Acts 27 (BOICB)

1 Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs. 2 Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a. 3 Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma. 4 Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs. 5 Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia. 6 Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya. 7 Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee. 8 Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia. 9 Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ, 10 na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.” 11 Ma ọchịagha ahụ kwenyere nʼihe onyeisi ụgbọ na onye nwe ụgbọ kwuru karịa nke Pọl kwuru. 12 Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda. 13 Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit. 14 Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata. 15 Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku. 16 Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ. 17 Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga. 18 Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri. 19 Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri. 20 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị. 21 Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a. 22 Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu. 23 Nʼihi na nʼabalị gara aga, mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m, 24 ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’ 25 Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m. 26 Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.” 27 Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso. 28 Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu. 29 Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ. 30 Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ. 31 Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.” 32 Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri. 33 Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla. 34 Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.” 35 Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya. 36 Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri. 37 Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii. 38 Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe. 39 Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee. 40 Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala. 41 Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ. 42 Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo. 43 Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala. 44 Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.

In Other Versions

Acts 27 in the ANGEFD

Acts 27 in the ANTPNG2D

Acts 27 in the AS21

Acts 27 in the BAGH

Acts 27 in the BBPNG

Acts 27 in the BBT1E

Acts 27 in the BDS

Acts 27 in the BEV

Acts 27 in the BHAD

Acts 27 in the BIB

Acts 27 in the BLPT

Acts 27 in the BNT

Acts 27 in the BNTABOOT

Acts 27 in the BNTLV

Acts 27 in the BOATCB

Acts 27 in the BOATCB2

Acts 27 in the BOBCV

Acts 27 in the BOCNT

Acts 27 in the BOECS

Acts 27 in the BOGWICC

Acts 27 in the BOHCB

Acts 27 in the BOHCV

Acts 27 in the BOHLNT

Acts 27 in the BOHNTLTAL

Acts 27 in the BOILNTAP

Acts 27 in the BOITCV

Acts 27 in the BOKCV

Acts 27 in the BOKCV2

Acts 27 in the BOKHWOG

Acts 27 in the BOKSSV

Acts 27 in the BOLCB

Acts 27 in the BOLCB2

Acts 27 in the BOMCV

Acts 27 in the BONAV

Acts 27 in the BONCB

Acts 27 in the BONLT

Acts 27 in the BONUT2

Acts 27 in the BOPLNT

Acts 27 in the BOSCB

Acts 27 in the BOSNC

Acts 27 in the BOTLNT

Acts 27 in the BOVCB

Acts 27 in the BOYCB

Acts 27 in the BPBB

Acts 27 in the BPH

Acts 27 in the BSB

Acts 27 in the CCB

Acts 27 in the CUV

Acts 27 in the CUVS

Acts 27 in the DBT

Acts 27 in the DGDNT

Acts 27 in the DHNT

Acts 27 in the DNT

Acts 27 in the ELBE

Acts 27 in the EMTV

Acts 27 in the ESV

Acts 27 in the FBV

Acts 27 in the FEB

Acts 27 in the GGMNT

Acts 27 in the GNT

Acts 27 in the HARY

Acts 27 in the HNT

Acts 27 in the IRVA

Acts 27 in the IRVB

Acts 27 in the IRVG

Acts 27 in the IRVH

Acts 27 in the IRVK

Acts 27 in the IRVM

Acts 27 in the IRVM2

Acts 27 in the IRVO

Acts 27 in the IRVP

Acts 27 in the IRVT

Acts 27 in the IRVT2

Acts 27 in the IRVU

Acts 27 in the ISVN

Acts 27 in the JSNT

Acts 27 in the KAPI

Acts 27 in the KBT1ETNIK

Acts 27 in the KBV

Acts 27 in the KJV

Acts 27 in the KNFD

Acts 27 in the LBA

Acts 27 in the LBLA

Acts 27 in the LNT

Acts 27 in the LSV

Acts 27 in the MAAL

Acts 27 in the MBV

Acts 27 in the MBV2

Acts 27 in the MHNT

Acts 27 in the MKNFD

Acts 27 in the MNG

Acts 27 in the MNT

Acts 27 in the MNT2

Acts 27 in the MRS1T

Acts 27 in the NAA

Acts 27 in the NASB

Acts 27 in the NBLA

Acts 27 in the NBS

Acts 27 in the NBVTP

Acts 27 in the NET2

Acts 27 in the NIV11

Acts 27 in the NNT

Acts 27 in the NNT2

Acts 27 in the NNT3

Acts 27 in the PDDPT

Acts 27 in the PFNT

Acts 27 in the RMNT

Acts 27 in the SBIAS

Acts 27 in the SBIBS

Acts 27 in the SBIBS2

Acts 27 in the SBICS

Acts 27 in the SBIDS

Acts 27 in the SBIGS

Acts 27 in the SBIHS

Acts 27 in the SBIIS

Acts 27 in the SBIIS2

Acts 27 in the SBIIS3

Acts 27 in the SBIKS

Acts 27 in the SBIKS2

Acts 27 in the SBIMS

Acts 27 in the SBIOS

Acts 27 in the SBIPS

Acts 27 in the SBISS

Acts 27 in the SBITS

Acts 27 in the SBITS2

Acts 27 in the SBITS3

Acts 27 in the SBITS4

Acts 27 in the SBIUS

Acts 27 in the SBIVS

Acts 27 in the SBT

Acts 27 in the SBT1E

Acts 27 in the SCHL

Acts 27 in the SNT

Acts 27 in the SUSU

Acts 27 in the SUSU2

Acts 27 in the SYNO

Acts 27 in the TBIAOTANT

Acts 27 in the TBT1E

Acts 27 in the TBT1E2

Acts 27 in the TFTIP

Acts 27 in the TFTU

Acts 27 in the TGNTATF3T

Acts 27 in the THAI

Acts 27 in the TNFD

Acts 27 in the TNT

Acts 27 in the TNTIK

Acts 27 in the TNTIL

Acts 27 in the TNTIN

Acts 27 in the TNTIP

Acts 27 in the TNTIZ

Acts 27 in the TOMA

Acts 27 in the TTENT

Acts 27 in the UBG

Acts 27 in the UGV

Acts 27 in the UGV2

Acts 27 in the UGV3

Acts 27 in the VBL

Acts 27 in the VDCC

Acts 27 in the YALU

Acts 27 in the YAPE

Acts 27 in the YBVTP

Acts 27 in the ZBP