Deuteronomy 14 (BOICB)

1 Unu onwe unu bụ ụmụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ. 2 Nʼihi na onye dị nsọ ka ị bụ nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị. Ọ bụkwa gị ka ONYENWE ANYỊ họọrọ site na ndị niile nọ nʼelu ụwa, ị bụ ihe oke ọnụahịa nye ya. 3 Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ. 4 Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu, 5 na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu. 6 Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri. 7 Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu. 8 Ezi bụkwa anụ na-adịghị ọcha; ọ bụ ezie na o nwere ụkwụ wara njakpa, ma ọ dịghị atagharị nri. Unu agaghị emetụla ozu ha aka maọbụ rie anụ ha. 9 Nʼime ihe niile e kere eke, dị ndụ, biri na mmiri, unu nwere ike iri nke ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa, 10 ma ihe ọbụla nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa, unu erila ha, nʼihi na ha rụrụ arụ. 11 Unu ga-eri nnụnụ ọbụla dị ọcha, 12 ma unu agaghị eri ndị a: ugo, na udele, na udele ojii, 13 na ndagbụ, na ọgankwọ, na ndagbụ dị iche iche, 14 na ugolọma ọbụla dị iche iche, 15 na enyi nnụnụ, na egbe abalị, na nnụnụ oke osimiri, na egbe dị iche iche, 16 na okwukwu nta, na okwukwu ukwu, na okwukwu nwere mpi, 17 na okwolo na udele, na komorant, 18 na ụgbala, na utù dị iche iche, na nnụnụ ọdụ nta, na ụsụ. 19 Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe rụrụ arụ nye unu, unu erila ha, 20 Ma unu nwere ike iri ụmụ ahụhụ ndị ahụ nwere nku, ndị dị ọcha. 21 Unu erila anụ ọbụla nwụrụ anwụ. Ma otu o si dị, onye ọbịa nʼetiti unu nwere ike rie ya. I nwere ike inye ya, maọbụ resi ya onye ahụ, ma erila ya, nʼihi na onye dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ Chineke gị ka ị bụ.Esila nwa ewu maọbụ nwa atụrụ nʼime mmiri ara nne ya. 22 Ị ghaghị inye otu ụzọ nʼụzọ iri nke mkpụrụ ubi gị afọ niile. 23 Ị ga-erikwa mkpụrụ ndị a nʼihu ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke gị, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ị ga-anọ nʼebe ahụ rie otu ụzọ nʼụzọ iri nke ọka gị, na mmanya vaịnị ọhụrụ gị, na mmanụ oliv gị, na nwa mbụ nke igwe ehi gị, na igwe ewu na atụrụ gị. Ihe e ji eme nke a bụ ka ị mụta ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ Chineke gị ụbọchị ndụ gị niile. 24 Ọ bụrụ na ebe ONYENWE ANYỊ họpụtara dị anya, ọ bụrụkwa na ONYENWE ANYỊ Chineke gị agọziela gị ruo na ị pụghị ibu otu ụzọ nʼụzọ iri gị gaa nʼebe ahụ (nʼihi na ebe ahụ ONYENWE ANYỊ họpụtara dị anya), 25 mgbe ahụ, gbanwee otu ụzọ nʼụzọ iri nata ọlaọcha, were ọlaọcha ahụ jee nʼebe ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị họpụtara. 26 Were ọlaọcha ahụ zụọ ihe ọbụla ị chọrọ: ehi, na atụrụ, na mmanya, maọbụ mmanya siri ike na-aba nʼanya maọbụ ihe ọbụla ọzọ nke ị chọrọ. Mgbe ahụ, gị na ezinaụlọ gị ga-eri nri nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ṅụrịakwa ọṅụ. 27 Echefukwala ime ka ndị Livayị soro gị rie ihe ị kpatara, nʼihi na ha enweghị ihe nketa ọbụla, maọbụ ihe ubi dịka gị. 28 Nʼọgwụgwụ afọ atọ ọbụla, ị ga-eweta otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe ubi gị, chịkọta ha nʼebe a ga-echebe ha nʼobodo gị, 29 ka ndị Livayị, ndị na-enweghị ihe nketa nʼetiti gị, na ndị ọbịa, na ndị inyom di ha nwụrụ anwụ, na ụmụ mgbei niile nọ nʼobodo gị, bịa nʼebe ahụ were nri ha ga-eri, rijuokwa afọ. Nʼụzọ dị otu a, ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agọzi gị, gọziekwa ọrụ aka gị niile.

In Other Versions

Deuteronomy 14 in the ANGEFD

Deuteronomy 14 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 14 in the AS21

Deuteronomy 14 in the BAGH

Deuteronomy 14 in the BBPNG

Deuteronomy 14 in the BBT1E

Deuteronomy 14 in the BDS

Deuteronomy 14 in the BEV

Deuteronomy 14 in the BHAD

Deuteronomy 14 in the BIB

Deuteronomy 14 in the BLPT

Deuteronomy 14 in the BNT

Deuteronomy 14 in the BNTABOOT

Deuteronomy 14 in the BNTLV

Deuteronomy 14 in the BOATCB

Deuteronomy 14 in the BOATCB2

Deuteronomy 14 in the BOBCV

Deuteronomy 14 in the BOCNT

Deuteronomy 14 in the BOECS

Deuteronomy 14 in the BOGWICC

Deuteronomy 14 in the BOHCB

Deuteronomy 14 in the BOHCV

Deuteronomy 14 in the BOHLNT

Deuteronomy 14 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 14 in the BOILNTAP

Deuteronomy 14 in the BOITCV

Deuteronomy 14 in the BOKCV

Deuteronomy 14 in the BOKCV2

Deuteronomy 14 in the BOKHWOG

Deuteronomy 14 in the BOKSSV

Deuteronomy 14 in the BOLCB

Deuteronomy 14 in the BOLCB2

Deuteronomy 14 in the BOMCV

Deuteronomy 14 in the BONAV

Deuteronomy 14 in the BONCB

Deuteronomy 14 in the BONLT

Deuteronomy 14 in the BONUT2

Deuteronomy 14 in the BOPLNT

Deuteronomy 14 in the BOSCB

Deuteronomy 14 in the BOSNC

Deuteronomy 14 in the BOTLNT

Deuteronomy 14 in the BOVCB

Deuteronomy 14 in the BOYCB

Deuteronomy 14 in the BPBB

Deuteronomy 14 in the BPH

Deuteronomy 14 in the BSB

Deuteronomy 14 in the CCB

Deuteronomy 14 in the CUV

Deuteronomy 14 in the CUVS

Deuteronomy 14 in the DBT

Deuteronomy 14 in the DGDNT

Deuteronomy 14 in the DHNT

Deuteronomy 14 in the DNT

Deuteronomy 14 in the ELBE

Deuteronomy 14 in the EMTV

Deuteronomy 14 in the ESV

Deuteronomy 14 in the FBV

Deuteronomy 14 in the FEB

Deuteronomy 14 in the GGMNT

Deuteronomy 14 in the GNT

Deuteronomy 14 in the HARY

Deuteronomy 14 in the HNT

Deuteronomy 14 in the IRVA

Deuteronomy 14 in the IRVB

Deuteronomy 14 in the IRVG

Deuteronomy 14 in the IRVH

Deuteronomy 14 in the IRVK

Deuteronomy 14 in the IRVM

Deuteronomy 14 in the IRVM2

Deuteronomy 14 in the IRVO

Deuteronomy 14 in the IRVP

Deuteronomy 14 in the IRVT

Deuteronomy 14 in the IRVT2

Deuteronomy 14 in the IRVU

Deuteronomy 14 in the ISVN

Deuteronomy 14 in the JSNT

Deuteronomy 14 in the KAPI

Deuteronomy 14 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 14 in the KBV

Deuteronomy 14 in the KJV

Deuteronomy 14 in the KNFD

Deuteronomy 14 in the LBA

Deuteronomy 14 in the LBLA

Deuteronomy 14 in the LNT

Deuteronomy 14 in the LSV

Deuteronomy 14 in the MAAL

Deuteronomy 14 in the MBV

Deuteronomy 14 in the MBV2

Deuteronomy 14 in the MHNT

Deuteronomy 14 in the MKNFD

Deuteronomy 14 in the MNG

Deuteronomy 14 in the MNT

Deuteronomy 14 in the MNT2

Deuteronomy 14 in the MRS1T

Deuteronomy 14 in the NAA

Deuteronomy 14 in the NASB

Deuteronomy 14 in the NBLA

Deuteronomy 14 in the NBS

Deuteronomy 14 in the NBVTP

Deuteronomy 14 in the NET2

Deuteronomy 14 in the NIV11

Deuteronomy 14 in the NNT

Deuteronomy 14 in the NNT2

Deuteronomy 14 in the NNT3

Deuteronomy 14 in the PDDPT

Deuteronomy 14 in the PFNT

Deuteronomy 14 in the RMNT

Deuteronomy 14 in the SBIAS

Deuteronomy 14 in the SBIBS

Deuteronomy 14 in the SBIBS2

Deuteronomy 14 in the SBICS

Deuteronomy 14 in the SBIDS

Deuteronomy 14 in the SBIGS

Deuteronomy 14 in the SBIHS

Deuteronomy 14 in the SBIIS

Deuteronomy 14 in the SBIIS2

Deuteronomy 14 in the SBIIS3

Deuteronomy 14 in the SBIKS

Deuteronomy 14 in the SBIKS2

Deuteronomy 14 in the SBIMS

Deuteronomy 14 in the SBIOS

Deuteronomy 14 in the SBIPS

Deuteronomy 14 in the SBISS

Deuteronomy 14 in the SBITS

Deuteronomy 14 in the SBITS2

Deuteronomy 14 in the SBITS3

Deuteronomy 14 in the SBITS4

Deuteronomy 14 in the SBIUS

Deuteronomy 14 in the SBIVS

Deuteronomy 14 in the SBT

Deuteronomy 14 in the SBT1E

Deuteronomy 14 in the SCHL

Deuteronomy 14 in the SNT

Deuteronomy 14 in the SUSU

Deuteronomy 14 in the SUSU2

Deuteronomy 14 in the SYNO

Deuteronomy 14 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 14 in the TBT1E

Deuteronomy 14 in the TBT1E2

Deuteronomy 14 in the TFTIP

Deuteronomy 14 in the TFTU

Deuteronomy 14 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 14 in the THAI

Deuteronomy 14 in the TNFD

Deuteronomy 14 in the TNT

Deuteronomy 14 in the TNTIK

Deuteronomy 14 in the TNTIL

Deuteronomy 14 in the TNTIN

Deuteronomy 14 in the TNTIP

Deuteronomy 14 in the TNTIZ

Deuteronomy 14 in the TOMA

Deuteronomy 14 in the TTENT

Deuteronomy 14 in the UBG

Deuteronomy 14 in the UGV

Deuteronomy 14 in the UGV2

Deuteronomy 14 in the UGV3

Deuteronomy 14 in the VBL

Deuteronomy 14 in the VDCC

Deuteronomy 14 in the YALU

Deuteronomy 14 in the YAPE

Deuteronomy 14 in the YBVTP

Deuteronomy 14 in the ZBP