Exodus 37 (BOICB)

1 Bezalel ji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya bụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya ga-abụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. 2 O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie nʼime na azụ ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. 3 Ọ kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnyekwa ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya. 4 O jikwa osisi akashia ahụ mee okporo osisi, machiekwa ha ọlaedo. 5 O tinyekwara mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ; ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya. 6 Emesịa, o ji ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe e ji ekwuchi igbe ahụ. Aha a na-akpọ okwuchi igbe a bụ Oche Ebere. Ịdị ogologo ya dị otu mita na sentimita iri, obosara ya dị iri sentimita asaa. 7 Mgbe ahụ, o ji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa, kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ. 8 A rụnyere otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; nʼisi nsọtụ abụọ ahụ, ka o jikọtara ha ọnụ ka ha na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu. 9 Cherubim ndị a gbasara nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ cherịtara onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị. 10 Emesịa, o mere tebul nke ịdị ogologo ya bụ iri sentimita itoolu. Obosara ya bụ iri sentimita ise, ịla elu ya bụ iri sentimita asaa. Ọ bụ osisi akashia ka o ji mee ya. 11 Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji machie ya. A kpụnyekwara ihe ọkpụkpụ ọlaedo gburugburu ọnụ ọnụ ya. 12 A rụnyere ihe nʼọnụ ọnụ tebul ahụ nke ịla elu ya ga-eru sentimita asatọ. Ihe a dị gburugburu ọnụ ọnụ tebul ahụ, ọ bụkwa ọlaedo a kpụrụ akpụ ka e ji rụọ ya. 13 Ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ; kwụnyekwa ha nʼakụkụ anọ ahụ nʼebe ụkwụ anọ ya dị. 14 E tinyere mgbaaka ndị ahụ nso nso ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, e ji ebu tebul ahụ. 15 O jikwa osisi akashia mee okporo osisi ahụ e ji ebu tebul ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ya. 16 O mekwara ihe niile na-adị nʼelu tebul ahụ: efere, ngaji, ọkwa na iko, nke e ji awụpụ aja ihe ọṅụṅụ. Ọ bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka o ji kpụọ ha. 17 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Ha kpụrụ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mekwaa ka iko ya niile yiri okoko osisi, nʼisi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya. 18 Alaka isii sitere nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ. 19 Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile dịkwa nʼotu alaka; iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ. 20 Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, enwere iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya. 21 Otu isi dị nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta, isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ, isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii. 22 Isi nwapụta ya na alaka ya niile dịkọtara ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ. 23 Ha mekwara oriọna asaa ya, ma mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile. Ha bụ ọlaedo a nụchara anụcha. 24 Ha sitere na iri kilogram atọ na anọ nke ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ya niile. 25 Ha ji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja a na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Akụkụ anọ ya ha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya bụ iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya bụ iri sentimita itoolu. Mpi ya niile si na ya pụta. 26 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya; akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ha jikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu. 27 Ha kpụnyere mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọ bụla, ebe a ga na-ejide mkpara e ji ebu ya. 28 Ha ji osisi akashia mee mkpara ndị ahụ. Jirikwa ọlaedo machie ha. 29 Ha mekwara mmanụ otite dị nsọ, na ezigbo ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke a na-agwaghị ihe; bụ ọrụ nke onye na-eme mmanụ isi ụtọ.

In Other Versions

Exodus 37 in the ANGEFD

Exodus 37 in the ANTPNG2D

Exodus 37 in the AS21

Exodus 37 in the BAGH

Exodus 37 in the BBPNG

Exodus 37 in the BBT1E

Exodus 37 in the BDS

Exodus 37 in the BEV

Exodus 37 in the BHAD

Exodus 37 in the BIB

Exodus 37 in the BLPT

Exodus 37 in the BNT

Exodus 37 in the BNTABOOT

Exodus 37 in the BNTLV

Exodus 37 in the BOATCB

Exodus 37 in the BOATCB2

Exodus 37 in the BOBCV

Exodus 37 in the BOCNT

Exodus 37 in the BOECS

Exodus 37 in the BOGWICC

Exodus 37 in the BOHCB

Exodus 37 in the BOHCV

Exodus 37 in the BOHLNT

Exodus 37 in the BOHNTLTAL

Exodus 37 in the BOILNTAP

Exodus 37 in the BOITCV

Exodus 37 in the BOKCV

Exodus 37 in the BOKCV2

Exodus 37 in the BOKHWOG

Exodus 37 in the BOKSSV

Exodus 37 in the BOLCB

Exodus 37 in the BOLCB2

Exodus 37 in the BOMCV

Exodus 37 in the BONAV

Exodus 37 in the BONCB

Exodus 37 in the BONLT

Exodus 37 in the BONUT2

Exodus 37 in the BOPLNT

Exodus 37 in the BOSCB

Exodus 37 in the BOSNC

Exodus 37 in the BOTLNT

Exodus 37 in the BOVCB

Exodus 37 in the BOYCB

Exodus 37 in the BPBB

Exodus 37 in the BPH

Exodus 37 in the BSB

Exodus 37 in the CCB

Exodus 37 in the CUV

Exodus 37 in the CUVS

Exodus 37 in the DBT

Exodus 37 in the DGDNT

Exodus 37 in the DHNT

Exodus 37 in the DNT

Exodus 37 in the ELBE

Exodus 37 in the EMTV

Exodus 37 in the ESV

Exodus 37 in the FBV

Exodus 37 in the FEB

Exodus 37 in the GGMNT

Exodus 37 in the GNT

Exodus 37 in the HARY

Exodus 37 in the HNT

Exodus 37 in the IRVA

Exodus 37 in the IRVB

Exodus 37 in the IRVG

Exodus 37 in the IRVH

Exodus 37 in the IRVK

Exodus 37 in the IRVM

Exodus 37 in the IRVM2

Exodus 37 in the IRVO

Exodus 37 in the IRVP

Exodus 37 in the IRVT

Exodus 37 in the IRVT2

Exodus 37 in the IRVU

Exodus 37 in the ISVN

Exodus 37 in the JSNT

Exodus 37 in the KAPI

Exodus 37 in the KBT1ETNIK

Exodus 37 in the KBV

Exodus 37 in the KJV

Exodus 37 in the KNFD

Exodus 37 in the LBA

Exodus 37 in the LBLA

Exodus 37 in the LNT

Exodus 37 in the LSV

Exodus 37 in the MAAL

Exodus 37 in the MBV

Exodus 37 in the MBV2

Exodus 37 in the MHNT

Exodus 37 in the MKNFD

Exodus 37 in the MNG

Exodus 37 in the MNT

Exodus 37 in the MNT2

Exodus 37 in the MRS1T

Exodus 37 in the NAA

Exodus 37 in the NASB

Exodus 37 in the NBLA

Exodus 37 in the NBS

Exodus 37 in the NBVTP

Exodus 37 in the NET2

Exodus 37 in the NIV11

Exodus 37 in the NNT

Exodus 37 in the NNT2

Exodus 37 in the NNT3

Exodus 37 in the PDDPT

Exodus 37 in the PFNT

Exodus 37 in the RMNT

Exodus 37 in the SBIAS

Exodus 37 in the SBIBS

Exodus 37 in the SBIBS2

Exodus 37 in the SBICS

Exodus 37 in the SBIDS

Exodus 37 in the SBIGS

Exodus 37 in the SBIHS

Exodus 37 in the SBIIS

Exodus 37 in the SBIIS2

Exodus 37 in the SBIIS3

Exodus 37 in the SBIKS

Exodus 37 in the SBIKS2

Exodus 37 in the SBIMS

Exodus 37 in the SBIOS

Exodus 37 in the SBIPS

Exodus 37 in the SBISS

Exodus 37 in the SBITS

Exodus 37 in the SBITS2

Exodus 37 in the SBITS3

Exodus 37 in the SBITS4

Exodus 37 in the SBIUS

Exodus 37 in the SBIVS

Exodus 37 in the SBT

Exodus 37 in the SBT1E

Exodus 37 in the SCHL

Exodus 37 in the SNT

Exodus 37 in the SUSU

Exodus 37 in the SUSU2

Exodus 37 in the SYNO

Exodus 37 in the TBIAOTANT

Exodus 37 in the TBT1E

Exodus 37 in the TBT1E2

Exodus 37 in the TFTIP

Exodus 37 in the TFTU

Exodus 37 in the TGNTATF3T

Exodus 37 in the THAI

Exodus 37 in the TNFD

Exodus 37 in the TNT

Exodus 37 in the TNTIK

Exodus 37 in the TNTIL

Exodus 37 in the TNTIN

Exodus 37 in the TNTIP

Exodus 37 in the TNTIZ

Exodus 37 in the TOMA

Exodus 37 in the TTENT

Exodus 37 in the UBG

Exodus 37 in the UGV

Exodus 37 in the UGV2

Exodus 37 in the UGV3

Exodus 37 in the VBL

Exodus 37 in the VDCC

Exodus 37 in the YALU

Exodus 37 in the YAPE

Exodus 37 in the YBVTP

Exodus 37 in the ZBP