Exodus 36 (BOICB)

1 Ya mere, Bezalel na Oholiab na ndị ǹka niile ONYENWE ANYỊ nyere ike na nghọta ịmata otu ha ga-esi rụọ ọrụ iwu ebe nsọ ahụ ga-arụ ọrụ ahụ dịka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu. 2 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Bezalel na Oholiab na ndị ǹka ndị ahụ ONYENWE ANYỊ nyere ike na nghọta, ndị wepụtara obi ha ịbịa ịrụ ọrụ ahụ. 3 Ha si nʼaka Mosis nara onyinye ndị ahụ niile ụmụ Izrel wetara maka ịrụ ọrụ ebe nsọ ahụ. Ndị mmadụ nọkwa na-eweta onyinye afọ ofufu ha ụtụtụ niile. 4 Nʼihi ya, ndị ọrụ ǹka niile nọ na-arụ ọrụ nʼebe nsọ ahụ hapụrụ ọrụ ha na-arụ, 5 bịakwute Mosis, sị ya, “Lee, onyinye ndị mmadụ na-eweta adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ịrụ ọrụ a ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu.” 6 Mgbe ahụ, Mosis nyere iwu, ha zisara ozi ahụ nʼọmụma ụlọ ikwu niile sị, “Ka nwoke maọbụ nwanyị ọbụla gharakwa inwe ihe ọbụla nke ọ ga-eweta dịka onyinye maka ọrụ ebe nsọ a.” Nʼihi nke a, ndị mmadụ kwụsịrị iweta ihe ọzọ. 7 Nʼihi na onyinye e wetara adịla ukwuu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ. 8 Ndị niile mara ǹka nʼetiti ndị ọrụ ahụ ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie wuo ụlọ nzute ahụ. Onye ọka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha. 9 Akwa mgbochi ndị a ha nʼotu. Ịdị ogologo ha nʼotu nʼotu bụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ha bụ otu mita na sentimita asatọ. 10 E jikọtara akwa mgbochi ise nʼotu, jikọtakwa akwa ise nke ọzọ nʼotu. 11 Ha ji akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka emekwara menyekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. 12 Ha dụnyere iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ, mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu. 13 Emesịa, ha ji iri nko ọlaedo ise jikọta ụzọ akwa mgbochi abụọ ndị a, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ ghọọ otu. 14 Ha ji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ. 15 Akwa mgbochi iri na otu ndị a ha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo, ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ. 16 Ha dụkọtara ise nʼime akwa mgbochi ahụ, debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche. 17 Mgbe ahụ, ha dụnyekwara iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Mekwaa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche. 18 Ha mekwara iri nko bronz ise, iji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu. 19 Mgbe ahụ, ha ji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ịkpụkwasị nʼelu ya. 20 Ha meere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ. 21 Mbudo ibo ọ bụla dị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara, 22 nwee ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ha rụrụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a. 23 Ha rụrụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ, 24 ma mekwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ. 25 Nʼakụkụ nke ọzọ bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ha rụkwara iri mbudo ibo abụọ, 26 rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla. 27 Nʼebe isi isi nsọtụ ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ha rụrụ mbudo ibo isii. 28 Mbudo ibo abụọ ka e mere maka nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ, 29 Nʼisi nkuku abụọ ndị a, mbudo ibo ndị a nọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya; ma e jikọrọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka. Emere ka ha abụọ yie ibe ya. 30 Ha niile dị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla. 31 Ha ji osisi akashia mekwaa osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute ahụ, 32 ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ 33 Ha mere osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ka ọ gabiga site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ. 34 Ha ji ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile. Kpụkwaa mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta mkpọrọ osisi ahụ niile. Ha ji ọlaedo machiekwa mkpọrọ osisi ndị ahụ niile. 35 Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee akwa mgbochi. Onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya. 36 Ha mere ogidi osisi akashia anọ maka ya were ọlaedo machie ha. Ha meere ha anya nko; wukwara ha ụkwụ ọlaọcha anọ. 37 Ha mere akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ, nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka. 38 Ha rụrụ ogidi ise ya na anya nko ha. Ha ji ọlaedo machie isi ogidi ahụ na ihe mkpọrọ ha, were bronz rụọ ụkwụ ise ha.

In Other Versions

Exodus 36 in the ANGEFD

Exodus 36 in the ANTPNG2D

Exodus 36 in the AS21

Exodus 36 in the BAGH

Exodus 36 in the BBPNG

Exodus 36 in the BBT1E

Exodus 36 in the BDS

Exodus 36 in the BEV

Exodus 36 in the BHAD

Exodus 36 in the BIB

Exodus 36 in the BLPT

Exodus 36 in the BNT

Exodus 36 in the BNTABOOT

Exodus 36 in the BNTLV

Exodus 36 in the BOATCB

Exodus 36 in the BOATCB2

Exodus 36 in the BOBCV

Exodus 36 in the BOCNT

Exodus 36 in the BOECS

Exodus 36 in the BOGWICC

Exodus 36 in the BOHCB

Exodus 36 in the BOHCV

Exodus 36 in the BOHLNT

Exodus 36 in the BOHNTLTAL

Exodus 36 in the BOILNTAP

Exodus 36 in the BOITCV

Exodus 36 in the BOKCV

Exodus 36 in the BOKCV2

Exodus 36 in the BOKHWOG

Exodus 36 in the BOKSSV

Exodus 36 in the BOLCB

Exodus 36 in the BOLCB2

Exodus 36 in the BOMCV

Exodus 36 in the BONAV

Exodus 36 in the BONCB

Exodus 36 in the BONLT

Exodus 36 in the BONUT2

Exodus 36 in the BOPLNT

Exodus 36 in the BOSCB

Exodus 36 in the BOSNC

Exodus 36 in the BOTLNT

Exodus 36 in the BOVCB

Exodus 36 in the BOYCB

Exodus 36 in the BPBB

Exodus 36 in the BPH

Exodus 36 in the BSB

Exodus 36 in the CCB

Exodus 36 in the CUV

Exodus 36 in the CUVS

Exodus 36 in the DBT

Exodus 36 in the DGDNT

Exodus 36 in the DHNT

Exodus 36 in the DNT

Exodus 36 in the ELBE

Exodus 36 in the EMTV

Exodus 36 in the ESV

Exodus 36 in the FBV

Exodus 36 in the FEB

Exodus 36 in the GGMNT

Exodus 36 in the GNT

Exodus 36 in the HARY

Exodus 36 in the HNT

Exodus 36 in the IRVA

Exodus 36 in the IRVB

Exodus 36 in the IRVG

Exodus 36 in the IRVH

Exodus 36 in the IRVK

Exodus 36 in the IRVM

Exodus 36 in the IRVM2

Exodus 36 in the IRVO

Exodus 36 in the IRVP

Exodus 36 in the IRVT

Exodus 36 in the IRVT2

Exodus 36 in the IRVU

Exodus 36 in the ISVN

Exodus 36 in the JSNT

Exodus 36 in the KAPI

Exodus 36 in the KBT1ETNIK

Exodus 36 in the KBV

Exodus 36 in the KJV

Exodus 36 in the KNFD

Exodus 36 in the LBA

Exodus 36 in the LBLA

Exodus 36 in the LNT

Exodus 36 in the LSV

Exodus 36 in the MAAL

Exodus 36 in the MBV

Exodus 36 in the MBV2

Exodus 36 in the MHNT

Exodus 36 in the MKNFD

Exodus 36 in the MNG

Exodus 36 in the MNT

Exodus 36 in the MNT2

Exodus 36 in the MRS1T

Exodus 36 in the NAA

Exodus 36 in the NASB

Exodus 36 in the NBLA

Exodus 36 in the NBS

Exodus 36 in the NBVTP

Exodus 36 in the NET2

Exodus 36 in the NIV11

Exodus 36 in the NNT

Exodus 36 in the NNT2

Exodus 36 in the NNT3

Exodus 36 in the PDDPT

Exodus 36 in the PFNT

Exodus 36 in the RMNT

Exodus 36 in the SBIAS

Exodus 36 in the SBIBS

Exodus 36 in the SBIBS2

Exodus 36 in the SBICS

Exodus 36 in the SBIDS

Exodus 36 in the SBIGS

Exodus 36 in the SBIHS

Exodus 36 in the SBIIS

Exodus 36 in the SBIIS2

Exodus 36 in the SBIIS3

Exodus 36 in the SBIKS

Exodus 36 in the SBIKS2

Exodus 36 in the SBIMS

Exodus 36 in the SBIOS

Exodus 36 in the SBIPS

Exodus 36 in the SBISS

Exodus 36 in the SBITS

Exodus 36 in the SBITS2

Exodus 36 in the SBITS3

Exodus 36 in the SBITS4

Exodus 36 in the SBIUS

Exodus 36 in the SBIVS

Exodus 36 in the SBT

Exodus 36 in the SBT1E

Exodus 36 in the SCHL

Exodus 36 in the SNT

Exodus 36 in the SUSU

Exodus 36 in the SUSU2

Exodus 36 in the SYNO

Exodus 36 in the TBIAOTANT

Exodus 36 in the TBT1E

Exodus 36 in the TBT1E2

Exodus 36 in the TFTIP

Exodus 36 in the TFTU

Exodus 36 in the TGNTATF3T

Exodus 36 in the THAI

Exodus 36 in the TNFD

Exodus 36 in the TNT

Exodus 36 in the TNTIK

Exodus 36 in the TNTIL

Exodus 36 in the TNTIN

Exodus 36 in the TNTIP

Exodus 36 in the TNTIZ

Exodus 36 in the TOMA

Exodus 36 in the TTENT

Exodus 36 in the UBG

Exodus 36 in the UGV

Exodus 36 in the UGV2

Exodus 36 in the UGV3

Exodus 36 in the VBL

Exodus 36 in the VDCC

Exodus 36 in the YALU

Exodus 36 in the YAPE

Exodus 36 in the YBVTP

Exodus 36 in the ZBP