Exodus 19 (BOICB)

1 Nʼọnwa nke atọ, site nʼoge ndị Izrel hapụchara obodo Ijipt, nʼụbọchị ahụ, ha bịaruru ọzara Saịnaị. 2 Ọ bụ site na Refidim ka ha sị bịaruo ọzara Saịnaị, mee ebe obibi ha nʼebe ahụ, nʼakụkụ ugwu Saịnaị. 3 Mosis rigooro nʼelu ugwu ahụ izute Chineke. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sitere nʼelu ugwu ahụ kpọ Mosis oku sị ya, “Otu a ka ị ga-esi gwa ụlọ Jekọb okwu. Ị ga-akọrọ ụmụ Izrel: 4 ‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m. 5 Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, 6 ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.” 7 Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu. 8 Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla ONYENWE ANYỊ kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara ONYENWE ANYỊ ihe niile ndị Izrel kwuru. 9 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke ONYENWE ANYỊ gwara ya. 10 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri, 11 jikerekwa nʼụbọchị nke atọ. Nʼihi na m ga-arịdata nʼelu ugwu Saịnaị nʼihu mmadụ niile. 12 Ị ga-akpa oke nʼebe ha na-agaghị agafe. Nye ha iwu si ha, ‘Kpacharanụ anya ka unu ghara ịbịa ugwu ahụ nso, maọbụ metụ ala ugwu ahụ aka. Nʼihi na onye ọ bụla metụrụ ugwu ahụ aka aghaghị ịnwụ.’ 13 Agaghị emetụ onye mmebi iwu ahụ aka, kama, a ga-eji nkume tugbuo ya, maọbụ e were àkụ gbagbuo ya, maọbụ mmadụ maọbụ anụmanụ, ọ gaghị adị ndụ. Mmadụ ọbụla agaghị abịaru ugwu ahụ nso, ruo mgbe ha nụrụ opi nke a ga-afụ. Mgbe ahụ, ha nwere ike bịa nso ugwu ahụ.” 14 Ya mere, Mosis si nʼugwu ahụ rịdakwuru ụmụ Izrel. O doo ndị mmadụ ahụ nsọ. Ha niile ji mmiri saa uwe ha. 15 Mosis dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Jikerenụ nʼụbọchị nke atọ. Nwoke na nwanyị enwekwala mmekọrịta ọbụla.” 16 Mgbe o ruru nʼụtụtụ ụbọchị nke atọ ahụ, oke igwe ojii kpuchiri elu ugwu ahụ. Amụma malitere na-egbuke, egbe eluigwe malitekwara ịgba. Nʼikpeazụ, opi ike dara. Mmadụ niile tụrụ egwu, makwa jijiji. 17 Mosis duuru ndị mmadụ ahụ niile si nʼụlọ ikwu ha pụta gaa izute Chineke. Ha niile guzokwara nʼala ugwu ahụ. 18 Mgbe ahụ, anwụrụ ọkụ kpuchiri ugwu Saịnaị. Ma lee! ONYENWE ANYỊ rịdatara dịka ire ọkụ nʼelu ugwu ahụ. Anwụrụ ọkụ rigoro elu dịka anwụrụ ọkụ nke ọhịa na-ere ọkụ. Ala ọma jijiji dị ukwuu dakwasịkwara ugwu ahụ. 19 Mgbe opi ike ahụ na-ada ike ike, Mosis malitere ịgwa Chineke okwu. Chineke zaghachiri Mosis okwu site nʼolu dara ụda dịka egbe eluigwe. 20 ONYENWE ANYỊ rịdatara bịaruo nʼelu ugwu Saịnaị. Ọ gwara Mosis ka ọ rịgota bịa zute ya. Mosis rigoro nʼelu ugwu ahụ ijekwuru Chineke. 21 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Rịda gaa dọọ ndị mmadụ ahụ aka na ntị ka ha ghara ịgafe oke ala ahụ bịaruo nso ịhụ ONYENWE ANYỊ anya ka ha ghara ịla nʼiyi. 22 Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru ONYENWE ANYỊ nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ha niile nwụọ.” 23 Mosis zaghachiri ONYENWE ANYỊ sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’ ” 24 Ma ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị Izrel ghara irigota nʼebe a ịbịakwute ONYENWE ANYỊ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.” 25 Ya mere, Mosis rịdakwuru ndị Izrel ga gwa ha.

In Other Versions

Exodus 19 in the ANGEFD

Exodus 19 in the ANTPNG2D

Exodus 19 in the AS21

Exodus 19 in the BAGH

Exodus 19 in the BBPNG

Exodus 19 in the BBT1E

Exodus 19 in the BDS

Exodus 19 in the BEV

Exodus 19 in the BHAD

Exodus 19 in the BIB

Exodus 19 in the BLPT

Exodus 19 in the BNT

Exodus 19 in the BNTABOOT

Exodus 19 in the BNTLV

Exodus 19 in the BOATCB

Exodus 19 in the BOATCB2

Exodus 19 in the BOBCV

Exodus 19 in the BOCNT

Exodus 19 in the BOECS

Exodus 19 in the BOGWICC

Exodus 19 in the BOHCB

Exodus 19 in the BOHCV

Exodus 19 in the BOHLNT

Exodus 19 in the BOHNTLTAL

Exodus 19 in the BOILNTAP

Exodus 19 in the BOITCV

Exodus 19 in the BOKCV

Exodus 19 in the BOKCV2

Exodus 19 in the BOKHWOG

Exodus 19 in the BOKSSV

Exodus 19 in the BOLCB

Exodus 19 in the BOLCB2

Exodus 19 in the BOMCV

Exodus 19 in the BONAV

Exodus 19 in the BONCB

Exodus 19 in the BONLT

Exodus 19 in the BONUT2

Exodus 19 in the BOPLNT

Exodus 19 in the BOSCB

Exodus 19 in the BOSNC

Exodus 19 in the BOTLNT

Exodus 19 in the BOVCB

Exodus 19 in the BOYCB

Exodus 19 in the BPBB

Exodus 19 in the BPH

Exodus 19 in the BSB

Exodus 19 in the CCB

Exodus 19 in the CUV

Exodus 19 in the CUVS

Exodus 19 in the DBT

Exodus 19 in the DGDNT

Exodus 19 in the DHNT

Exodus 19 in the DNT

Exodus 19 in the ELBE

Exodus 19 in the EMTV

Exodus 19 in the ESV

Exodus 19 in the FBV

Exodus 19 in the FEB

Exodus 19 in the GGMNT

Exodus 19 in the GNT

Exodus 19 in the HARY

Exodus 19 in the HNT

Exodus 19 in the IRVA

Exodus 19 in the IRVB

Exodus 19 in the IRVG

Exodus 19 in the IRVH

Exodus 19 in the IRVK

Exodus 19 in the IRVM

Exodus 19 in the IRVM2

Exodus 19 in the IRVO

Exodus 19 in the IRVP

Exodus 19 in the IRVT

Exodus 19 in the IRVT2

Exodus 19 in the IRVU

Exodus 19 in the ISVN

Exodus 19 in the JSNT

Exodus 19 in the KAPI

Exodus 19 in the KBT1ETNIK

Exodus 19 in the KBV

Exodus 19 in the KJV

Exodus 19 in the KNFD

Exodus 19 in the LBA

Exodus 19 in the LBLA

Exodus 19 in the LNT

Exodus 19 in the LSV

Exodus 19 in the MAAL

Exodus 19 in the MBV

Exodus 19 in the MBV2

Exodus 19 in the MHNT

Exodus 19 in the MKNFD

Exodus 19 in the MNG

Exodus 19 in the MNT

Exodus 19 in the MNT2

Exodus 19 in the MRS1T

Exodus 19 in the NAA

Exodus 19 in the NASB

Exodus 19 in the NBLA

Exodus 19 in the NBS

Exodus 19 in the NBVTP

Exodus 19 in the NET2

Exodus 19 in the NIV11

Exodus 19 in the NNT

Exodus 19 in the NNT2

Exodus 19 in the NNT3

Exodus 19 in the PDDPT

Exodus 19 in the PFNT

Exodus 19 in the RMNT

Exodus 19 in the SBIAS

Exodus 19 in the SBIBS

Exodus 19 in the SBIBS2

Exodus 19 in the SBICS

Exodus 19 in the SBIDS

Exodus 19 in the SBIGS

Exodus 19 in the SBIHS

Exodus 19 in the SBIIS

Exodus 19 in the SBIIS2

Exodus 19 in the SBIIS3

Exodus 19 in the SBIKS

Exodus 19 in the SBIKS2

Exodus 19 in the SBIMS

Exodus 19 in the SBIOS

Exodus 19 in the SBIPS

Exodus 19 in the SBISS

Exodus 19 in the SBITS

Exodus 19 in the SBITS2

Exodus 19 in the SBITS3

Exodus 19 in the SBITS4

Exodus 19 in the SBIUS

Exodus 19 in the SBIVS

Exodus 19 in the SBT

Exodus 19 in the SBT1E

Exodus 19 in the SCHL

Exodus 19 in the SNT

Exodus 19 in the SUSU

Exodus 19 in the SUSU2

Exodus 19 in the SYNO

Exodus 19 in the TBIAOTANT

Exodus 19 in the TBT1E

Exodus 19 in the TBT1E2

Exodus 19 in the TFTIP

Exodus 19 in the TFTU

Exodus 19 in the TGNTATF3T

Exodus 19 in the THAI

Exodus 19 in the TNFD

Exodus 19 in the TNT

Exodus 19 in the TNTIK

Exodus 19 in the TNTIL

Exodus 19 in the TNTIN

Exodus 19 in the TNTIP

Exodus 19 in the TNTIZ

Exodus 19 in the TOMA

Exodus 19 in the TTENT

Exodus 19 in the UBG

Exodus 19 in the UGV

Exodus 19 in the UGV2

Exodus 19 in the UGV3

Exodus 19 in the VBL

Exodus 19 in the VDCC

Exodus 19 in the YALU

Exodus 19 in the YAPE

Exodus 19 in the YBVTP

Exodus 19 in the ZBP