Daniel 10 (BOICB)

1 Nʼafọ atọ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, e nyere Daniel (onye aha ya bụkwa Belteshaza mkpughe). Ozi ahụ bụ eziokwu, ọ gbasakwara oke ọgbaaghara. Ọ ghọtara ozi ahụ, nwetakwa nkọwa banyere ọhụ ahụ. 2 Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ. 3 Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile. 4 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris, 5 eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya. 6 Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ. 7 Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha. 8 Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ. 9 Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra. 10 Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ. 11 Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji. 12 Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha. 13 Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa. 14 Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.” 15 Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla. 16 Mgbe ahụ, otu onye, nke yiri mmadụ, bịara metụ egbugbere ọnụ m aka, mee ka m nwee ike ikwukwa okwu ọzọ. Mgbe ahụ agwara m onye ahụ nke guzo m nʼihu, “Anọ m nʼoke ihe mgbu; Onyenwe m, enwekwaghị m ike ọbụla, nʼihi ọhụ m hụrụ. 17 Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.” 18 Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike. 19 Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.”Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.” 20 Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa; 21 ma otu ọ dị, aga m agwa gị ihe e dere nʼakwụkwọ nke eziokwu. (Ọ dịghị onye na-enyere m aka imegide ha ma ọ bụghị naanị Maikel onyeisi unu.

In Other Versions

Daniel 10 in the ANGEFD

Daniel 10 in the ANTPNG2D

Daniel 10 in the AS21

Daniel 10 in the BAGH

Daniel 10 in the BBPNG

Daniel 10 in the BBT1E

Daniel 10 in the BDS

Daniel 10 in the BEV

Daniel 10 in the BHAD

Daniel 10 in the BIB

Daniel 10 in the BLPT

Daniel 10 in the BNT

Daniel 10 in the BNTABOOT

Daniel 10 in the BNTLV

Daniel 10 in the BOATCB

Daniel 10 in the BOATCB2

Daniel 10 in the BOBCV

Daniel 10 in the BOCNT

Daniel 10 in the BOECS

Daniel 10 in the BOGWICC

Daniel 10 in the BOHCB

Daniel 10 in the BOHCV

Daniel 10 in the BOHLNT

Daniel 10 in the BOHNTLTAL

Daniel 10 in the BOILNTAP

Daniel 10 in the BOITCV

Daniel 10 in the BOKCV

Daniel 10 in the BOKCV2

Daniel 10 in the BOKHWOG

Daniel 10 in the BOKSSV

Daniel 10 in the BOLCB

Daniel 10 in the BOLCB2

Daniel 10 in the BOMCV

Daniel 10 in the BONAV

Daniel 10 in the BONCB

Daniel 10 in the BONLT

Daniel 10 in the BONUT2

Daniel 10 in the BOPLNT

Daniel 10 in the BOSCB

Daniel 10 in the BOSNC

Daniel 10 in the BOTLNT

Daniel 10 in the BOVCB

Daniel 10 in the BOYCB

Daniel 10 in the BPBB

Daniel 10 in the BPH

Daniel 10 in the BSB

Daniel 10 in the CCB

Daniel 10 in the CUV

Daniel 10 in the CUVS

Daniel 10 in the DBT

Daniel 10 in the DGDNT

Daniel 10 in the DHNT

Daniel 10 in the DNT

Daniel 10 in the ELBE

Daniel 10 in the EMTV

Daniel 10 in the ESV

Daniel 10 in the FBV

Daniel 10 in the FEB

Daniel 10 in the GGMNT

Daniel 10 in the GNT

Daniel 10 in the HARY

Daniel 10 in the HNT

Daniel 10 in the IRVA

Daniel 10 in the IRVB

Daniel 10 in the IRVG

Daniel 10 in the IRVH

Daniel 10 in the IRVK

Daniel 10 in the IRVM

Daniel 10 in the IRVM2

Daniel 10 in the IRVO

Daniel 10 in the IRVP

Daniel 10 in the IRVT

Daniel 10 in the IRVT2

Daniel 10 in the IRVU

Daniel 10 in the ISVN

Daniel 10 in the JSNT

Daniel 10 in the KAPI

Daniel 10 in the KBT1ETNIK

Daniel 10 in the KBV

Daniel 10 in the KJV

Daniel 10 in the KNFD

Daniel 10 in the LBA

Daniel 10 in the LBLA

Daniel 10 in the LNT

Daniel 10 in the LSV

Daniel 10 in the MAAL

Daniel 10 in the MBV

Daniel 10 in the MBV2

Daniel 10 in the MHNT

Daniel 10 in the MKNFD

Daniel 10 in the MNG

Daniel 10 in the MNT

Daniel 10 in the MNT2

Daniel 10 in the MRS1T

Daniel 10 in the NAA

Daniel 10 in the NASB

Daniel 10 in the NBLA

Daniel 10 in the NBS

Daniel 10 in the NBVTP

Daniel 10 in the NET2

Daniel 10 in the NIV11

Daniel 10 in the NNT

Daniel 10 in the NNT2

Daniel 10 in the NNT3

Daniel 10 in the PDDPT

Daniel 10 in the PFNT

Daniel 10 in the RMNT

Daniel 10 in the SBIAS

Daniel 10 in the SBIBS

Daniel 10 in the SBIBS2

Daniel 10 in the SBICS

Daniel 10 in the SBIDS

Daniel 10 in the SBIGS

Daniel 10 in the SBIHS

Daniel 10 in the SBIIS

Daniel 10 in the SBIIS2

Daniel 10 in the SBIIS3

Daniel 10 in the SBIKS

Daniel 10 in the SBIKS2

Daniel 10 in the SBIMS

Daniel 10 in the SBIOS

Daniel 10 in the SBIPS

Daniel 10 in the SBISS

Daniel 10 in the SBITS

Daniel 10 in the SBITS2

Daniel 10 in the SBITS3

Daniel 10 in the SBITS4

Daniel 10 in the SBIUS

Daniel 10 in the SBIVS

Daniel 10 in the SBT

Daniel 10 in the SBT1E

Daniel 10 in the SCHL

Daniel 10 in the SNT

Daniel 10 in the SUSU

Daniel 10 in the SUSU2

Daniel 10 in the SYNO

Daniel 10 in the TBIAOTANT

Daniel 10 in the TBT1E

Daniel 10 in the TBT1E2

Daniel 10 in the TFTIP

Daniel 10 in the TFTU

Daniel 10 in the TGNTATF3T

Daniel 10 in the THAI

Daniel 10 in the TNFD

Daniel 10 in the TNT

Daniel 10 in the TNTIK

Daniel 10 in the TNTIL

Daniel 10 in the TNTIN

Daniel 10 in the TNTIP

Daniel 10 in the TNTIZ

Daniel 10 in the TOMA

Daniel 10 in the TTENT

Daniel 10 in the UBG

Daniel 10 in the UGV

Daniel 10 in the UGV2

Daniel 10 in the UGV3

Daniel 10 in the VBL

Daniel 10 in the VDCC

Daniel 10 in the YALU

Daniel 10 in the YAPE

Daniel 10 in the YBVTP

Daniel 10 in the ZBP