy 2 in the TNTIP

2 Timothy 2 in the TNTIZ

2 Timothy 2 in the TOMA

2 Timothy 2 in the TTENT

2 Timothy 2 in the UBG

2 Timothy 2 in the UGV

2 Timothy 2 in the UGV2

2 Timothy 2 in the UGV3

2 Timothy 2 in the VBL

2 Timothy 2 in the VDCC

2 Timothy 2 in the YALU

2 Timothy 2 in the YAPE

2 Timothy 2 in the YBVTP

2 Timothy 2 in the ZBP