Deuteronomy 9 (BOICB)

1 Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe. 2 Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?” 3 Ma mata taa na ONYENWE ANYỊ Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka ONYENWE ANYỊ kwere gị na nkwa. 4 Mgbe ONYENWE ANYỊ Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “ONYENWE ANYỊ akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka ONYENWE ANYỊ ji esite nʼihu gị chụpụ ha. 5 Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb. 6 Ya mere, ghọta ya nke ọma na ONYENWE ANYỊ Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike. 7 Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo ONYENWE ANYỊ Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ. 8 Unu kpasuru ONYENWE ANYỊ iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi. 9 Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti ONYENWE ANYỊ na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ. 10 ONYENWE ANYỊ nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke ONYENWE ANYỊ gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. 11 Mgbe iri abalị anọ gwụrụ ONYENWE ANYỊ nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ. 12 Mgbe ahụ ka ONYENWE ANYỊ gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.” 13 ONYENWE ANYỊ gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie. 14 Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.” 15 Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m. 16 Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide ONYENWE ANYỊ Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu ONYENWE ANYỊ wezuga onwe unu ọsịịsọ. 17 Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu. 18 Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu. 19 Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke ONYENWE ANYỊ, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, ONYENWE ANYỊ gere ntị nʼarịrịọ m. 20 Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m ONYENWE ANYỊ arịrịọ nʼihi ya. 21 Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta. 22 Ọzọkwa, unu kpasuru ONYENWE ANYỊ iwe na Tabera, na Masa, ọ bụladị na Kibrọt Hataava. 23 Mgbe ONYENWE ANYỊ si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi. 24 Site nʼụbọchị m maara ndị unu bụ, ọ dịbeghị mgbe unu na-enupughị isi nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ. 25 Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu ONYENWE ANYỊ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi. 26 Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye ONYENWE ANYỊ sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt. 27 Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha. 28 Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYỊ apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’ 29 Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”

In Other Versions

Deuteronomy 9 in the ANGEFD

Deuteronomy 9 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 9 in the AS21

Deuteronomy 9 in the BAGH

Deuteronomy 9 in the BBPNG

Deuteronomy 9 in the BBT1E

Deuteronomy 9 in the BDS

Deuteronomy 9 in the BEV

Deuteronomy 9 in the BHAD

Deuteronomy 9 in the BIB

Deuteronomy 9 in the BLPT

Deuteronomy 9 in the BNT

Deuteronomy 9 in the BNTABOOT

Deuteronomy 9 in the BNTLV

Deuteronomy 9 in the BOATCB

Deuteronomy 9 in the BOATCB2

Deuteronomy 9 in the BOBCV

Deuteronomy 9 in the BOCNT

Deuteronomy 9 in the BOECS

Deuteronomy 9 in the BOGWICC

Deuteronomy 9 in the BOHCB

Deuteronomy 9 in the BOHCV

Deuteronomy 9 in the BOHLNT

Deuteronomy 9 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 9 in the BOILNTAP

Deuteronomy 9 in the BOITCV

Deuteronomy 9 in the BOKCV

Deuteronomy 9 in the BOKCV2

Deuteronomy 9 in the BOKHWOG

Deuteronomy 9 in the BOKSSV

Deuteronomy 9 in the BOLCB

Deuteronomy 9 in the BOLCB2

Deuteronomy 9 in the BOMCV

Deuteronomy 9 in the BONAV

Deuteronomy 9 in the BONCB

Deuteronomy 9 in the BONLT

Deuteronomy 9 in the BONUT2

Deuteronomy 9 in the BOPLNT

Deuteronomy 9 in the BOSCB

Deuteronomy 9 in the BOSNC

Deuteronomy 9 in the BOTLNT

Deuteronomy 9 in the BOVCB

Deuteronomy 9 in the BOYCB

Deuteronomy 9 in the BPBB

Deuteronomy 9 in the BPH

Deuteronomy 9 in the BSB

Deuteronomy 9 in the CCB

Deuteronomy 9 in the CUV

Deuteronomy 9 in the CUVS

Deuteronomy 9 in the DBT

Deuteronomy 9 in the DGDNT

Deuteronomy 9 in the DHNT

Deuteronomy 9 in the DNT

Deuteronomy 9 in the ELBE

Deuteronomy 9 in the EMTV

Deuteronomy 9 in the ESV

Deuteronomy 9 in the FBV

Deuteronomy 9 in the FEB

Deuteronomy 9 in the GGMNT

Deuteronomy 9 in the GNT

Deuteronomy 9 in the HARY

Deuteronomy 9 in the HNT

Deuteronomy 9 in the IRVA

Deuteronomy 9 in the IRVB

Deuteronomy 9 in the IRVG

Deuteronomy 9 in the IRVH

Deuteronomy 9 in the IRVK

Deuteronomy 9 in the IRVM

Deuteronomy 9 in the IRVM2

Deuteronomy 9 in the IRVO

Deuteronomy 9 in the IRVP

Deuteronomy 9 in the IRVT

Deuteronomy 9 in the IRVT2

Deuteronomy 9 in the IRVU

Deuteronomy 9 in the ISVN

Deuteronomy 9 in the JSNT

Deuteronomy 9 in the KAPI

Deuteronomy 9 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 9 in the KBV

Deuteronomy 9 in the KJV

Deuteronomy 9 in the KNFD

Deuteronomy 9 in the LBA

Deuteronomy 9 in the LBLA

Deuteronomy 9 in the LNT

Deuteronomy 9 in the LSV

Deuteronomy 9 in the MAAL

Deuteronomy 9 in the MBV

Deuteronomy 9 in the MBV2

Deuteronomy 9 in the MHNT

Deuteronomy 9 in the MKNFD

Deuteronomy 9 in the MNG

Deuteronomy 9 in the MNT

Deuteronomy 9 in the MNT2

Deuteronomy 9 in the MRS1T

Deuteronomy 9 in the NAA

Deuteronomy 9 in the NASB

Deuteronomy 9 in the NBLA

Deuteronomy 9 in the NBS

Deuteronomy 9 in the NBVTP

Deuteronomy 9 in the NET2

Deuteronomy 9 in the NIV11

Deuteronomy 9 in the NNT

Deuteronomy 9 in the NNT2

Deuteronomy 9 in the NNT3

Deuteronomy 9 in the PDDPT

Deuteronomy 9 in the PFNT

Deuteronomy 9 in the RMNT

Deuteronomy 9 in the SBIAS

Deuteronomy 9 in the SBIBS

Deuteronomy 9 in the SBIBS2

Deuteronomy 9 in the SBICS

Deuteronomy 9 in the SBIDS

Deuteronomy 9 in the SBIGS

Deuteronomy 9 in the SBIHS

Deuteronomy 9 in the SBIIS

Deuteronomy 9 in the SBIIS2

Deuteronomy 9 in the SBIIS3

Deuteronomy 9 in the SBIKS

Deuteronomy 9 in the SBIKS2

Deuteronomy 9 in the SBIMS

Deuteronomy 9 in the SBIOS

Deuteronomy 9 in the SBIPS

Deuteronomy 9 in the SBISS

Deuteronomy 9 in the SBITS

Deuteronomy 9 in the SBITS2

Deuteronomy 9 in the SBITS3

Deuteronomy 9 in the SBITS4

Deuteronomy 9 in the SBIUS

Deuteronomy 9 in the SBIVS

Deuteronomy 9 in the SBT

Deuteronomy 9 in the SBT1E

Deuteronomy 9 in the SCHL

Deuteronomy 9 in the SNT

Deuteronomy 9 in the SUSU

Deuteronomy 9 in the SUSU2

Deuteronomy 9 in the SYNO

Deuteronomy 9 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 9 in the TBT1E

Deuteronomy 9 in the TBT1E2

Deuteronomy 9 in the TFTIP

Deuteronomy 9 in the TFTU

Deuteronomy 9 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 9 in the THAI

Deuteronomy 9 in the TNFD

Deuteronomy 9 in the TNT

Deuteronomy 9 in the TNTIK

Deuteronomy 9 in the TNTIL

Deuteronomy 9 in the TNTIN

Deuteronomy 9 in the TNTIP

Deuteronomy 9 in the TNTIZ

Deuteronomy 9 in the TOMA

Deuteronomy 9 in the TTENT

Deuteronomy 9 in the UBG

Deuteronomy 9 in the UGV

Deuteronomy 9 in the UGV2

Deuteronomy 9 in the UGV3

Deuteronomy 9 in the VBL

Deuteronomy 9 in the VDCC

Deuteronomy 9 in the YALU

Deuteronomy 9 in the YAPE

Deuteronomy 9 in the YBVTP

Deuteronomy 9 in the ZBP