Acts 19 (BOICB)

1 Mgbe Apọlọs nọ na Kọrint, Pọl sitere ụzọ nke nʼime elu ala bịarute Efesọs. Nʼebe ahụ, ọ hụrụ ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ, 2 sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?”Ha sịrị ya, “Mba, anyị anụbeghị na ọ nwere ihe dịka Mmụọ Nsọ.” 3 Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?”Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.” 4 Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.” 5 Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs. 6 Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma. 7 Ha niile ruru ndị ikom iri na abụọ. 8 Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a. 9 Ma ụfọdụ nʼime ha mechiri obi ha; ha juru ikwenye, kama ha kwuru okwu ọjọọ megide Ụzọ ahụ nʼihu ọgbakọ ahụ niile. Ya mere, o sitere nʼebe ha nọ pụọ, kpọrọkwa ndị na-eso ụzọ ahụ, ha na-akparịta ụka kwa ụbọchị nʼụlọ ọgbakọ Tiranọs. 10 Ihe ndị a gakwara nʼihu afọ abụọ. Ndị niile bi na Eshịa nụkwara oziọma Onyenwe anyị. Ọtụtụ nʼime ha bụ ndị Juu, ma ndị ọzọ bụ ndị Griik. 11 Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche. 12 Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ. 13 Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nʼaha Onyenwe anyị Jisọs na-asị, “E ji m aha Jisọs, onye Pọl na-ekwusa na-enye unu iwu ka unu site nʼime ya pụta.” 14 Ndị na-eme ihe dị otu a bụ ụmụ asaa nke Skiva, onyeisi nchụaja, bụ onye Juu. 15 Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?” 16 Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị makwasịrị ha, tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbara ọtọ gbapụ nʼụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ. 17 Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs niile. Mgbe ahụ, ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidekwara ha. Nʼihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nʼebe niile. 18 Ọtụtụ ndị kwenyerenụ bịara na-ekwupụta omume ọjọọ ha niile, nʼihu mmadụ niile. 19 Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise. 20 Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire. 21 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.” 22 O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge. 23 Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ. 24 Otu onye ụzụ na-agbaze ọlaọcha, aha ya bụ Dimitriọs, onye ji ọlaọcha na-akpụ ụlọ arụsị ala ahụ a na-akpọ Atemis. Ọ na-ewetara ya na ndị ụzụ ibe ya ego nʼebe o hiri nne. 25 Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị. 26 Unu niile ahụla ma nụkwa, otu nwoke a na-akpọ Pọl si rafuo ọtụtụ ndị mmadụ site nʼime ka ha kwenye na chi ọbụla e ji aka mee abụghị chi. Ọ bụkwaghị naanị nʼEfesọs kama ọ fọdụrụ ihe nta ka ọ bụrụ nʼEshịa niile. 27 Ọ bụkwaghị naanị na ihe ize ndụ dị banyere ọrụ aka anyị nke a ga elelị kama tinyere nke a, ụlọ nke oke chi nwanyị bụ Atemis agaghị enwekwa nsọpụrụ. Ya bụ, chi nwanyị nʼonwe ya bụ onye a na-efe nʼobodo Eshịa niile nakwa nʼelu ụwa niile ka a ga-anapụ nkwanye ugwu dịrị ya dịka chi.” 28 Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha were oke iwe tie mkpu na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!” 29 Ọgbaaghara ahụ gbasara, zuo obodo ahụ niile. Ha banyere nʼebe a na-eme ihe ileleanya, kpọpụta Gaiọs na Arịstakọs ndị Masidonia, bụ ndị ha na Pọl na-arụkọ ọrụ. 30 Pọl chọrọ ịbakwuru igwe mmadụ ahụ, ma ndị na-eso ụzọ ahụ ekweghị ya. 31 Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nʼetiti ndị na-achị Eshịa zigakwaara ya ozi na-arịọ ya ka ọ hapụ ịbanye nʼebe ahụ a na-eme ihe ileleanya. 32 Ugbu a, nzukọ ahụ na-agba aghara, ụfọdụ mmadụ na-eti mkpu otu ihe, ndị ọzọ na-eti ihe ọzọ. Nʼezie, ọtụtụ nʼime ha amatakwaghị ihe ha jiri nọdụ nʼebe ahụ. 33 Ụfọdụ ndị Juu nʼime ọgbakọ ahụ nupuru Alegzanda, sepụta ya, mee ka o buru ụzọ. Alegzanda feere ha aka ka ha dere duu mgbe ọ chọrọ ịgọrọ onwe ya nʼihu ọha mmadụ ahụ. 34 Ma nʼotu ntabi anya ahụ, mgbe ha matara na ọ bụ onye Juu, ha bidoro iti mkpu ihe dịka ogologo awa abụọ na-asị, “Atemis ndị Efesọs dị ukwuu!” 35 Nʼikpeazụ, ode akwụkwọ nke obodo ahụ kwụsịrị igwe mmadụ ahụ ime ụzụ. O kwuru, “Ndị ikom Efesọs, o nwere onye na-amaghị na obodo Efesọs bụ obodo na-echekwa ụlọ ofufe Atemis, na oyiyi ya nke si nʼeluigwe daa? 36 Ebe ihe ndị a adịghị na ngọpụ, ọ dị mkpa ka unu nọdụ nwayọọ, ghara imebi ihe ọbụla nʼecheghị echiche. 37 Lee ugbu a, ndị a unu kpọtara nʼebe a abụghị ndị ohi, ndị na-ezuru ihe nʼogige chi anyị, maọbụ na-ekwutọ eze nwanyị arụsị anyị. 38 Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ọkpụ ụzụ ibe ya nwere ihe ọbụla megide ha, ha gaa nʼụlọikpe. Ndị na-ekpe ikpe ga-eleba okwu ha anya. Kama ha mee ya nʼusoro iwu kwadoro. 39 Ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ dị iche unu chọrọ ka e mee, a ga-edozi ya na nzukọ nke ndị obodo na-eme nʼụzọ ziri ezi. 40 Nʼihi na egwu dị, na-eleghị anya a ga-eji ihe nke mere taa boo anyị ebubo na anyị na-ebute ọgbaaghara. Anyị enweghị ọsịsa ziri ezi banyere ọgbaaghara nke a.” 41 Mgbe o kwuchara nke a, ọ gbasara ha.

In Other Versions

Acts 19 in the ANGEFD

Acts 19 in the ANTPNG2D

Acts 19 in the AS21

Acts 19 in the BAGH

Acts 19 in the BBPNG

Acts 19 in the BBT1E

Acts 19 in the BDS

Acts 19 in the BEV

Acts 19 in the BHAD

Acts 19 in the BIB

Acts 19 in the BLPT

Acts 19 in the BNT

Acts 19 in the BNTABOOT

Acts 19 in the BNTLV

Acts 19 in the BOATCB

Acts 19 in the BOATCB2

Acts 19 in the BOBCV

Acts 19 in the BOCNT

Acts 19 in the BOECS

Acts 19 in the BOGWICC

Acts 19 in the BOHCB

Acts 19 in the BOHCV

Acts 19 in the BOHLNT

Acts 19 in the BOHNTLTAL

Acts 19 in the BOILNTAP

Acts 19 in the BOITCV

Acts 19 in the BOKCV

Acts 19 in the BOKCV2

Acts 19 in the BOKHWOG

Acts 19 in the BOKSSV

Acts 19 in the BOLCB

Acts 19 in the BOLCB2

Acts 19 in the BOMCV

Acts 19 in the BONAV

Acts 19 in the BONCB

Acts 19 in the BONLT

Acts 19 in the BONUT2

Acts 19 in the BOPLNT

Acts 19 in the BOSCB

Acts 19 in the BOSNC

Acts 19 in the BOTLNT

Acts 19 in the BOVCB

Acts 19 in the BOYCB

Acts 19 in the BPBB

Acts 19 in the BPH

Acts 19 in the BSB

Acts 19 in the CCB

Acts 19 in the CUV

Acts 19 in the CUVS

Acts 19 in the DBT

Acts 19 in the DGDNT

Acts 19 in the DHNT

Acts 19 in the DNT

Acts 19 in the ELBE

Acts 19 in the EMTV

Acts 19 in the ESV

Acts 19 in the FBV

Acts 19 in the FEB

Acts 19 in the GGMNT

Acts 19 in the GNT

Acts 19 in the HARY

Acts 19 in the HNT

Acts 19 in the IRVA

Acts 19 in the IRVB

Acts 19 in the IRVG

Acts 19 in the IRVH

Acts 19 in the IRVK

Acts 19 in the IRVM

Acts 19 in the IRVM2

Acts 19 in the IRVO

Acts 19 in the IRVP

Acts 19 in the IRVT

Acts 19 in the IRVT2

Acts 19 in the IRVU

Acts 19 in the ISVN

Acts 19 in the JSNT

Acts 19 in the KAPI

Acts 19 in the KBT1ETNIK

Acts 19 in the KBV

Acts 19 in the KJV

Acts 19 in the KNFD

Acts 19 in the LBA

Acts 19 in the LBLA

Acts 19 in the LNT

Acts 19 in the LSV

Acts 19 in the MAAL

Acts 19 in the MBV

Acts 19 in the MBV2

Acts 19 in the MHNT

Acts 19 in the MKNFD

Acts 19 in the MNG

Acts 19 in the MNT

Acts 19 in the MNT2

Acts 19 in the MRS1T

Acts 19 in the NAA

Acts 19 in the NASB

Acts 19 in the NBLA

Acts 19 in the NBS

Acts 19 in the NBVTP

Acts 19 in the NET2

Acts 19 in the NIV11

Acts 19 in the NNT

Acts 19 in the NNT2

Acts 19 in the NNT3

Acts 19 in the PDDPT

Acts 19 in the PFNT

Acts 19 in the RMNT

Acts 19 in the SBIAS

Acts 19 in the SBIBS

Acts 19 in the SBIBS2

Acts 19 in the SBICS

Acts 19 in the SBIDS

Acts 19 in the SBIGS

Acts 19 in the SBIHS

Acts 19 in the SBIIS

Acts 19 in the SBIIS2

Acts 19 in the SBIIS3

Acts 19 in the SBIKS

Acts 19 in the SBIKS2

Acts 19 in the SBIMS

Acts 19 in the SBIOS

Acts 19 in the SBIPS

Acts 19 in the SBISS

Acts 19 in the SBITS

Acts 19 in the SBITS2

Acts 19 in the SBITS3

Acts 19 in the SBITS4

Acts 19 in the SBIUS

Acts 19 in the SBIVS

Acts 19 in the SBT

Acts 19 in the SBT1E

Acts 19 in the SCHL

Acts 19 in the SNT

Acts 19 in the SUSU

Acts 19 in the SUSU2

Acts 19 in the SYNO

Acts 19 in the TBIAOTANT

Acts 19 in the TBT1E

Acts 19 in the TBT1E2

Acts 19 in the TFTIP

Acts 19 in the TFTU

Acts 19 in the TGNTATF3T

Acts 19 in the THAI

Acts 19 in the TNFD

Acts 19 in the TNT

Acts 19 in the TNTIK

Acts 19 in the TNTIL

Acts 19 in the TNTIN

Acts 19 in the TNTIP

Acts 19 in the TNTIZ

Acts 19 in the TOMA

Acts 19 in the TTENT

Acts 19 in the UBG

Acts 19 in the UGV

Acts 19 in the UGV2

Acts 19 in the UGV3

Acts 19 in the VBL

Acts 19 in the VDCC

Acts 19 in the YALU

Acts 19 in the YAPE

Acts 19 in the YBVTP

Acts 19 in the ZBP