Exodus 28 (BOICB)

1 “Ugbu a, site nʼetiti ụmụ Izrel kpọbata nwanne gị nwoke Erọn, ya na ụmụ ya ndị ikom, bụ Nadab, na Abihu, na Elieza na Itama. Ka ha jeere m ozi dịka ndị nchụaja. 2 Meere Erọn nwanne gị nwoke uwe nsọ, nke ga-enye ya ugwu na nsọpụrụ. 3 Gwa ndị niile nwere onyinye ǹka nʼịdụ akwa, bụ ndị m nyere amamihe nʼihe ndị a, sị ha dụọrọ Erọn uwe pụrụ iche, nke e ji edo ya nsọ, ime ya onye na-ejere m ozi dịka onye nchụaja. 4 Nke a bụ ụdị uwe ha ga-adụ: Ihe mgbochi obi, efọọd, uwe ime ahụ akpara akpa na-enweghị aka na uwe mwụda buru ibu, na uwe ime ahụ nke tụrụ agwa agwa na akwa a na-atụhị nʼisi na nke a na-eke nʼukwu. Ha ga-adụrụ Erọn nwanne gị nwoke na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a dị nsọ. Ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. 5 Ka ha jiri ogho ọlaedo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha dụọ ha. 6 “Weere ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka. 7 Ọ ga-enwe akwa nʼubu ya abụọ nke e ji ejikọta ọnụ nkuku ya abụọ, ka e nwe ike na-ekechisi ya ike. 8 Ihe okike nke ukwu ahụ nke onye ǹka kpaziri nke ọma ga-adị ka ya. Ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee. 9 “Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya, 10 nʼusoro dịka e si mụọ ha, isii nʼelu otu nkume, isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ. 11 Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa, 12 jikọta ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel. Erọn ga-ebukwa aha ndị a nʼelu ubu ya abụọ, dịka ihe ncheta nʼihu ONYENWE ANYỊ. 13 Ị ga-eji ọlaedo mee ihe ịchọ mma a tụrụ atụ. 14 Jirikwa ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ eriri a tụhịkọtara dịka ụdọ, jikọta eriri ọlaedo ahụ na ihe ịchọ mma ndị ahụ. 15 “Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya. 16 Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara, nke apịajiri ụzọ abụọ. 17 Mgbe ahụ, hịọnye nʼelu ya ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa. Ụdị ga-adị nʼahịrị nke mbụ bụ, nkume kanelian, krisolaịt na beril, 18 nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ. 19 Nʼahịrị nke atọ ga-abụ nkume jasint, ageeti na ametisiti. 20 Nʼahịrị nke anọ, ga-abụ nkume topaazi, ọniks na jaspa. Hịọnye ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa. 21 Ha niile ga-adị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị. 22 “Jiri ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi. 23 Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo abụọ, dụnye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ. 24 Dụnye ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ, 25 were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa, konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya. 26 Ị ga-emekwa mgbaaka ọlaedo, konye ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ. 27 Ị ga-akpụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konye ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe nʼihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara ya, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ. 28 A ga-eji eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọtaa ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ ghara ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ. 29 “Nʼụzọ dị otu a, mgbe ọbụla Erọn banyere nʼEbe Nsọ, ọ ga-ebu aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu obi ya, nʼelu ihe mgbochi obi nke ikpe ahụ, dịka ihe ncheta nʼihu ONYENWE ANYỊ mgbe niile. 30 Ị ga-etinyekwa nʼime ihe mgbochi obi ahụ ụmụ nkume abụọ e ji ajụta ase nke bụ Urim na Tumim. Ha ga-adị nʼelu obi Erọn mgbe ọbụla ọ gara nʼihu ONYENWE ANYỊ. Otu a kwa, Erọn ga-ebukwa ihe e ji ajụta ase banyere ndị Izrel nʼelu obi ya mgbe niile, nʼihu ONYENWE ANYỊ. 31 “Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ị ga-eji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ. 32 Ọ ga-enwe oghere nʼetiti ya ebe a ga-esi na-etinye isi. A ga-enwe ihe ọkpụkpa gburugburu oghere a dịka nke olu uwe agha, ime ka o sie ike, ghara ịdọka. 33 Nʼọnụ ala ala uwe ahụ gburugburu, ị ga-akpanye ihe ọkpụkpa oyiyi mkpụrụ pomegranet. Ọ bụ ogho nke na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie ka ị ga-eji. Ị ga-akpanyekwa ataṅụ ọlaedo nʼetiti ha. 34 Nʼọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, a ga-adụnye otu ataṅụ ọlaedo, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, gbaa gburugburu. 35 Mgbe ọbụla Erọn na-eje ozi ya, ọ ghaghị iyi ya. Aga na anụ mgbịrịgba ataṅụ ahụ ka ọ na-akụ, mgbe ọ banyere nʼEbe Nsọ ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, na mgbe o si nʼebe ahụ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ. 36 “Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya:Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị. 37 Kenye eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ; ọ ga-adị nʼihu akwa ike nʼisi ahụ. 38 Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị ONYENWE ANYỊ ga-anabata. 39 “Jiri ezi akwa ọcha kpaa uwe ime ahụ. Werekwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi ahụ. Ihe ike nʼukwu ahụ ga-abụ ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma. 40 Meekwara ụmụ ndị ikom Erọn uwe ime ahụ, ihe ike nʼukwu na akwa ike nʼisi, inye ha ugwu na nsọpụrụ. 41 Mgbe i yinyekwasịrị Erọn nwanne gị na ụmụ ya ndị ikom uwe ndị a, tee ha mmanụ, doo ha nsọ. Chee ha nʼihu m ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. 42 “Meekwara ha uwe ụkwụ nke eji akwa ọcha mee, maka ikpuchi anụ ahụ ha. Ọ ga-esite nʼukwu ruo nʼikpere. 43 Erọn na ụmụ ya ndị ikom aghaghị iyi ha mgbe niile ha ga-aba nʼime ụlọ nzute, maọbụ mgbe ha na-abịa nso ebe ịchụ aja ije ozi nʼEbe Nsọ. Ka ha ghara imeta ihe ikpe ọmụma, ma nwụọ.“Nke a ga-abụ iwu na ụkpụrụ ebighị ebi, nke ga-adịrị Erọn na ụmụ ụmụ ya.

In Other Versions

Exodus 28 in the ANGEFD

Exodus 28 in the ANTPNG2D

Exodus 28 in the AS21

Exodus 28 in the BAGH

Exodus 28 in the BBPNG

Exodus 28 in the BBT1E

Exodus 28 in the BDS

Exodus 28 in the BEV

Exodus 28 in the BHAD

Exodus 28 in the BIB

Exodus 28 in the BLPT

Exodus 28 in the BNT

Exodus 28 in the BNTABOOT

Exodus 28 in the BNTLV

Exodus 28 in the BOATCB

Exodus 28 in the BOATCB2

Exodus 28 in the BOBCV

Exodus 28 in the BOCNT

Exodus 28 in the BOECS

Exodus 28 in the BOGWICC

Exodus 28 in the BOHCB

Exodus 28 in the BOHCV

Exodus 28 in the BOHLNT

Exodus 28 in the BOHNTLTAL

Exodus 28 in the BOILNTAP

Exodus 28 in the BOITCV

Exodus 28 in the BOKCV

Exodus 28 in the BOKCV2

Exodus 28 in the BOKHWOG

Exodus 28 in the BOKSSV

Exodus 28 in the BOLCB

Exodus 28 in the BOLCB2

Exodus 28 in the BOMCV

Exodus 28 in the BONAV

Exodus 28 in the BONCB

Exodus 28 in the BONLT

Exodus 28 in the BONUT2

Exodus 28 in the BOPLNT

Exodus 28 in the BOSCB

Exodus 28 in the BOSNC

Exodus 28 in the BOTLNT

Exodus 28 in the BOVCB

Exodus 28 in the BOYCB

Exodus 28 in the BPBB

Exodus 28 in the BPH

Exodus 28 in the BSB

Exodus 28 in the CCB

Exodus 28 in the CUV

Exodus 28 in the CUVS

Exodus 28 in the DBT

Exodus 28 in the DGDNT

Exodus 28 in the DHNT

Exodus 28 in the DNT

Exodus 28 in the ELBE

Exodus 28 in the EMTV

Exodus 28 in the ESV

Exodus 28 in the FBV

Exodus 28 in the FEB

Exodus 28 in the GGMNT

Exodus 28 in the GNT

Exodus 28 in the HARY

Exodus 28 in the HNT

Exodus 28 in the IRVA

Exodus 28 in the IRVB

Exodus 28 in the IRVG

Exodus 28 in the IRVH

Exodus 28 in the IRVK

Exodus 28 in the IRVM

Exodus 28 in the IRVM2

Exodus 28 in the IRVO

Exodus 28 in the IRVP

Exodus 28 in the IRVT

Exodus 28 in the IRVT2

Exodus 28 in the IRVU

Exodus 28 in the ISVN

Exodus 28 in the JSNT

Exodus 28 in the KAPI

Exodus 28 in the KBT1ETNIK

Exodus 28 in the KBV

Exodus 28 in the KJV

Exodus 28 in the KNFD

Exodus 28 in the LBA

Exodus 28 in the LBLA

Exodus 28 in the LNT

Exodus 28 in the LSV

Exodus 28 in the MAAL

Exodus 28 in the MBV

Exodus 28 in the MBV2

Exodus 28 in the MHNT

Exodus 28 in the MKNFD

Exodus 28 in the MNG

Exodus 28 in the MNT

Exodus 28 in the MNT2

Exodus 28 in the MRS1T

Exodus 28 in the NAA

Exodus 28 in the NASB

Exodus 28 in the NBLA

Exodus 28 in the NBS

Exodus 28 in the NBVTP

Exodus 28 in the NET2

Exodus 28 in the NIV11

Exodus 28 in the NNT

Exodus 28 in the NNT2

Exodus 28 in the NNT3

Exodus 28 in the PDDPT

Exodus 28 in the PFNT

Exodus 28 in the RMNT

Exodus 28 in the SBIAS

Exodus 28 in the SBIBS

Exodus 28 in the SBIBS2

Exodus 28 in the SBICS

Exodus 28 in the SBIDS

Exodus 28 in the SBIGS

Exodus 28 in the SBIHS

Exodus 28 in the SBIIS

Exodus 28 in the SBIIS2

Exodus 28 in the SBIIS3

Exodus 28 in the SBIKS

Exodus 28 in the SBIKS2

Exodus 28 in the SBIMS

Exodus 28 in the SBIOS

Exodus 28 in the SBIPS

Exodus 28 in the SBISS

Exodus 28 in the SBITS

Exodus 28 in the SBITS2

Exodus 28 in the SBITS3

Exodus 28 in the SBITS4

Exodus 28 in the SBIUS

Exodus 28 in the SBIVS

Exodus 28 in the SBT

Exodus 28 in the SBT1E

Exodus 28 in the SCHL

Exodus 28 in the SNT

Exodus 28 in the SUSU

Exodus 28 in the SUSU2

Exodus 28 in the SYNO

Exodus 28 in the TBIAOTANT

Exodus 28 in the TBT1E

Exodus 28 in the TBT1E2

Exodus 28 in the TFTIP

Exodus 28 in the TFTU

Exodus 28 in the TGNTATF3T

Exodus 28 in the THAI

Exodus 28 in the TNFD

Exodus 28 in the TNT

Exodus 28 in the TNTIK

Exodus 28 in the TNTIL

Exodus 28 in the TNTIN

Exodus 28 in the TNTIP

Exodus 28 in the TNTIZ

Exodus 28 in the TOMA

Exodus 28 in the TTENT

Exodus 28 in the UBG

Exodus 28 in the UGV

Exodus 28 in the UGV2

Exodus 28 in the UGV3

Exodus 28 in the VBL

Exodus 28 in the VDCC

Exodus 28 in the YALU

Exodus 28 in the YAPE

Exodus 28 in the YBVTP

Exodus 28 in the ZBP