Deuteronomy 21 (BOICB)
1 Mgbe ị batara nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị inweta, biri nʼime ya, ọ bụrụ na ị hụ otu onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ nʼime ọhịa, ma ị maghị onye gburu ya, 2 ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ. 3 Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla 4 ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ. 5 Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha ONYENWE ANYỊ, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ. 6 Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ, nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ. 7 Ha ga-ekwupụta sị, “Aka anyị dị ọcha, ọ bụghị anyị gburu nwoke a, anyị amakwaghị onye gburu ya. 8 ONYENWE ANYỊ, kpuchiere ndị gị Izrel mmehie ha, bụ ndị gị ị gbapụtara. Agụla ndị gị dịka ndị ikpe mara nʼihi ọnwụ nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ.” Otu a ka a ga-esi kpuchie mmehie nʼihi mwụfu ọbara ahụ. 9 Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ. 10 Mgbe ị pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na ONYENWE ANYỊ Chineke gị emee ka i merie ndị iro gị, dọta ụfọdụ nʼime ha nʼagha, 11 ọ bụrụ na ị hụ nwaagbọghọ mara mma nke masịrị gị nʼetiti ndị a dọtara nʼagha, i nwere ike iduru ya ka ọ bụrụ nwunye gị. 12 Ị ga-akpọbata ya nʼụlọ gị, mee ka ọ kpụcha agịrị isi ya, bekwaa mbọ ya niile, 13 yipụ uwe ahụ o yi mgbe e jidere ya. Ọ ga-anọdụ nʼụlọ gị ruo ụjụ nʼihi nna ya na nne ya otu ọnwa. Emesịa, i nwere ike ịbakwuru ya ghọọ di ya, ya onwe ya ga-aghọkwa nwunye gị. 14 Ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-ahapụ ya ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Ị gaghị ere ya nʼọnụ ego ọbụla maọbụ kpasi ya agwa dịka ohu, ebe ọ bụ na ị wedala ya nʼala site nʼịhụ ọtọ ya anya. 15 Ọ bụrụ na nwoke lụrụ ndị inyom abụọ, ma hụ otu nʼime ha nʼanya karịa nke ọzọ, ọ bụrụkwa na ndị inyom abụọ ahụ mụtaara ya ụmụ ndị ikom, ma nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị buuru ụzọ mụta nwa nwoke, 16 mgbe nwoke ahụ na-eke ihe onwunwe ya, ọ gaghị ewere oke ruuru ọkpara ya, nke nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị mụtara kenye nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ hụrụ nʼanya mụrụ. 17 Ọ ga-anabata nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ na-ahụghị nʼanya mụtara dị ka ọkpara, nye ya, oke abụọ site nʼihe niile o nwere. Nʼihi na nwoke ahụ bụ mmalite ume ya, ọnọdụ nke ị bụ ọkpara bụkwa nke ya. 18 Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị. 19 Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. 20 Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, “Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke.” 21 Ndị ikom niile nke obodo ahụ ga-ewere nkume tugbuo ya. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ ahụ nʼetiti unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe mere, ụjọ ga-atụkwa ha. 22 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla emee ihe ọjọọ kwesiri ọnwụ, ọ bụrụ na e kpee ya ikpe ọnwụ, kwụgbuo ya nʼosisi, 23 unu agaghị ahapụ ozu ya ka ọ dịgide nʼelu osisi abalị ahụ niile. Hụnụ na e liri ya nʼotu ụbọchị ahụ, nʼihi na onye ọbụla a kwụbara nʼelu osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ. Emerụla ala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
In Other Versions
Deuteronomy 21 in the ANGEFD
Deuteronomy 21 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 21 in the AS21
Deuteronomy 21 in the BAGH
Deuteronomy 21 in the BBPNG
Deuteronomy 21 in the BBT1E
Deuteronomy 21 in the BDS
Deuteronomy 21 in the BEV
Deuteronomy 21 in the BHAD
Deuteronomy 21 in the BIB
Deuteronomy 21 in the BLPT
Deuteronomy 21 in the BNT
Deuteronomy 21 in the BNTABOOT
Deuteronomy 21 in the BNTLV
Deuteronomy 21 in the BOATCB
Deuteronomy 21 in the BOATCB2
Deuteronomy 21 in the BOBCV
Deuteronomy 21 in the BOCNT
Deuteronomy 21 in the BOECS
Deuteronomy 21 in the BOGWICC
Deuteronomy 21 in the BOHCB
Deuteronomy 21 in the BOHCV
Deuteronomy 21 in the BOHLNT
Deuteronomy 21 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 21 in the BOILNTAP
Deuteronomy 21 in the BOITCV
Deuteronomy 21 in the BOKCV
Deuteronomy 21 in the BOKCV2
Deuteronomy 21 in the BOKHWOG
Deuteronomy 21 in the BOKSSV
Deuteronomy 21 in the BOLCB
Deuteronomy 21 in the BOLCB2
Deuteronomy 21 in the BOMCV
Deuteronomy 21 in the BONAV
Deuteronomy 21 in the BONCB
Deuteronomy 21 in the BONLT
Deuteronomy 21 in the BONUT2
Deuteronomy 21 in the BOPLNT
Deuteronomy 21 in the BOSCB
Deuteronomy 21 in the BOSNC
Deuteronomy 21 in the BOTLNT
Deuteronomy 21 in the BOVCB
Deuteronomy 21 in the BOYCB
Deuteronomy 21 in the BPBB
Deuteronomy 21 in the BPH
Deuteronomy 21 in the BSB
Deuteronomy 21 in the CCB
Deuteronomy 21 in the CUV
Deuteronomy 21 in the CUVS
Deuteronomy 21 in the DBT
Deuteronomy 21 in the DGDNT
Deuteronomy 21 in the DHNT
Deuteronomy 21 in the DNT
Deuteronomy 21 in the ELBE
Deuteronomy 21 in the EMTV
Deuteronomy 21 in the ESV
Deuteronomy 21 in the FBV
Deuteronomy 21 in the FEB
Deuteronomy 21 in the GGMNT
Deuteronomy 21 in the GNT
Deuteronomy 21 in the HARY
Deuteronomy 21 in the HNT
Deuteronomy 21 in the IRVA
Deuteronomy 21 in the IRVB
Deuteronomy 21 in the IRVG
Deuteronomy 21 in the IRVH
Deuteronomy 21 in the IRVK
Deuteronomy 21 in the IRVM
Deuteronomy 21 in the IRVM2
Deuteronomy 21 in the IRVO
Deuteronomy 21 in the IRVP
Deuteronomy 21 in the IRVT
Deuteronomy 21 in the IRVT2
Deuteronomy 21 in the IRVU
Deuteronomy 21 in the ISVN
Deuteronomy 21 in the JSNT
Deuteronomy 21 in the KAPI
Deuteronomy 21 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 21 in the KBV
Deuteronomy 21 in the KJV
Deuteronomy 21 in the KNFD
Deuteronomy 21 in the LBA
Deuteronomy 21 in the LBLA
Deuteronomy 21 in the LNT
Deuteronomy 21 in the LSV
Deuteronomy 21 in the MAAL
Deuteronomy 21 in the MBV
Deuteronomy 21 in the MBV2
Deuteronomy 21 in the MHNT
Deuteronomy 21 in the MKNFD
Deuteronomy 21 in the MNG
Deuteronomy 21 in the MNT
Deuteronomy 21 in the MNT2
Deuteronomy 21 in the MRS1T
Deuteronomy 21 in the NAA
Deuteronomy 21 in the NASB
Deuteronomy 21 in the NBLA
Deuteronomy 21 in the NBS
Deuteronomy 21 in the NBVTP
Deuteronomy 21 in the NET2
Deuteronomy 21 in the NIV11
Deuteronomy 21 in the NNT
Deuteronomy 21 in the NNT2
Deuteronomy 21 in the NNT3
Deuteronomy 21 in the PDDPT
Deuteronomy 21 in the PFNT
Deuteronomy 21 in the RMNT
Deuteronomy 21 in the SBIAS
Deuteronomy 21 in the SBIBS
Deuteronomy 21 in the SBIBS2
Deuteronomy 21 in the SBICS
Deuteronomy 21 in the SBIDS
Deuteronomy 21 in the SBIGS
Deuteronomy 21 in the SBIHS
Deuteronomy 21 in the SBIIS
Deuteronomy 21 in the SBIIS2
Deuteronomy 21 in the SBIIS3
Deuteronomy 21 in the SBIKS
Deuteronomy 21 in the SBIKS2
Deuteronomy 21 in the SBIMS
Deuteronomy 21 in the SBIOS
Deuteronomy 21 in the SBIPS
Deuteronomy 21 in the SBISS
Deuteronomy 21 in the SBITS
Deuteronomy 21 in the SBITS2
Deuteronomy 21 in the SBITS3
Deuteronomy 21 in the SBITS4
Deuteronomy 21 in the SBIUS
Deuteronomy 21 in the SBIVS
Deuteronomy 21 in the SBT
Deuteronomy 21 in the SBT1E
Deuteronomy 21 in the SCHL
Deuteronomy 21 in the SNT
Deuteronomy 21 in the SUSU
Deuteronomy 21 in the SUSU2
Deuteronomy 21 in the SYNO
Deuteronomy 21 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 21 in the TBT1E
Deuteronomy 21 in the TBT1E2
Deuteronomy 21 in the TFTIP
Deuteronomy 21 in the TFTU
Deuteronomy 21 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 21 in the THAI
Deuteronomy 21 in the TNFD
Deuteronomy 21 in the TNT
Deuteronomy 21 in the TNTIK
Deuteronomy 21 in the TNTIL
Deuteronomy 21 in the TNTIN
Deuteronomy 21 in the TNTIP
Deuteronomy 21 in the TNTIZ
Deuteronomy 21 in the TOMA
Deuteronomy 21 in the TTENT
Deuteronomy 21 in the UBG
Deuteronomy 21 in the UGV
Deuteronomy 21 in the UGV2
Deuteronomy 21 in the UGV3
Deuteronomy 21 in the VBL
Deuteronomy 21 in the VDCC
Deuteronomy 21 in the YALU
Deuteronomy 21 in the YAPE
Deuteronomy 21 in the YBVTP
Deuteronomy 21 in the ZBP