Ephesians 2 (BOICB)
1 Ma unu onwe unu, unu nwụrụ anwụ site na njehie ụzọ na mmehie unu. 2 Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi. 3 Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya. 4 Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ, 5 mere ka anyị soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ; ọ bụladị mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime ajọ omume. Ọ bụ site nʼamara ya ka e ji zọpụta unu. 6 Ọ kpọlitere anyị na ya, mee ka anyị nọdụ ọdụ nʼebe niile nke eluigwe nʼime Kraịst Jisọs. 7 O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs. 8 Nʼihi na ọ bụ site nʼamara ka e ji zọpụta unu site nʼokwukwe. Nke a abụghị ihe unu rụpụtara nʼonwe unu, ọ bụ onyinye nke Chineke. 9 O siteghị nʼọrụ, ka onye ọbụla ghara ịnya isi. 10 Nʼihi na anyị bụ akaọrụ ya, nke o kere nʼime Kraịst Jisọs nʼihi ịrụ ezi ọrụ. Ọ bụ otu a ka Chineke siri kwadoo na anyị kwesiri ibi ndụ ụbọchị niile. 11 Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na “ndị e biri ugwu” na-akpọkwa unu “ndị a na-ebighị ugwu” (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie). 12 Nʼoge ahụ, ọ dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa. 13 Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri. 14 Nʼihi na ya onwe ya bụ udo anyị, o mere ka ụzọ otu abụọ bụrụ otu ihe nʼime ahụ ya, site na ịkwatu mgbidi kewara ha na mgbe ochie, bụ mgbidi nke ịkpọ asị dị nʼetiti anyị. 15 Ọ bụ nʼime anụ ahụ ya ka ọ mere ka iwu ahụ na ụkpụrụ ya niile ghara ịdị ire. Ebumnobi ya bụ i kee nʼime onwe ya otu onye ọhụrụ site na mmadụ abụọ ahụ, si otu a mee ka udo dịrị. 16 Nʼụzọ dị otu a ka ọ ga-esi kpeziere anyị na Chineke site nʼobe ya, wetakwa nʼisi ngwụcha, iro dị nʼetiti ha abụọ. 17 Ya mere, ọ bịara kwusaa udo nye unu ndị nọ ebe dị anya na unu ndị nọ nso, 18 Nʼihi na anyị abụọ sitere nʼaka ya nweta nnabata anyị ịbịa nʼihu Nna site nʼotu Mmụọ ahụ. 19 Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ndị nsọ bụrụ diala na ndị so nʼezinaụlọ Chineke, 20 nke a rụkwasara nʼelu ntọala nke ndị ozi na ndị amụma, nke Kraịst Jisọs nʼonwe ya bụ nkume isi ntọala ya. 21 Ọ bụkwa nʼime ya ka a na-ejikọta ụlọ ahụ niile nke ọma, na-aba ụba, too bụrụ ụlọnsọ, nʼime Onyenwe anyị. 22 Onye a na-ewukọkwa unu onwe unu nʼotu nʼime ya, ka unu niile bụrụ ebe obibi Chineke nʼime Mmụọ.
In Other Versions
Ephesians 2 in the ANGEFD
Ephesians 2 in the ANTPNG2D
Ephesians 2 in the AS21
Ephesians 2 in the BAGH
Ephesians 2 in the BBPNG
Ephesians 2 in the BBT1E
Ephesians 2 in the BDS
Ephesians 2 in the BEV
Ephesians 2 in the BHAD
Ephesians 2 in the BIB
Ephesians 2 in the BLPT
Ephesians 2 in the BNT
Ephesians 2 in the BNTABOOT
Ephesians 2 in the BNTLV
Ephesians 2 in the BOATCB
Ephesians 2 in the BOATCB2
Ephesians 2 in the BOBCV
Ephesians 2 in the BOCNT
Ephesians 2 in the BOECS
Ephesians 2 in the BOGWICC
Ephesians 2 in the BOHCB
Ephesians 2 in the BOHCV
Ephesians 2 in the BOHLNT
Ephesians 2 in the BOHNTLTAL
Ephesians 2 in the BOILNTAP
Ephesians 2 in the BOITCV
Ephesians 2 in the BOKCV
Ephesians 2 in the BOKCV2
Ephesians 2 in the BOKHWOG
Ephesians 2 in the BOKSSV
Ephesians 2 in the BOLCB
Ephesians 2 in the BOLCB2
Ephesians 2 in the BOMCV
Ephesians 2 in the BONAV
Ephesians 2 in the BONCB
Ephesians 2 in the BONLT
Ephesians 2 in the BONUT2
Ephesians 2 in the BOPLNT
Ephesians 2 in the BOSCB
Ephesians 2 in the BOSNC
Ephesians 2 in the BOTLNT
Ephesians 2 in the BOVCB
Ephesians 2 in the BOYCB
Ephesians 2 in the BPBB
Ephesians 2 in the BPH
Ephesians 2 in the BSB
Ephesians 2 in the CCB
Ephesians 2 in the CUV
Ephesians 2 in the CUVS
Ephesians 2 in the DBT
Ephesians 2 in the DGDNT
Ephesians 2 in the DHNT
Ephesians 2 in the DNT
Ephesians 2 in the ELBE
Ephesians 2 in the EMTV
Ephesians 2 in the ESV
Ephesians 2 in the FBV
Ephesians 2 in the FEB
Ephesians 2 in the GGMNT
Ephesians 2 in the GNT
Ephesians 2 in the HARY
Ephesians 2 in the HNT
Ephesians 2 in the IRVA
Ephesians 2 in the IRVB
Ephesians 2 in the IRVG
Ephesians 2 in the IRVH
Ephesians 2 in the IRVK
Ephesians 2 in the IRVM
Ephesians 2 in the IRVM2
Ephesians 2 in the IRVO
Ephesians 2 in the IRVP
Ephesians 2 in the IRVT
Ephesians 2 in the IRVT2
Ephesians 2 in the IRVU
Ephesians 2 in the ISVN
Ephesians 2 in the JSNT
Ephesians 2 in the KAPI
Ephesians 2 in the KBT1ETNIK
Ephesians 2 in the KBV
Ephesians 2 in the KJV
Ephesians 2 in the KNFD
Ephesians 2 in the LBA
Ephesians 2 in the LBLA
Ephesians 2 in the LNT
Ephesians 2 in the LSV
Ephesians 2 in the MAAL
Ephesians 2 in the MBV
Ephesians 2 in the MBV2
Ephesians 2 in the MHNT
Ephesians 2 in the MKNFD
Ephesians 2 in the MNG
Ephesians 2 in the MNT
Ephesians 2 in the MNT2
Ephesians 2 in the MRS1T
Ephesians 2 in the NAA
Ephesians 2 in the NASB
Ephesians 2 in the NBLA
Ephesians 2 in the NBS
Ephesians 2 in the NBVTP
Ephesians 2 in the NET2
Ephesians 2 in the NIV11
Ephesians 2 in the NNT
Ephesians 2 in the NNT2
Ephesians 2 in the NNT3
Ephesians 2 in the PDDPT
Ephesians 2 in the PFNT
Ephesians 2 in the RMNT
Ephesians 2 in the SBIAS
Ephesians 2 in the SBIBS
Ephesians 2 in the SBIBS2
Ephesians 2 in the SBICS
Ephesians 2 in the SBIDS
Ephesians 2 in the SBIGS
Ephesians 2 in the SBIHS
Ephesians 2 in the SBIIS
Ephesians 2 in the SBIIS2
Ephesians 2 in the SBIIS3
Ephesians 2 in the SBIKS
Ephesians 2 in the SBIKS2
Ephesians 2 in the SBIMS
Ephesians 2 in the SBIOS
Ephesians 2 in the SBIPS
Ephesians 2 in the SBISS
Ephesians 2 in the SBITS
Ephesians 2 in the SBITS2
Ephesians 2 in the SBITS3
Ephesians 2 in the SBITS4
Ephesians 2 in the SBIUS
Ephesians 2 in the SBIVS
Ephesians 2 in the SBT
Ephesians 2 in the SBT1E
Ephesians 2 in the SCHL
Ephesians 2 in the SNT
Ephesians 2 in the SUSU
Ephesians 2 in the SUSU2
Ephesians 2 in the SYNO
Ephesians 2 in the TBIAOTANT
Ephesians 2 in the TBT1E
Ephesians 2 in the TBT1E2
Ephesians 2 in the TFTIP
Ephesians 2 in the TFTU
Ephesians 2 in the TGNTATF3T
Ephesians 2 in the THAI
Ephesians 2 in the TNFD
Ephesians 2 in the TNT
Ephesians 2 in the TNTIK
Ephesians 2 in the TNTIL
Ephesians 2 in the TNTIN
Ephesians 2 in the TNTIP
Ephesians 2 in the TNTIZ
Ephesians 2 in the TOMA
Ephesians 2 in the TTENT
Ephesians 2 in the UBG
Ephesians 2 in the UGV
Ephesians 2 in the UGV2
Ephesians 2 in the UGV3
Ephesians 2 in the VBL
Ephesians 2 in the VDCC
Ephesians 2 in the YALU
Ephesians 2 in the YAPE
Ephesians 2 in the YBVTP
Ephesians 2 in the ZBP