Acts 9 (BOICB)

1 Ma ugbu a, Sọl, onye ume niile ọ na-ekupụta bụ naanị ịba mba na igbu ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị, gakwuuru onyeisi nchụaja, 2 rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem. 3 Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu. 4 Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” 5 Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?”Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu. 6 Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.” 7 Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla. 8 Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs. 9 Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ. 10 Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ, “Ananayas!”Ọ sịrị, “Lee m, Onyenwe anyị.” 11 Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa nʼụlọ Judas nke dị nʼokporoụzọ Guzoziri Eguzo, jụọ ajụjụ banyere onye a na-akpọ Sọl, onye si Tasọs, ọ nọ ugbu a na-ekpe ekpere. 12 Ọ hụla ọhụ na otu nwoke a na-akpọ Ananayas na-abịakwute ya, ibikwasị ya aka nʼisi ka ọ hụ ụzọ.” 13 Ma Ananayas zara, “Onyenwe anyị, anụla m akụkọ ihe ọjọọ niile nwoke a mere ndị nsọ gị bi na Jerusalem. 14 Ugbu a, ọ natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja bịa nʼebe a ka o jide ndị niile na-akpọku aha gị.” 15 Ma Onyenwe anyị gwara ya, “Gaa, nʼihi na ahọpụtala m nwoke a ka ọ bụrụ ngwa ọrụ m, onye ga-ewegara mba ndị ọzọ, ndị eze na ụmụ Izrel aha m. 16 Mụ onwe m ga-egosi ya ụdị ahụhụ ọ na-aghaghị ịta nʼihi aha m.” 17 Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.” 18 Otu mgbe ahụ, ihe dịka akpịrịkpa sitere nʼanya ya dapụta, o bidokwara ịhụ ụzọ ọzọ. O biliri ọtọ, e mee ya baptizim. 19 Mgbe o richara nri, ọ nwetakwara ike ya.Ya na ndị na-eso ụzọ Jisọs nọrọ na Damaskọs ọtụtụ ụbọchị. 20 Ngwangwa, o bidoro ikwusa Jisọs nʼụlọ nzukọ na-asị, Ọ bụ Ọkpara Chineke. 21 O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?” 22 Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ. 23 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ndị Juu gbara izu igbu ya. 24 Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya. 25 Ma ụmụazụ ya kunyere ya na nkata amanyere ụdọ bufee ya nʼofe mgbidi nke obodo. 26 Mgbe o rutere Jerusalem, ọ gbalịrị ịdịnyere ndị na-eso ụzọ Jisọs nọ nʼebe ahụ, ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ ghọọla ezi onye na-eso ụzọ Jisọs dịka ha. 27 Ma Banabas duuru ya gaa nʼebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu o siri hụ Onyenwe anyị na otu o siri gwakwa ya okwu. Na otu o siri kwusaa oziọma nʼaha Jisọs na Damaskọs na-atụghị egwu. 28 O soro ha na-agagharị na Jerusalem. Ọ na-ekwusakwa okwu nʼaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu. 29 Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtakwara ụka. Nʼihi ya ndị a gbara izu igbu ya. 30 Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ banyere nzube ha, ha duuru ya gaa Sizaria site nʼebe ahụ zipụ ya ka ọ laa obodo Tasọs. 31 Mgbe ahụ, nzukọ niile ndị nọ na Judịa, Galili na Sameria, nọọrọ nʼudo, guzosiekwa ike. Ha na-amụba nʼọnụọgụgụ site nʼịtụ egwu nke Onyenwe anyị na ịgbaume nke Mmụọ Nsọ. 32 Pita na-ejegharị nʼetiti ndị kwere ekwe, ọ gakwara leta ndị nsọ nọ nʼobodo Lida. 33 Nʼebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nʼute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34 Pita sịrị ya, “Ainias, Jisọs Kraịst agwọọla gị. Bilie mezie ute gị.” Ngwangwa, Ainias biliri ọtọ. 35 Ndị niile bi na Lida na Sharọn hụrụ ya. Nʼihi ya, ha nabatara Onyenwe anyị. 36 Nʼobodo Jopa, e nwere otu onye nwanyị na-eso ụzọ ya, nke aha ya bụ Tabita nke pụtakwara Dọkas na asụsụ Griik. O jupụtara nʼọrụ ọma, na ọrụ obi ebere nʼebe ụmụ ogbenye nọ. 37 Nʼoge a, ọ rịara ọrịa, nwụọ. Mgbe ha sachara ya ahụ, ha nibere ya nʼotu ime ụlọ dị nʼụlọ elu. 38 Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.” 39 Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ. 40 Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala. 41 O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ. 42 A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị. 43 Ọ nọgidere na Jopa ọtụtụ ụbọchị. Ọ nọdụrụ nʼụlọ Saimọn, onye ọrụ ya bụ idozi akpụkpọ anụ.

In Other Versions

Acts 9 in the ANGEFD

Acts 9 in the ANTPNG2D

Acts 9 in the AS21

Acts 9 in the BAGH

Acts 9 in the BBPNG

Acts 9 in the BBT1E

Acts 9 in the BDS

Acts 9 in the BEV

Acts 9 in the BHAD

Acts 9 in the BIB

Acts 9 in the BLPT

Acts 9 in the BNT

Acts 9 in the BNTABOOT

Acts 9 in the BNTLV

Acts 9 in the BOATCB

Acts 9 in the BOATCB2

Acts 9 in the BOBCV

Acts 9 in the BOCNT

Acts 9 in the BOECS

Acts 9 in the BOGWICC

Acts 9 in the BOHCB

Acts 9 in the BOHCV

Acts 9 in the BOHLNT

Acts 9 in the BOHNTLTAL

Acts 9 in the BOILNTAP

Acts 9 in the BOITCV

Acts 9 in the BOKCV

Acts 9 in the BOKCV2

Acts 9 in the BOKHWOG

Acts 9 in the BOKSSV

Acts 9 in the BOLCB

Acts 9 in the BOLCB2

Acts 9 in the BOMCV

Acts 9 in the BONAV

Acts 9 in the BONCB

Acts 9 in the BONLT

Acts 9 in the BONUT2

Acts 9 in the BOPLNT

Acts 9 in the BOSCB

Acts 9 in the BOSNC

Acts 9 in the BOTLNT

Acts 9 in the BOVCB

Acts 9 in the BOYCB

Acts 9 in the BPBB

Acts 9 in the BPH

Acts 9 in the BSB

Acts 9 in the CCB

Acts 9 in the CUV

Acts 9 in the CUVS

Acts 9 in the DBT

Acts 9 in the DGDNT

Acts 9 in the DHNT

Acts 9 in the DNT

Acts 9 in the ELBE

Acts 9 in the EMTV

Acts 9 in the ESV

Acts 9 in the FBV

Acts 9 in the FEB

Acts 9 in the GGMNT

Acts 9 in the GNT

Acts 9 in the HARY

Acts 9 in the HNT

Acts 9 in the IRVA

Acts 9 in the IRVB

Acts 9 in the IRVG

Acts 9 in the IRVH

Acts 9 in the IRVK

Acts 9 in the IRVM

Acts 9 in the IRVM2

Acts 9 in the IRVO

Acts 9 in the IRVP

Acts 9 in the IRVT

Acts 9 in the IRVT2

Acts 9 in the IRVU

Acts 9 in the ISVN

Acts 9 in the JSNT

Acts 9 in the KAPI

Acts 9 in the KBT1ETNIK

Acts 9 in the KBV

Acts 9 in the KJV

Acts 9 in the KNFD

Acts 9 in the LBA

Acts 9 in the LBLA

Acts 9 in the LNT

Acts 9 in the LSV

Acts 9 in the MAAL

Acts 9 in the MBV

Acts 9 in the MBV2

Acts 9 in the MHNT

Acts 9 in the MKNFD

Acts 9 in the MNG

Acts 9 in the MNT

Acts 9 in the MNT2

Acts 9 in the MRS1T

Acts 9 in the NAA

Acts 9 in the NASB

Acts 9 in the NBLA

Acts 9 in the NBS

Acts 9 in the NBVTP

Acts 9 in the NET2

Acts 9 in the NIV11

Acts 9 in the NNT

Acts 9 in the NNT2

Acts 9 in the NNT3

Acts 9 in the PDDPT

Acts 9 in the PFNT

Acts 9 in the RMNT

Acts 9 in the SBIAS

Acts 9 in the SBIBS

Acts 9 in the SBIBS2

Acts 9 in the SBICS

Acts 9 in the SBIDS

Acts 9 in the SBIGS

Acts 9 in the SBIHS

Acts 9 in the SBIIS

Acts 9 in the SBIIS2

Acts 9 in the SBIIS3

Acts 9 in the SBIKS

Acts 9 in the SBIKS2

Acts 9 in the SBIMS

Acts 9 in the SBIOS

Acts 9 in the SBIPS

Acts 9 in the SBISS

Acts 9 in the SBITS

Acts 9 in the SBITS2

Acts 9 in the SBITS3

Acts 9 in the SBITS4

Acts 9 in the SBIUS

Acts 9 in the SBIVS

Acts 9 in the SBT

Acts 9 in the SBT1E

Acts 9 in the SCHL

Acts 9 in the SNT

Acts 9 in the SUSU

Acts 9 in the SUSU2

Acts 9 in the SYNO

Acts 9 in the TBIAOTANT

Acts 9 in the TBT1E

Acts 9 in the TBT1E2

Acts 9 in the TFTIP

Acts 9 in the TFTU

Acts 9 in the TGNTATF3T

Acts 9 in the THAI

Acts 9 in the TNFD

Acts 9 in the TNT

Acts 9 in the TNTIK

Acts 9 in the TNTIL

Acts 9 in the TNTIN

Acts 9 in the TNTIP

Acts 9 in the TNTIZ

Acts 9 in the TOMA

Acts 9 in the TTENT

Acts 9 in the UBG

Acts 9 in the UGV

Acts 9 in the UGV2

Acts 9 in the UGV3

Acts 9 in the VBL

Acts 9 in the VDCC

Acts 9 in the YALU

Acts 9 in the YAPE

Acts 9 in the YBVTP

Acts 9 in the ZBP