Exodus 18 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jetro, nna nwunye Mosis, onye bụkwa onye nchụaja Midia, nụrụ banyere ihe niile Chineke meere Mosis na Izrel ndị nke ya, na ụzọ ONYENWE ANYỊ si napụta Izrel site nʼaka ndị Ijipt. 2 Jetro ọgọ nwoke Mosis kpọọrọ Zipọra, nwunye Mosis, mgbe Mosis chụlara ya 3 na ụmụ ya ndị ikom abụọ. Aha nwa ya nke mbụ bụ Geshọm, nke pụtara, abụ m ọbịa na mba ọzọ. 4 Aha nwa nwoke nke abụọ bụ Elieza, nke bụ, ONYENWE ANYỊ bụ onye inyeaka m. Nʼihi na mgbe Mosis mụrụ Elieza o kwuru sị, “Chineke nna m bụ onye inyeaka m, nʼihi na ọ napụtara m site na mma agha Fero.” 5 Jetro, ọgọ nwoke Mosis, bịakwutere ha nʼime ọzara. O dutere ụmụ ndị ikom Mosis abụọ na nwunye Mosis. Nʼoge ahụ, Mosis na ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu Chineke. 6 O ziri Mosis ozi sị, “Mụ bụ Jetro ọgọ gị nwoke bịakwutere gị, nwunye gị na ụmụ gị abụọ sokwa m.” 7 Nʼihi ya, Mosis gara zute ọgọ ya nwoke, kpọọ isiala nye ọgọ ya, sutu ya ọnụ. Emesịa, ọ kpọbatara ha nʼime ụlọ ikwu ya. Jetro na ọgọ ya Mosis kwurịtara okwu, jụọ ihe banyere otu ihe si agara ibe ha. 8 Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile ONYENWE ANYỊ mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu ONYENWE ANYỊ si napụta ha. 9 Jetro soro Mosis ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu nʼihi ihe niile ONYENWE ANYỊ meere ndị Izrel, na otu o siri napụta ha site nʼaka ndị Ijipt. 10 Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka ONYENWE ANYỊ bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero. 11 Ugbu a, amaara m na ONYENWE ANYỊ kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.” 12 Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke. 13 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. 14 Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?” 15 Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke. 16 Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.” 17 Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma. 18 Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya. 19 Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke. 20 Ihe ọzọ ị ga-eme bụ nke a: ị ga-akụziri ha iwu na ụkpụrụ Chineke, gosikwa ha ụzọ ha ga-esi bie ndụ, na ọrụ ha kwesiri ịrụ. 21 Ma site nʼetiti ndị a họpụta ndị ikom tozuru, ndị ikom na-atụ egwu Chineke, ndị kwesiri ntụkwasị obi na ndị kpọrọ uru nʼezighị ezi asị. Mee ha ndịisi na-achị imerime puku ndị mmadụ, ndịisi narị mmadụ, ndịisi iri mmadụ ise na ndịisi mmadụ iri. 22 Mee ka ha bụrụ ndị ikpe nye ndị mmadụ oge niile. Nye iwu ka ha na-ewetara gị okwu dịkarịsịrị ike, ma na-ekpe ikpe gbasara okwu dị mfe na ndị ọzọ niile dị iche iche. Nʼụzọ dị otu a, ndị ikpe ndị ahụ ga-enyere gị aka ime ka ibu arọ gị dị mfe. 23 Ọ bụrụ na ị ga-eme ihe niile ndị a, ọ bụrụkwa na Chineke ekwenye, ị ga-enwe ike nagide nsogbu niile. Mmadụ niile ga-ewere udo na ọṅụ birikwa.” 24 Mosis gere ntị nʼihe niile nna nwunye ya gwara ya. O mekwara ihe niile o kwuru. 25 O sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta ndị kwesiri ekwesi mee ka ha bụrụ ndịisi. Ụfọdụ ka o mere ndịisi na-elekọta imerime puku mmadụ, ụfọdụ na-achị narị mmadụ, ụfọdụ, iri mmadụ ise, ụfọdụ, mmadụ iri. 26 Ha jere ozi dịka ndị ikpe nye ndị mmadụ nʼoge niile. Ha na-ewetara Mosis okwu niile siri ike, ma ha onwe ha na-ekpe ikpe banyere okwu nke dịkarịsịrị nta. 27 Mgbe ahụ, Mosis zilagara nna nwunye ya. Jetro laghachikwara nʼobodo nke aka ya.

In Other Versions

Exodus 18 in the ANGEFD

Exodus 18 in the ANTPNG2D

Exodus 18 in the AS21

Exodus 18 in the BAGH

Exodus 18 in the BBPNG

Exodus 18 in the BBT1E

Exodus 18 in the BDS

Exodus 18 in the BEV

Exodus 18 in the BHAD

Exodus 18 in the BIB

Exodus 18 in the BLPT

Exodus 18 in the BNT

Exodus 18 in the BNTABOOT

Exodus 18 in the BNTLV

Exodus 18 in the BOATCB

Exodus 18 in the BOATCB2

Exodus 18 in the BOBCV

Exodus 18 in the BOCNT

Exodus 18 in the BOECS

Exodus 18 in the BOGWICC

Exodus 18 in the BOHCB

Exodus 18 in the BOHCV

Exodus 18 in the BOHLNT

Exodus 18 in the BOHNTLTAL

Exodus 18 in the BOILNTAP

Exodus 18 in the BOITCV

Exodus 18 in the BOKCV

Exodus 18 in the BOKCV2

Exodus 18 in the BOKHWOG

Exodus 18 in the BOKSSV

Exodus 18 in the BOLCB

Exodus 18 in the BOLCB2

Exodus 18 in the BOMCV

Exodus 18 in the BONAV

Exodus 18 in the BONCB

Exodus 18 in the BONLT

Exodus 18 in the BONUT2

Exodus 18 in the BOPLNT

Exodus 18 in the BOSCB

Exodus 18 in the BOSNC

Exodus 18 in the BOTLNT

Exodus 18 in the BOVCB

Exodus 18 in the BOYCB

Exodus 18 in the BPBB

Exodus 18 in the BPH

Exodus 18 in the BSB

Exodus 18 in the CCB

Exodus 18 in the CUV

Exodus 18 in the CUVS

Exodus 18 in the DBT

Exodus 18 in the DGDNT

Exodus 18 in the DHNT

Exodus 18 in the DNT

Exodus 18 in the ELBE

Exodus 18 in the EMTV

Exodus 18 in the ESV

Exodus 18 in the FBV

Exodus 18 in the FEB

Exodus 18 in the GGMNT

Exodus 18 in the GNT

Exodus 18 in the HARY

Exodus 18 in the HNT

Exodus 18 in the IRVA

Exodus 18 in the IRVB

Exodus 18 in the IRVG

Exodus 18 in the IRVH

Exodus 18 in the IRVK

Exodus 18 in the IRVM

Exodus 18 in the IRVM2

Exodus 18 in the IRVO

Exodus 18 in the IRVP

Exodus 18 in the IRVT

Exodus 18 in the IRVT2

Exodus 18 in the IRVU

Exodus 18 in the ISVN

Exodus 18 in the JSNT

Exodus 18 in the KAPI

Exodus 18 in the KBT1ETNIK

Exodus 18 in the KBV

Exodus 18 in the KJV

Exodus 18 in the KNFD

Exodus 18 in the LBA

Exodus 18 in the LBLA

Exodus 18 in the LNT

Exodus 18 in the LSV

Exodus 18 in the MAAL

Exodus 18 in the MBV

Exodus 18 in the MBV2

Exodus 18 in the MHNT

Exodus 18 in the MKNFD

Exodus 18 in the MNG

Exodus 18 in the MNT

Exodus 18 in the MNT2

Exodus 18 in the MRS1T

Exodus 18 in the NAA

Exodus 18 in the NASB

Exodus 18 in the NBLA

Exodus 18 in the NBS

Exodus 18 in the NBVTP

Exodus 18 in the NET2

Exodus 18 in the NIV11

Exodus 18 in the NNT

Exodus 18 in the NNT2

Exodus 18 in the NNT3

Exodus 18 in the PDDPT

Exodus 18 in the PFNT

Exodus 18 in the RMNT

Exodus 18 in the SBIAS

Exodus 18 in the SBIBS

Exodus 18 in the SBIBS2

Exodus 18 in the SBICS

Exodus 18 in the SBIDS

Exodus 18 in the SBIGS

Exodus 18 in the SBIHS

Exodus 18 in the SBIIS

Exodus 18 in the SBIIS2

Exodus 18 in the SBIIS3

Exodus 18 in the SBIKS

Exodus 18 in the SBIKS2

Exodus 18 in the SBIMS

Exodus 18 in the SBIOS

Exodus 18 in the SBIPS

Exodus 18 in the SBISS

Exodus 18 in the SBITS

Exodus 18 in the SBITS2

Exodus 18 in the SBITS3

Exodus 18 in the SBITS4

Exodus 18 in the SBIUS

Exodus 18 in the SBIVS

Exodus 18 in the SBT

Exodus 18 in the SBT1E

Exodus 18 in the SCHL

Exodus 18 in the SNT

Exodus 18 in the SUSU

Exodus 18 in the SUSU2

Exodus 18 in the SYNO

Exodus 18 in the TBIAOTANT

Exodus 18 in the TBT1E

Exodus 18 in the TBT1E2

Exodus 18 in the TFTIP

Exodus 18 in the TFTU

Exodus 18 in the TGNTATF3T

Exodus 18 in the THAI

Exodus 18 in the TNFD

Exodus 18 in the TNT

Exodus 18 in the TNTIK

Exodus 18 in the TNTIL

Exodus 18 in the TNTIN

Exodus 18 in the TNTIP

Exodus 18 in the TNTIZ

Exodus 18 in the TOMA

Exodus 18 in the TTENT

Exodus 18 in the UBG

Exodus 18 in the UGV

Exodus 18 in the UGV2

Exodus 18 in the UGV3

Exodus 18 in the VBL

Exodus 18 in the VDCC

Exodus 18 in the YALU

Exodus 18 in the YAPE

Exodus 18 in the YBVTP

Exodus 18 in the ZBP