Ezekiel 13 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke ONYENWE ANYỊ. 3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ. 4 Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe. 5 Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke ONYENWE ANYỊ. 6 Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “ONYENWE ANYỊ kwupụtara,” ebe ONYENWE ANYỊ ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha. 7 Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu? 8 “ ‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 9 Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ. 10 “ ‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya. 11 Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya. 12 Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?” 13 “ ‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya. 14 Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 15 Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya, 16 bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.” ’ 17 “Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha 18 sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya? 19 Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha. 20 “ ‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa. 21 Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 22 Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha. 23 Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ”

In Other Versions

Ezekiel 13 in the ANGEFD

Ezekiel 13 in the ANTPNG2D

Ezekiel 13 in the AS21

Ezekiel 13 in the BAGH

Ezekiel 13 in the BBPNG

Ezekiel 13 in the BBT1E

Ezekiel 13 in the BDS

Ezekiel 13 in the BEV

Ezekiel 13 in the BHAD

Ezekiel 13 in the BIB

Ezekiel 13 in the BLPT

Ezekiel 13 in the BNT

Ezekiel 13 in the BNTABOOT

Ezekiel 13 in the BNTLV

Ezekiel 13 in the BOATCB

Ezekiel 13 in the BOATCB2

Ezekiel 13 in the BOBCV

Ezekiel 13 in the BOCNT

Ezekiel 13 in the BOECS

Ezekiel 13 in the BOGWICC

Ezekiel 13 in the BOHCB

Ezekiel 13 in the BOHCV

Ezekiel 13 in the BOHLNT

Ezekiel 13 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 13 in the BOILNTAP

Ezekiel 13 in the BOITCV

Ezekiel 13 in the BOKCV

Ezekiel 13 in the BOKCV2

Ezekiel 13 in the BOKHWOG

Ezekiel 13 in the BOKSSV

Ezekiel 13 in the BOLCB

Ezekiel 13 in the BOLCB2

Ezekiel 13 in the BOMCV

Ezekiel 13 in the BONAV

Ezekiel 13 in the BONCB

Ezekiel 13 in the BONLT

Ezekiel 13 in the BONUT2

Ezekiel 13 in the BOPLNT

Ezekiel 13 in the BOSCB

Ezekiel 13 in the BOSNC

Ezekiel 13 in the BOTLNT

Ezekiel 13 in the BOVCB

Ezekiel 13 in the BOYCB

Ezekiel 13 in the BPBB

Ezekiel 13 in the BPH

Ezekiel 13 in the BSB

Ezekiel 13 in the CCB

Ezekiel 13 in the CUV

Ezekiel 13 in the CUVS

Ezekiel 13 in the DBT

Ezekiel 13 in the DGDNT

Ezekiel 13 in the DHNT

Ezekiel 13 in the DNT

Ezekiel 13 in the ELBE

Ezekiel 13 in the EMTV

Ezekiel 13 in the ESV

Ezekiel 13 in the FBV

Ezekiel 13 in the FEB

Ezekiel 13 in the GGMNT

Ezekiel 13 in the GNT

Ezekiel 13 in the HARY

Ezekiel 13 in the HNT

Ezekiel 13 in the IRVA

Ezekiel 13 in the IRVB

Ezekiel 13 in the IRVG

Ezekiel 13 in the IRVH

Ezekiel 13 in the IRVK

Ezekiel 13 in the IRVM

Ezekiel 13 in the IRVM2

Ezekiel 13 in the IRVO

Ezekiel 13 in the IRVP

Ezekiel 13 in the IRVT

Ezekiel 13 in the IRVT2

Ezekiel 13 in the IRVU

Ezekiel 13 in the ISVN

Ezekiel 13 in the JSNT

Ezekiel 13 in the KAPI

Ezekiel 13 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 13 in the KBV

Ezekiel 13 in the KJV

Ezekiel 13 in the KNFD

Ezekiel 13 in the LBA

Ezekiel 13 in the LBLA

Ezekiel 13 in the LNT

Ezekiel 13 in the LSV

Ezekiel 13 in the MAAL

Ezekiel 13 in the MBV

Ezekiel 13 in the MBV2

Ezekiel 13 in the MHNT

Ezekiel 13 in the MKNFD

Ezekiel 13 in the MNG

Ezekiel 13 in the MNT

Ezekiel 13 in the MNT2

Ezekiel 13 in the MRS1T

Ezekiel 13 in the NAA

Ezekiel 13 in the NASB

Ezekiel 13 in the NBLA

Ezekiel 13 in the NBS

Ezekiel 13 in the NBVTP

Ezekiel 13 in the NET2

Ezekiel 13 in the NIV11

Ezekiel 13 in the NNT

Ezekiel 13 in the NNT2

Ezekiel 13 in the NNT3

Ezekiel 13 in the PDDPT

Ezekiel 13 in the PFNT

Ezekiel 13 in the RMNT

Ezekiel 13 in the SBIAS

Ezekiel 13 in the SBIBS

Ezekiel 13 in the SBIBS2

Ezekiel 13 in the SBICS

Ezekiel 13 in the SBIDS

Ezekiel 13 in the SBIGS

Ezekiel 13 in the SBIHS

Ezekiel 13 in the SBIIS

Ezekiel 13 in the SBIIS2

Ezekiel 13 in the SBIIS3

Ezekiel 13 in the SBIKS

Ezekiel 13 in the SBIKS2

Ezekiel 13 in the SBIMS

Ezekiel 13 in the SBIOS

Ezekiel 13 in the SBIPS

Ezekiel 13 in the SBISS

Ezekiel 13 in the SBITS

Ezekiel 13 in the SBITS2

Ezekiel 13 in the SBITS3

Ezekiel 13 in the SBITS4

Ezekiel 13 in the SBIUS

Ezekiel 13 in the SBIVS

Ezekiel 13 in the SBT

Ezekiel 13 in the SBT1E

Ezekiel 13 in the SCHL

Ezekiel 13 in the SNT

Ezekiel 13 in the SUSU

Ezekiel 13 in the SUSU2

Ezekiel 13 in the SYNO

Ezekiel 13 in the TBIAOTANT

Ezekiel 13 in the TBT1E

Ezekiel 13 in the TBT1E2

Ezekiel 13 in the TFTIP

Ezekiel 13 in the TFTU

Ezekiel 13 in the TGNTATF3T

Ezekiel 13 in the THAI

Ezekiel 13 in the TNFD

Ezekiel 13 in the TNT

Ezekiel 13 in the TNTIK

Ezekiel 13 in the TNTIL

Ezekiel 13 in the TNTIN

Ezekiel 13 in the TNTIP

Ezekiel 13 in the TNTIZ

Ezekiel 13 in the TOMA

Ezekiel 13 in the TTENT

Ezekiel 13 in the UBG

Ezekiel 13 in the UGV

Ezekiel 13 in the UGV2

Ezekiel 13 in the UGV3

Ezekiel 13 in the VBL

Ezekiel 13 in the VDCC

Ezekiel 13 in the YALU

Ezekiel 13 in the YAPE

Ezekiel 13 in the YBVTP

Ezekiel 13 in the ZBP