Esther 8 (BOICB)

1 Nʼotu ụbọchị ahụ, Ahasuerọs bụ eze, nyefere Esta nwunye eze akụnụba niile Heman onye iro ndị Juu nwere. E mekwara ka Mọdekai bịa nʼihu eze, nʼihi na Esta agwala eze na ọ bụ nwanne nna ya. 2 Mgbe ahụ, eze wepụtara ọlaaka ikike ya, nke a gbapụtara site nʼaka Heman nye ya Mọdekai. Esta mekwara Mọdekai onye nlekọta akụnụba Heman. 3 Ọzọkwa, Esta bịara nʼihu eze daa nʼala nʼụkwụ eze rịọ ya arịrịọ nʼanya mmiri ka ọ kwụsị echiche ọjọọ ahụ Heman onye Agag, chere megide ndị Juu. 4 Eze setịpụrụ mkpara ọlaedo ya nye Esta. Esta biliri, guzo nʼihu eze, 5 ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị. 6 Nʼihi na m ga-esi aṅaa nagide ya, ịhụ ka a na-egbu ndị m, na-alakwa ụmụnna m nʼiyi?” 7 Mgbe ahụ, eze bụ Ahasuerọs gwara Esta nwunye eze na Mọdekai onye Juu okwu sị ha, “Enyela m Esta akụnụba Heman, ha akwụgbukwaala Heman nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị Juu nʼiyi. 8 Ugbu a, deenụ akwụkwọ ozi banyere ndị Juu niile, dee ihe ọbụla dị mma nʼanya unu nʼaha eze. Werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, nʼihi na ọ dịghị akwụkwọ ọbụla e dere nʼaha eze, kaakwa ya akara mgbaaka eze nke a pụrụ imegharị.” 9 Otu mgbe ahụ, akpọrọ ndị ode akwụkwọ eze. Ọ bụ nʼiri abalị na atọ nke ọnwa atọ nʼafọ nke bụ ọnwa Sivan ka ihe ndị a mere. Ha dere iwu niile Mọdekai nyere banyere ndị Juu, ndịisi ọchịchị niile na ndị ọchịchị niile na-elekọta mpaghara alaeze niile site nʼIndia ruo Kush. Ọnụọgụgụ ha niile dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E depụtasịrị iwu ahụ nʼodide akwụkwọ nke ala ọbụla a na-achị achị si dị, na dịka asụsụ ndị ọbụla si dị, ma nyekwa ndị Juu dịka odide akwụkwọ na asụsụ ha si dị. 10 Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze. 11 Akwụkwọ nke iwu eze a, nyere ndị Juu niile nọ nʼobodo ọbụla ike izukọta nʼotu maka ịzọ ndụ ha, nyekwa ha ikike ibibi, gbuo ma laa nʼiyi ndị agha nke mba ọbụla, maọbụ ala ndị ahụ a na-achị achị bụ ndị nwere ike ịla ha, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha nʼiyi, na ịpụnara ha akụnụba ha. 12 Ụbọchị a akara aka maka ndị Juu ime ihe ndị a nʼobodo niile nʼalaeze eze Ahasuerọs bụ nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada. 13 E kwukwara nʼakwụkwọ iwu ahụ na a ghaghị ịnabata iwu eze ahụ nʼobodo ọbụla dị nʼalaeze ya. E kwukwara na a ga-agụpụtara ya mmadụ niile, kọwazie ya ime ka ndị Juu niile nọdụ na njikere imeri ndị iro ha. 14 Ndị ahụ na-agba ọsọ, bụ ndị na-ebu akwụkwọ ozi, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya eze mee ngwangwa pụọ, ebe iwu eze kwaliri ha. E nyekwara iwu a na Susa. 15 Mgbe Mọdekai si nʼihu eze pụọ, o yi uwe ndị eze nke na-acha ọcha, na nke na-achakwa anụnụ anụnụ, kpurukwa okpueze ọlaedo dị ukwuu, na uwe mwụda e ji ezi akwa nke na-acha odo odo dụọ nʼahụ ya. Obodo Susa tiri mkpu ṅụrịakwa ọṅụ. 16 Nye ndị Juu nʼonwe ha, ọ bụ oge ịṅụrị ọnụ, obi ụtọ na nsọpụrụ. 17 Na mpaghara alaeze ahụ niile, na nʼobodo ọbụla nke iwu eze ahụ bịaruru, e nwere ọṅụ na obi ụtọ nʼetiti ndị Juu niile, nweekwa oke oriri na ọṅụṅụ. Ọtụtụ mmadụ nʼime ndị si mba dị iche iche ghọrọ ndị Juu, nʼihi egwu ndị Juu dakwasịrị ha.

In Other Versions

Esther 8 in the ANGEFD

Esther 8 in the ANTPNG2D

Esther 8 in the AS21

Esther 8 in the BAGH

Esther 8 in the BBPNG

Esther 8 in the BBT1E

Esther 8 in the BDS

Esther 8 in the BEV

Esther 8 in the BHAD

Esther 8 in the BIB

Esther 8 in the BLPT

Esther 8 in the BNT

Esther 8 in the BNTABOOT

Esther 8 in the BNTLV

Esther 8 in the BOATCB

Esther 8 in the BOATCB2

Esther 8 in the BOBCV

Esther 8 in the BOCNT

Esther 8 in the BOECS

Esther 8 in the BOGWICC

Esther 8 in the BOHCB

Esther 8 in the BOHCV

Esther 8 in the BOHLNT

Esther 8 in the BOHNTLTAL

Esther 8 in the BOILNTAP

Esther 8 in the BOITCV

Esther 8 in the BOKCV

Esther 8 in the BOKCV2

Esther 8 in the BOKHWOG

Esther 8 in the BOKSSV

Esther 8 in the BOLCB

Esther 8 in the BOLCB2

Esther 8 in the BOMCV

Esther 8 in the BONAV

Esther 8 in the BONCB

Esther 8 in the BONLT

Esther 8 in the BONUT2

Esther 8 in the BOPLNT

Esther 8 in the BOSCB

Esther 8 in the BOSNC

Esther 8 in the BOTLNT

Esther 8 in the BOVCB

Esther 8 in the BOYCB

Esther 8 in the BPBB

Esther 8 in the BPH

Esther 8 in the BSB

Esther 8 in the CCB

Esther 8 in the CUV

Esther 8 in the CUVS

Esther 8 in the DBT

Esther 8 in the DGDNT

Esther 8 in the DHNT

Esther 8 in the DNT

Esther 8 in the ELBE

Esther 8 in the EMTV

Esther 8 in the ESV

Esther 8 in the FBV

Esther 8 in the FEB

Esther 8 in the GGMNT

Esther 8 in the GNT

Esther 8 in the HARY

Esther 8 in the HNT

Esther 8 in the IRVA

Esther 8 in the IRVB

Esther 8 in the IRVG

Esther 8 in the IRVH

Esther 8 in the IRVK

Esther 8 in the IRVM

Esther 8 in the IRVM2

Esther 8 in the IRVO

Esther 8 in the IRVP

Esther 8 in the IRVT

Esther 8 in the IRVT2

Esther 8 in the IRVU

Esther 8 in the ISVN

Esther 8 in the JSNT

Esther 8 in the KAPI

Esther 8 in the KBT1ETNIK

Esther 8 in the KBV

Esther 8 in the KJV

Esther 8 in the KNFD

Esther 8 in the LBA

Esther 8 in the LBLA

Esther 8 in the LNT

Esther 8 in the LSV

Esther 8 in the MAAL

Esther 8 in the MBV

Esther 8 in the MBV2

Esther 8 in the MHNT

Esther 8 in the MKNFD

Esther 8 in the MNG

Esther 8 in the MNT

Esther 8 in the MNT2

Esther 8 in the MRS1T

Esther 8 in the NAA

Esther 8 in the NASB

Esther 8 in the NBLA

Esther 8 in the NBS

Esther 8 in the NBVTP

Esther 8 in the NET2

Esther 8 in the NIV11

Esther 8 in the NNT

Esther 8 in the NNT2

Esther 8 in the NNT3

Esther 8 in the PDDPT

Esther 8 in the PFNT

Esther 8 in the RMNT

Esther 8 in the SBIAS

Esther 8 in the SBIBS

Esther 8 in the SBIBS2

Esther 8 in the SBICS

Esther 8 in the SBIDS

Esther 8 in the SBIGS

Esther 8 in the SBIHS

Esther 8 in the SBIIS

Esther 8 in the SBIIS2

Esther 8 in the SBIIS3

Esther 8 in the SBIKS

Esther 8 in the SBIKS2

Esther 8 in the SBIMS

Esther 8 in the SBIOS

Esther 8 in the SBIPS

Esther 8 in the SBISS

Esther 8 in the SBITS

Esther 8 in the SBITS2

Esther 8 in the SBITS3

Esther 8 in the SBITS4

Esther 8 in the SBIUS

Esther 8 in the SBIVS

Esther 8 in the SBT

Esther 8 in the SBT1E

Esther 8 in the SCHL

Esther 8 in the SNT

Esther 8 in the SUSU

Esther 8 in the SUSU2

Esther 8 in the SYNO

Esther 8 in the TBIAOTANT

Esther 8 in the TBT1E

Esther 8 in the TBT1E2

Esther 8 in the TFTIP

Esther 8 in the TFTU

Esther 8 in the TGNTATF3T

Esther 8 in the THAI

Esther 8 in the TNFD

Esther 8 in the TNT

Esther 8 in the TNTIK

Esther 8 in the TNTIL

Esther 8 in the TNTIN

Esther 8 in the TNTIP

Esther 8 in the TNTIZ

Esther 8 in the TOMA

Esther 8 in the TTENT

Esther 8 in the UBG

Esther 8 in the UGV

Esther 8 in the UGV2

Esther 8 in the UGV3

Esther 8 in the VBL

Esther 8 in the VDCC

Esther 8 in the YALU

Esther 8 in the YAPE

Esther 8 in the YBVTP

Esther 8 in the ZBP