Ephesians 6 (BOICB)

1 Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. 2 “Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. 3 “Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.” 4 Ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe kama zụlitenụ ha nʼọzụzụ na nʼozizi nke Onyenwe anyị. 5 Ndị bụ ohu ruberenụ ndị nwee unu isi. Jirinụ nsọpụrụ na egwu na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ. 6 Ruberenụ ha isi, ọ bụghị naanị ka unu nata ihuọma ha mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama dị ka ndị ohu Kraịst, ndị na-eme uche Chineke site nʼobi ha. 7 Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị mmadụ. 8 Nʼihi na unu maara na Onyenwe anyị ga-akwụghachi onye ọbụla maka ihe ọma ọbụla ha mere, ma ha bụ ohu maọbụ ndị nweere onwe ha. 9 Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nʼụzọ dị otu a. Abarala ha mba, nʼihi na ị matara na unu nwere naanị otu Nna ukwu nọ nʼeluigwe. Ile mmadụ anya nʼihu adịghịkwa nʼebe ọ nọ. 10 Nʼikpeazụ, dịnụ ike nʼime Onyenwe anyị na nʼime ike ya dị ukwuu. 11 Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu. 12 Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. 13 Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha niile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ. 14 Meenụ ka eziokwu dịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike, ezi omume bụrụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu. 15 Werenụ njikere nke ikwusa oziọma nke udo yikwasị dị ka akpụkpọ nʼụkwụ unu. 16 Mgbe niile, unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ àkụ niile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nʼebe unu nọ. 17 Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu. 18 Ma kpeenụ ekpere nʼime Mmụọ nʼoge niile na ụdị ekpere na arịrịọ niile. Nọọnụ na njikere mgbe niile ma nọgidekwanụ na-ekpere ndị nsọ niile ekpere oge niile. 19 Na-echetakwanụ m nʼekpere, ka e nye m ike nke mkwuwa okwu, m ga-eji na-ekwupụta ihe omimi nke oziọma na-atụghị egwu ọbụla, 20 nke m ji maka ya bụrụ onye nnọchite anya nọ na mkpọrọ. Kperenụ m ekpere ka m kwupụta ya nʼatụghị egwu ọbụla dị ka m kwesiri ikwu. 21 Ugbu a, iji mee ka unu mara otu m dị na ihe m na-eme, Taịkikọs, nwanna m hụrụ nʼanya na nwaodibo kwesiri ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị ga-akọrọ unu ihe niile. 22 Ana m ezitere ya unu nʼihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị nakwa ka ọ gbaa unu ume. 23 Ka udo na ịhụnanya, tinyere okwukwe nke sitere na Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịịrị unu ụmụnna. 24 Ka amara dịnyere ndị niile ji ịhụnanya na-adịghị anwụ anwụ hụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼanya.

In Other Versions

Ephesians 6 in the ANGEFD

Ephesians 6 in the ANTPNG2D

Ephesians 6 in the AS21

Ephesians 6 in the BAGH

Ephesians 6 in the BBPNG

Ephesians 6 in the BBT1E

Ephesians 6 in the BDS

Ephesians 6 in the BEV

Ephesians 6 in the BHAD

Ephesians 6 in the BIB

Ephesians 6 in the BLPT

Ephesians 6 in the BNT

Ephesians 6 in the BNTABOOT

Ephesians 6 in the BNTLV

Ephesians 6 in the BOATCB

Ephesians 6 in the BOATCB2

Ephesians 6 in the BOBCV

Ephesians 6 in the BOCNT

Ephesians 6 in the BOECS

Ephesians 6 in the BOGWICC

Ephesians 6 in the BOHCB

Ephesians 6 in the BOHCV

Ephesians 6 in the BOHLNT

Ephesians 6 in the BOHNTLTAL

Ephesians 6 in the BOILNTAP

Ephesians 6 in the BOITCV

Ephesians 6 in the BOKCV

Ephesians 6 in the BOKCV2

Ephesians 6 in the BOKHWOG

Ephesians 6 in the BOKSSV

Ephesians 6 in the BOLCB

Ephesians 6 in the BOLCB2

Ephesians 6 in the BOMCV

Ephesians 6 in the BONAV

Ephesians 6 in the BONCB

Ephesians 6 in the BONLT

Ephesians 6 in the BONUT2

Ephesians 6 in the BOPLNT

Ephesians 6 in the BOSCB

Ephesians 6 in the BOSNC

Ephesians 6 in the BOTLNT

Ephesians 6 in the BOVCB

Ephesians 6 in the BOYCB

Ephesians 6 in the BPBB

Ephesians 6 in the BPH

Ephesians 6 in the BSB

Ephesians 6 in the CCB

Ephesians 6 in the CUV

Ephesians 6 in the CUVS

Ephesians 6 in the DBT

Ephesians 6 in the DGDNT

Ephesians 6 in the DHNT

Ephesians 6 in the DNT

Ephesians 6 in the ELBE

Ephesians 6 in the EMTV

Ephesians 6 in the ESV

Ephesians 6 in the FBV

Ephesians 6 in the FEB

Ephesians 6 in the GGMNT

Ephesians 6 in the GNT

Ephesians 6 in the HARY

Ephesians 6 in the HNT

Ephesians 6 in the IRVA

Ephesians 6 in the IRVB

Ephesians 6 in the IRVG

Ephesians 6 in the IRVH

Ephesians 6 in the IRVK

Ephesians 6 in the IRVM

Ephesians 6 in the IRVM2

Ephesians 6 in the IRVO

Ephesians 6 in the IRVP

Ephesians 6 in the IRVT

Ephesians 6 in the IRVT2

Ephesians 6 in the IRVU

Ephesians 6 in the ISVN

Ephesians 6 in the JSNT

Ephesians 6 in the KAPI

Ephesians 6 in the KBT1ETNIK

Ephesians 6 in the KBV

Ephesians 6 in the KJV

Ephesians 6 in the KNFD

Ephesians 6 in the LBA

Ephesians 6 in the LBLA

Ephesians 6 in the LNT

Ephesians 6 in the LSV

Ephesians 6 in the MAAL

Ephesians 6 in the MBV

Ephesians 6 in the MBV2

Ephesians 6 in the MHNT

Ephesians 6 in the MKNFD

Ephesians 6 in the MNG

Ephesians 6 in the MNT

Ephesians 6 in the MNT2

Ephesians 6 in the MRS1T

Ephesians 6 in the NAA

Ephesians 6 in the NASB

Ephesians 6 in the NBLA

Ephesians 6 in the NBS

Ephesians 6 in the NBVTP

Ephesians 6 in the NET2

Ephesians 6 in the NIV11

Ephesians 6 in the NNT

Ephesians 6 in the NNT2

Ephesians 6 in the NNT3

Ephesians 6 in the PDDPT

Ephesians 6 in the PFNT

Ephesians 6 in the RMNT

Ephesians 6 in the SBIAS

Ephesians 6 in the SBIBS

Ephesians 6 in the SBIBS2

Ephesians 6 in the SBICS

Ephesians 6 in the SBIDS

Ephesians 6 in the SBIGS

Ephesians 6 in the SBIHS

Ephesians 6 in the SBIIS

Ephesians 6 in the SBIIS2

Ephesians 6 in the SBIIS3

Ephesians 6 in the SBIKS

Ephesians 6 in the SBIKS2

Ephesians 6 in the SBIMS

Ephesians 6 in the SBIOS

Ephesians 6 in the SBIPS

Ephesians 6 in the SBISS

Ephesians 6 in the SBITS

Ephesians 6 in the SBITS2

Ephesians 6 in the SBITS3

Ephesians 6 in the SBITS4

Ephesians 6 in the SBIUS

Ephesians 6 in the SBIVS

Ephesians 6 in the SBT

Ephesians 6 in the SBT1E

Ephesians 6 in the SCHL

Ephesians 6 in the SNT

Ephesians 6 in the SUSU

Ephesians 6 in the SUSU2

Ephesians 6 in the SYNO

Ephesians 6 in the TBIAOTANT

Ephesians 6 in the TBT1E

Ephesians 6 in the TBT1E2

Ephesians 6 in the TFTIP

Ephesians 6 in the TFTU

Ephesians 6 in the TGNTATF3T

Ephesians 6 in the THAI

Ephesians 6 in the TNFD

Ephesians 6 in the TNT

Ephesians 6 in the TNTIK

Ephesians 6 in the TNTIL

Ephesians 6 in the TNTIN

Ephesians 6 in the TNTIP

Ephesians 6 in the TNTIZ

Ephesians 6 in the TOMA

Ephesians 6 in the TTENT

Ephesians 6 in the UBG

Ephesians 6 in the UGV

Ephesians 6 in the UGV2

Ephesians 6 in the UGV3

Ephesians 6 in the VBL

Ephesians 6 in the VDCC

Ephesians 6 in the YALU

Ephesians 6 in the YAPE

Ephesians 6 in the YBVTP

Ephesians 6 in the ZBP