Exodus 2 (BOICB)

1 Nʼoge a, otu nwoke onye Hibru si nʼebo Livayị, gakwara lụọ otu nwaada onye Livayị. 2 Nwanyị a tụụrụ ime, mụọ otu nwa nwoke. Mgbe ọ hụrụ na nwa ọhụrụ ahụ mara mma, o zoro ya nʼụlọ ọnwa atọ. 3 Mgbe ọ na-enweghịkwa ike izo nwantakịrị a gaa nʼihu, o jiri ahịhịa papịrọs kpaa nkata, were korota tee nʼahụ nkata ahụ niile igbochi mmiri ịbata nʼime ya. O kunyere nwantakịrị ahụ nʼime ya buru nkata ahụ debe ya nʼakụkụ osimiri Naịl ebe ahịhịa mmiri na-eto. 4 Nwanne nwantakịrị ahụ, nke nwanyị, gakwara guzo nʼebe dị anya na-eche nwantakịrị ahụ nche, ịhụ ihe ga-eme ya. 5 Ọ dịghị anya, ada Fero bịara nʼakụkụ osimiri Naịl ahụ ịsa ahụ. Mgbe ọ nọ na-asa ahụ, ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi malitere ịgagharị nʼakụkụ osimiri Naịl. Ma ada Fero lepụrụ anya hụ nkata ahụ nʼetiti riidi, zie otu nʼime ohu ya nwanyị ka ọ gaa bute ya. 6 Mgbe o bupụtara ya, meghee ya, ada Fero hụrụ nwantakịrị ahụ ka ọ na-akwa akwa. O nwere ọmịiko nʼebe nwantakịrị ahụ nọ. Ọ sịrị, “Nwatakịrị a ga-abụrịrị otu nʼime ụmụ ndị Hibru.” 7 Mgbe ahụ, nwanne nwanyị nwantakịrị a jụrụ ada Fero sị, “Ọ bụ m gaa chọọrọ gị otu nwanyị nʼime ndị inyom Hibru ka ọ na-elekọtaara gị nwantakịrị a anya?” 8 Ada Fero zaghachiri sị, “Ee, gaa mee otu ahụ.” Nwaagbọghọ ahụ gara ngwangwa nʼụlọ ha kpọọ nne nwantakịrị ahụ. 9 Mgbe ha bịaghachiri, ada Fero gwara nne nwantakịrị ahụ sị ya, “Kuru nwantakịrị a, gaa zụpụtara m ya. Aga m akwụ gị ụgwọ nke ọma.” Ya mere, nwanyị ahụ kuuru nwantakịrị ahụ, gaa zụọ ya. 10 Mgbe nwantakịrị ahụ tolitere, nne ya kulaara ya ada Fero, ka ọ bụrụ nwa ada Fero. Aha ada Fero gụrụ ya bụ Mosis, nʼihi ọ sịrị, “Esi m na mmiri gụpụta ya.” 11 Otu ụbọchị, mgbe Mosis toro, ọ pụrụ gaa nʼebe ụmụnna ya nọ, ilele ha mgbe ha nọ na-arụ ọrụ ike ha. Ọ hụrụ otu onye Ijipt ka ọ na-eti onye Hibru ihe, bụ otu nʼime ụmụnna ya. 12 Mosis lere anya nʼakụkụ abụọ. Mgbe ọ hụrụ na ọ dịghị onye na-ele ya anya, o gburu onye Ijipt ahụ, lie ya nʼime aja. 13 Nʼechi ya, Mosis pụrụ hụ ndị Hibru abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Mosis jụrụ onye nke ikpe mara ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji si otu a na-eti nwanna gị ihe?” 14 Ma onye ahụ jụrụ Mosis ajụjụ sị, “Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ahụ?” Mgbe ahụ Mosis tụrụ ụjọ. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Ndị mmadụ amatala banyere ihe ahụ m mere.” 15 Mgbe Fero nụrụ ihe Mosis mere, ọ gbalịrị igbu Mosis. Ma Mosis si nʼihu Fero gbapụ ọsọ gbaga ala Midia. Nʼebe ahụ ọ gara nọdụ ala nʼakụkụ olulu mmiri. 16 Ma o nwere otu onye nchụaja obodo Midia mụtara ụmụ agbọghọ asaa. Nʼoge a, ha bịara iseta mmiri na ịgbanye ya nʼime ihe ịgbanye mmiri anụ ụlọ maka inye igwe anụ ụlọ nna ha mmiri. 17 Ma ụfọdụ ndị na-azụ atụrụ bịara chụpụ ha. Mosis biliri ọtọ, bịa napụta ha, nyere ha aka nye igwe anụ ụlọ ha mmiri. 18 Ha lọghachikwutere nna ha, Reuel, onye jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọta nʼoge taa?” 19 Ha zara nna ha sị, “Otu onye Ijipt napụtara anyị site nʼaka ndị ọzụzụ atụrụ. O setaara anyị mmiri, nyekwa igwe anụ ụlọ anyị mmiri.” 20 Nna ha jụrụ ha sị, “Olee ebe ọ nọ? Gịnị mere unu ji hapụ ya nʼebe ahụ? Gaanụ kpọọ ya ka o soro anyị rie nri.” 21 Mosis nabatara oku ahụ Reuel kpọrọ ya ka ha na ya biri. O sokwara ha biri. Reuel kpọnyere Mosis Zipọra, otu nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya. 22 Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.” 23 O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị. 24 Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara. 25 Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.

In Other Versions

Exodus 2 in the ANGEFD

Exodus 2 in the ANTPNG2D

Exodus 2 in the AS21

Exodus 2 in the BAGH

Exodus 2 in the BBPNG

Exodus 2 in the BBT1E

Exodus 2 in the BDS

Exodus 2 in the BEV

Exodus 2 in the BHAD

Exodus 2 in the BIB

Exodus 2 in the BLPT

Exodus 2 in the BNT

Exodus 2 in the BNTABOOT

Exodus 2 in the BNTLV

Exodus 2 in the BOATCB

Exodus 2 in the BOATCB2

Exodus 2 in the BOBCV

Exodus 2 in the BOCNT

Exodus 2 in the BOECS

Exodus 2 in the BOGWICC

Exodus 2 in the BOHCB

Exodus 2 in the BOHCV

Exodus 2 in the BOHLNT

Exodus 2 in the BOHNTLTAL

Exodus 2 in the BOILNTAP

Exodus 2 in the BOITCV

Exodus 2 in the BOKCV

Exodus 2 in the BOKCV2

Exodus 2 in the BOKHWOG

Exodus 2 in the BOKSSV

Exodus 2 in the BOLCB

Exodus 2 in the BOLCB2

Exodus 2 in the BOMCV

Exodus 2 in the BONAV

Exodus 2 in the BONCB

Exodus 2 in the BONLT

Exodus 2 in the BONUT2

Exodus 2 in the BOPLNT

Exodus 2 in the BOSCB

Exodus 2 in the BOSNC

Exodus 2 in the BOTLNT

Exodus 2 in the BOVCB

Exodus 2 in the BOYCB

Exodus 2 in the BPBB

Exodus 2 in the BPH

Exodus 2 in the BSB

Exodus 2 in the CCB

Exodus 2 in the CUV

Exodus 2 in the CUVS

Exodus 2 in the DBT

Exodus 2 in the DGDNT

Exodus 2 in the DHNT

Exodus 2 in the DNT

Exodus 2 in the ELBE

Exodus 2 in the EMTV

Exodus 2 in the ESV

Exodus 2 in the FBV

Exodus 2 in the FEB

Exodus 2 in the GGMNT

Exodus 2 in the GNT

Exodus 2 in the HARY

Exodus 2 in the HNT

Exodus 2 in the IRVA

Exodus 2 in the IRVB

Exodus 2 in the IRVG

Exodus 2 in the IRVH

Exodus 2 in the IRVK

Exodus 2 in the IRVM

Exodus 2 in the IRVM2

Exodus 2 in the IRVO

Exodus 2 in the IRVP

Exodus 2 in the IRVT

Exodus 2 in the IRVT2

Exodus 2 in the IRVU

Exodus 2 in the ISVN

Exodus 2 in the JSNT

Exodus 2 in the KAPI

Exodus 2 in the KBT1ETNIK

Exodus 2 in the KBV

Exodus 2 in the KJV

Exodus 2 in the KNFD

Exodus 2 in the LBA

Exodus 2 in the LBLA

Exodus 2 in the LNT

Exodus 2 in the LSV

Exodus 2 in the MAAL

Exodus 2 in the MBV

Exodus 2 in the MBV2

Exodus 2 in the MHNT

Exodus 2 in the MKNFD

Exodus 2 in the MNG

Exodus 2 in the MNT

Exodus 2 in the MNT2

Exodus 2 in the MRS1T

Exodus 2 in the NAA

Exodus 2 in the NASB

Exodus 2 in the NBLA

Exodus 2 in the NBS

Exodus 2 in the NBVTP

Exodus 2 in the NET2

Exodus 2 in the NIV11

Exodus 2 in the NNT

Exodus 2 in the NNT2

Exodus 2 in the NNT3

Exodus 2 in the PDDPT

Exodus 2 in the PFNT

Exodus 2 in the RMNT

Exodus 2 in the SBIAS

Exodus 2 in the SBIBS

Exodus 2 in the SBIBS2

Exodus 2 in the SBICS

Exodus 2 in the SBIDS

Exodus 2 in the SBIGS

Exodus 2 in the SBIHS

Exodus 2 in the SBIIS

Exodus 2 in the SBIIS2

Exodus 2 in the SBIIS3

Exodus 2 in the SBIKS

Exodus 2 in the SBIKS2

Exodus 2 in the SBIMS

Exodus 2 in the SBIOS

Exodus 2 in the SBIPS

Exodus 2 in the SBISS

Exodus 2 in the SBITS

Exodus 2 in the SBITS2

Exodus 2 in the SBITS3

Exodus 2 in the SBITS4

Exodus 2 in the SBIUS

Exodus 2 in the SBIVS

Exodus 2 in the SBT

Exodus 2 in the SBT1E

Exodus 2 in the SCHL

Exodus 2 in the SNT

Exodus 2 in the SUSU

Exodus 2 in the SUSU2

Exodus 2 in the SYNO

Exodus 2 in the TBIAOTANT

Exodus 2 in the TBT1E

Exodus 2 in the TBT1E2

Exodus 2 in the TFTIP

Exodus 2 in the TFTU

Exodus 2 in the TGNTATF3T

Exodus 2 in the THAI

Exodus 2 in the TNFD

Exodus 2 in the TNT

Exodus 2 in the TNTIK

Exodus 2 in the TNTIL

Exodus 2 in the TNTIN

Exodus 2 in the TNTIP

Exodus 2 in the TNTIZ

Exodus 2 in the TOMA

Exodus 2 in the TTENT

Exodus 2 in the UBG

Exodus 2 in the UGV

Exodus 2 in the UGV2

Exodus 2 in the UGV3

Exodus 2 in the VBL

Exodus 2 in the VDCC

Exodus 2 in the YALU

Exodus 2 in the YAPE

Exodus 2 in the YBVTP

Exodus 2 in the ZBP