Acts 21 (BOICB)

1 Mgbe anyị hapụsịrị ha, anyị nyapụrụ ụgbọ anyị bịaruo Kos. Nʼechi ya, anyị rutere Rods. Anyị sitere nʼebe ahụ jeruo Patara. 2 Mgbe anyị hụrụ ụgbọ mmiri na-aga Fonisia, anyị banyere nʼime ya kwọpụ. 3 Mgbe anyị kwọruru ụgbọ anyị ebe anyị nwere ike ịhụ Saiprọs, anyị siri nʼaka ekpe ya gafee, ruo Siria. Anyị rutere nʼọnụ mmiri Taịa, ebe ụgbọ mmiri ga-akwapụ ibu dị nʼime ya. 4 Mgbe anyị chọtara ndị na-eso ụzọ ahụ, anyị nọnyere ha abalị asaa. Ha gwara Pọl site nʼike nke Mmụọ Nsọ, ka ọ ghara ịga Jerusalem. 5 Mgbe anyị nọzuru ụbọchị anyị, anyị hapụrụ ha, bilie ije. Ha na nwunye ha na ụmụ ha so dupu ruo mgbe anyị si nʼobodo ahụ pụọ. Anyị na ha gburu ikpere nʼala nʼọnụ mmiri kpee ekpere. 6 Mgbe ahụ, anyị kelere onwe anyị ekele ikpeazụ. Emesịa, anyị banyere nʼime ụgbọ, ma ha laghachiri azụ nʼụlọ ha. 7 Mgbe anyị hapụrụ Taịa, anyị kwụsịrị na Tolomas. Nʼebe a anyị kelekwara ndị kwere ekwe nọ nʼime obodo a, nọnyere ha naanị otu ụbọchị. 8 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ. 9 O nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-alụbeghị di. Ha nwekwara onyinye ibu amụma. 10 Mgbe anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, ka otu onye amụma a na-akpọ Agabọs, si Judịa bata. 11 Ọ bịakwutere anyị, chilite belịt Pọl na-eke nʼukwu, kee onwe ya nʼụkwụ na aka sị, “Dịka Mmụọ Nsọ kwuru, ‘otu a ka ndị ndu ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nʼaka ndị mba ọzọ.’ ” 12 Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem. 13 Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.” 14 Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.” 15 Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga Jerusalem. 16 Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ. 17 Mgbe anyị rutere Jerusalem, ndị ụmụnna jiri obi ụtọ nabata anyị. 18 Nʼụbọchị nke so ya, anyị na Pọl gara ileta Jemis, ndị okenye niile nọkwa nʼebe ahụ. 19 Mgbe o kelechara ha, ọ kọọrọ ha nʼotu nʼotu, ihe niile Chineke rụrụ nʼetiti ndị mba ọzọ site nʼije ozi ya. 20 Mgbe ha nụchara nke a, ha nyere Chineke otuto. Emesịa, ha sịrị Pọl, “Leenụ nwanna, otu ọtụtụ puku ndị Juu si bụrụ ndị kwere ekwe, ha niile ka ihe banyere iwu a na-anụ ọkụ nʼobi. 21 A kọọrọla ha ihe banyere gị, na ị na-ezi ndị Juu bi nʼetiti ndị mba ọzọ ka ha hapụ ịgbasokwa iwu Mosis, na ka ha kwụsịkwa ibi ụmụ ha ugwu maọbụ bie ndụ nʼusoro omenaala anyị. 22 Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a? O doro anya na ha ga-amata na ị bịara nʼebe a. 23 Ya bụ, jisie ike mee ihe anyị ga-agwa gị ugbu a. Anyị nwere mmadụ anọ nʼebe a, ndị nọ na nkwa ha kwere Chineke. 24 Soro ha mee omenaala ahụ nke ndị nọ na nkwa ji edo onwe ha ọcha. Kwụọrọ ha ụgwọ maka ịkpụcha isi ha. I mee otu a, mmadụ niile ga-amata na eziokwu adịghị nʼihe ndị a niile e kwuru maka gị, kama na gị onwe gị na-agazi ma na-edebekwa iwu. 25 Ma nʼebe ndị mba ọzọ kwere ekwe nọ, anyị edegarala ha akwụkwọ gwa ha kwụsị iri ihe ọbụla a chụrụ nʼaja nye arụsị, na iri ọbara, maọbụ anụ a nyagburu anyagbu, ya na ịkwa iko.” 26 Pọl kpọọrọ ndị ikom anọ ndị ahụ tinyere onwe ya, nʼụbọchị so ya mee ka ya na ha dị ọcha. Mgbe ahụ, ọ banyere nʼụlọnsọ ukwu ahụ, maka ikwupụta ụbọchị ole mmemme ịdị ọcha ahụ ga-anọ tupu e mechaa ya, nakwa mgbe ịchụ aja nʼihi ha nʼotu nʼotu ga-abụ. 27 Ma mgbe ọ fọdụrụ nwa oge nta ka ụbọchị asaa ahụ gwụchaa, ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ha tikuru igwe mmadụ ma kpaliekwa ha. Ha jidere ya, 28 na-eti mkpu, “Ndị ikom Izrel, nyerenụ anyị aka! Onye a bụ nwoke ahụ na-ejegharị nʼebe niile na-ezi ozizi megidere ndị nke anyị, iwu anyị nakwa ebe a. Ma nke kachasị nke, ọ merụọkwala ụlọnsọ a site nʼịkpọbata ndị Griik nʼime ya.” 29 (Nʼihi na ha ebula ụzọ hụ ya na Trofimọs onye Efesọs nʼime obodo, ha chere na Pọl kpọbatara ya nʼụlọnsọ ukwu ahụ.) 30 Ọgbaaghara jupụtara nʼobodo ahụ niile. Ndị mmadụ gbakọtara dọkpụpụta Pọl site nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Nʼotu mgbe ahụ, e mechiri ọnụ ụzọ niile. 31 Mgbe ha na-achọ igbu ya, ozi ruru ọchịagha ntị na Jerusalem niile nọ nʼọgbaaghara. 32 Otu mgbe ahụ o duuru ụfọdụ ndịisi agha ya na ndị agha ya mee ngwangwa bịaruo nʼebe ha nọ. Mgbe ha hụrụ ndị agha ka ha na-abịa, ha kwụsịrị iti Pọl ihe. 33 Ọchịagha ahụ bịara jide ya, nye iwu ka e were ụdọ igwe abụọ kee ya agbụ, ọ jụkwara onye ọ bụ na ihe o mere. 34 Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu na-ekwu otu ihe, ebe ụfọdụ na-eti na-ekwu ihe ọzọ. Mgbe ọ na-apụghị ịchọpụta ihe bụ isi mkpọtụ na ọgbaaghara ahụ, o nyere iwu ka e duru ya gaa nʼogige ndị agha. 35 Mgbe o rutere na mgbagolite ọnụ ụzọ ụlọ ahụ, ndị agha bulitere ya elu nʼihi ọgbaaghara igwe ndị mmadụ dị ukwuu. 36 Igwe mmadụ ahụ so ha nọ na-eti mkpu, “Wepụnụ ya! Wepụnụ ya!” 37 Mgbe ha chọrọ iduba Pọl nʼime ogige ahụ, ọ sịrị ọchịagha ahụ, “Ị ga-ekwe ka m gwa gị okwu?”Ọ sịrị, “I maara asụ asụsụ ndị Griik? 38 Ọ pụtara na ị bụghị onye Ijipt ahụ malitere ọgbaaghara ma duuru puku ndị ogbu mmadụ anọ gbalaa nʼọzara?” 39 Pọl sịrị, “Abụ m onye Juu si Tasọs, obodo dị na Silisia, nwa afọ oke obodo amara aha ya. Biko, kwee ka m gwa ndị mmadụ okwu.” 40 Mgbe o nyere ya ikike, Pọl guzooro nʼihe nrigo nke ọnụ ụzọ ahụ fee aka ya ime ka ha nọọ duu. Mgbe ha nọdụrụ nwayọọ, ọ gwara ha okwu nʼasụsụ Hibru sị,

In Other Versions

Acts 21 in the ANGEFD

Acts 21 in the ANTPNG2D

Acts 21 in the AS21

Acts 21 in the BAGH

Acts 21 in the BBPNG

Acts 21 in the BBT1E

Acts 21 in the BDS

Acts 21 in the BEV

Acts 21 in the BHAD

Acts 21 in the BIB

Acts 21 in the BLPT

Acts 21 in the BNT

Acts 21 in the BNTABOOT

Acts 21 in the BNTLV

Acts 21 in the BOATCB

Acts 21 in the BOATCB2

Acts 21 in the BOBCV

Acts 21 in the BOCNT

Acts 21 in the BOECS

Acts 21 in the BOGWICC

Acts 21 in the BOHCB

Acts 21 in the BOHCV

Acts 21 in the BOHLNT

Acts 21 in the BOHNTLTAL

Acts 21 in the BOILNTAP

Acts 21 in the BOITCV

Acts 21 in the BOKCV

Acts 21 in the BOKCV2

Acts 21 in the BOKHWOG

Acts 21 in the BOKSSV

Acts 21 in the BOLCB

Acts 21 in the BOLCB2

Acts 21 in the BOMCV

Acts 21 in the BONAV

Acts 21 in the BONCB

Acts 21 in the BONLT

Acts 21 in the BONUT2

Acts 21 in the BOPLNT

Acts 21 in the BOSCB

Acts 21 in the BOSNC

Acts 21 in the BOTLNT

Acts 21 in the BOVCB

Acts 21 in the BOYCB

Acts 21 in the BPBB

Acts 21 in the BPH

Acts 21 in the BSB

Acts 21 in the CCB

Acts 21 in the CUV

Acts 21 in the CUVS

Acts 21 in the DBT

Acts 21 in the DGDNT

Acts 21 in the DHNT

Acts 21 in the DNT

Acts 21 in the ELBE

Acts 21 in the EMTV

Acts 21 in the ESV

Acts 21 in the FBV

Acts 21 in the FEB

Acts 21 in the GGMNT

Acts 21 in the GNT

Acts 21 in the HARY

Acts 21 in the HNT

Acts 21 in the IRVA

Acts 21 in the IRVB

Acts 21 in the IRVG

Acts 21 in the IRVH

Acts 21 in the IRVK

Acts 21 in the IRVM

Acts 21 in the IRVM2

Acts 21 in the IRVO

Acts 21 in the IRVP

Acts 21 in the IRVT

Acts 21 in the IRVT2

Acts 21 in the IRVU

Acts 21 in the ISVN

Acts 21 in the JSNT

Acts 21 in the KAPI

Acts 21 in the KBT1ETNIK

Acts 21 in the KBV

Acts 21 in the KJV

Acts 21 in the KNFD

Acts 21 in the LBA

Acts 21 in the LBLA

Acts 21 in the LNT

Acts 21 in the LSV

Acts 21 in the MAAL

Acts 21 in the MBV

Acts 21 in the MBV2

Acts 21 in the MHNT

Acts 21 in the MKNFD

Acts 21 in the MNG

Acts 21 in the MNT

Acts 21 in the MNT2

Acts 21 in the MRS1T

Acts 21 in the NAA

Acts 21 in the NASB

Acts 21 in the NBLA

Acts 21 in the NBS

Acts 21 in the NBVTP

Acts 21 in the NET2

Acts 21 in the NIV11

Acts 21 in the NNT

Acts 21 in the NNT2

Acts 21 in the NNT3

Acts 21 in the PDDPT

Acts 21 in the PFNT

Acts 21 in the RMNT

Acts 21 in the SBIAS

Acts 21 in the SBIBS

Acts 21 in the SBIBS2

Acts 21 in the SBICS

Acts 21 in the SBIDS

Acts 21 in the SBIGS

Acts 21 in the SBIHS

Acts 21 in the SBIIS

Acts 21 in the SBIIS2

Acts 21 in the SBIIS3

Acts 21 in the SBIKS

Acts 21 in the SBIKS2

Acts 21 in the SBIMS

Acts 21 in the SBIOS

Acts 21 in the SBIPS

Acts 21 in the SBISS

Acts 21 in the SBITS

Acts 21 in the SBITS2

Acts 21 in the SBITS3

Acts 21 in the SBITS4

Acts 21 in the SBIUS

Acts 21 in the SBIVS

Acts 21 in the SBT

Acts 21 in the SBT1E

Acts 21 in the SCHL

Acts 21 in the SNT

Acts 21 in the SUSU

Acts 21 in the SUSU2

Acts 21 in the SYNO

Acts 21 in the TBIAOTANT

Acts 21 in the TBT1E

Acts 21 in the TBT1E2

Acts 21 in the TFTIP

Acts 21 in the TFTU

Acts 21 in the TGNTATF3T

Acts 21 in the THAI

Acts 21 in the TNFD

Acts 21 in the TNT

Acts 21 in the TNTIK

Acts 21 in the TNTIL

Acts 21 in the TNTIN

Acts 21 in the TNTIP

Acts 21 in the TNTIZ

Acts 21 in the TOMA

Acts 21 in the TTENT

Acts 21 in the UBG

Acts 21 in the UGV

Acts 21 in the UGV2

Acts 21 in the UGV3

Acts 21 in the VBL

Acts 21 in the VDCC

Acts 21 in the YALU

Acts 21 in the YAPE

Acts 21 in the YBVTP

Acts 21 in the ZBP