Ezekiel 17 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ. 3 Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo. 4 Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ. 5 “ ‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri. 6 Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma. 7 “ ‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri. 8 A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’ 9 “Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya. 10 A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’ ” 11 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 12 “Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn. 13 O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile. 14 Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ. 15 Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga? 16 “ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya. 17 Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ. 18 O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya. 19 “ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri. 20 Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m. 21 Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. 22 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu. 23 Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile. 24 Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ.“ ‘Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’ ”

In Other Versions

Ezekiel 17 in the ANGEFD

Ezekiel 17 in the ANTPNG2D

Ezekiel 17 in the AS21

Ezekiel 17 in the BAGH

Ezekiel 17 in the BBPNG

Ezekiel 17 in the BBT1E

Ezekiel 17 in the BDS

Ezekiel 17 in the BEV

Ezekiel 17 in the BHAD

Ezekiel 17 in the BIB

Ezekiel 17 in the BLPT

Ezekiel 17 in the BNT

Ezekiel 17 in the BNTABOOT

Ezekiel 17 in the BNTLV

Ezekiel 17 in the BOATCB

Ezekiel 17 in the BOATCB2

Ezekiel 17 in the BOBCV

Ezekiel 17 in the BOCNT

Ezekiel 17 in the BOECS

Ezekiel 17 in the BOGWICC

Ezekiel 17 in the BOHCB

Ezekiel 17 in the BOHCV

Ezekiel 17 in the BOHLNT

Ezekiel 17 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 17 in the BOILNTAP

Ezekiel 17 in the BOITCV

Ezekiel 17 in the BOKCV

Ezekiel 17 in the BOKCV2

Ezekiel 17 in the BOKHWOG

Ezekiel 17 in the BOKSSV

Ezekiel 17 in the BOLCB

Ezekiel 17 in the BOLCB2

Ezekiel 17 in the BOMCV

Ezekiel 17 in the BONAV

Ezekiel 17 in the BONCB

Ezekiel 17 in the BONLT

Ezekiel 17 in the BONUT2

Ezekiel 17 in the BOPLNT

Ezekiel 17 in the BOSCB

Ezekiel 17 in the BOSNC

Ezekiel 17 in the BOTLNT

Ezekiel 17 in the BOVCB

Ezekiel 17 in the BOYCB

Ezekiel 17 in the BPBB

Ezekiel 17 in the BPH

Ezekiel 17 in the BSB

Ezekiel 17 in the CCB

Ezekiel 17 in the CUV

Ezekiel 17 in the CUVS

Ezekiel 17 in the DBT

Ezekiel 17 in the DGDNT

Ezekiel 17 in the DHNT

Ezekiel 17 in the DNT

Ezekiel 17 in the ELBE

Ezekiel 17 in the EMTV

Ezekiel 17 in the ESV

Ezekiel 17 in the FBV

Ezekiel 17 in the FEB

Ezekiel 17 in the GGMNT

Ezekiel 17 in the GNT

Ezekiel 17 in the HARY

Ezekiel 17 in the HNT

Ezekiel 17 in the IRVA

Ezekiel 17 in the IRVB

Ezekiel 17 in the IRVG

Ezekiel 17 in the IRVH

Ezekiel 17 in the IRVK

Ezekiel 17 in the IRVM

Ezekiel 17 in the IRVM2

Ezekiel 17 in the IRVO

Ezekiel 17 in the IRVP

Ezekiel 17 in the IRVT

Ezekiel 17 in the IRVT2

Ezekiel 17 in the IRVU

Ezekiel 17 in the ISVN

Ezekiel 17 in the JSNT

Ezekiel 17 in the KAPI

Ezekiel 17 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 17 in the KBV

Ezekiel 17 in the KJV

Ezekiel 17 in the KNFD

Ezekiel 17 in the LBA

Ezekiel 17 in the LBLA

Ezekiel 17 in the LNT

Ezekiel 17 in the LSV

Ezekiel 17 in the MAAL

Ezekiel 17 in the MBV

Ezekiel 17 in the MBV2

Ezekiel 17 in the MHNT

Ezekiel 17 in the MKNFD

Ezekiel 17 in the MNG

Ezekiel 17 in the MNT

Ezekiel 17 in the MNT2

Ezekiel 17 in the MRS1T

Ezekiel 17 in the NAA

Ezekiel 17 in the NASB

Ezekiel 17 in the NBLA

Ezekiel 17 in the NBS

Ezekiel 17 in the NBVTP

Ezekiel 17 in the NET2

Ezekiel 17 in the NIV11

Ezekiel 17 in the NNT

Ezekiel 17 in the NNT2

Ezekiel 17 in the NNT3

Ezekiel 17 in the PDDPT

Ezekiel 17 in the PFNT

Ezekiel 17 in the RMNT

Ezekiel 17 in the SBIAS

Ezekiel 17 in the SBIBS

Ezekiel 17 in the SBIBS2

Ezekiel 17 in the SBICS

Ezekiel 17 in the SBIDS

Ezekiel 17 in the SBIGS

Ezekiel 17 in the SBIHS

Ezekiel 17 in the SBIIS

Ezekiel 17 in the SBIIS2

Ezekiel 17 in the SBIIS3

Ezekiel 17 in the SBIKS

Ezekiel 17 in the SBIKS2

Ezekiel 17 in the SBIMS

Ezekiel 17 in the SBIOS

Ezekiel 17 in the SBIPS

Ezekiel 17 in the SBISS

Ezekiel 17 in the SBITS

Ezekiel 17 in the SBITS2

Ezekiel 17 in the SBITS3

Ezekiel 17 in the SBITS4

Ezekiel 17 in the SBIUS

Ezekiel 17 in the SBIVS

Ezekiel 17 in the SBT

Ezekiel 17 in the SBT1E

Ezekiel 17 in the SCHL

Ezekiel 17 in the SNT

Ezekiel 17 in the SUSU

Ezekiel 17 in the SUSU2

Ezekiel 17 in the SYNO

Ezekiel 17 in the TBIAOTANT

Ezekiel 17 in the TBT1E

Ezekiel 17 in the TBT1E2

Ezekiel 17 in the TFTIP

Ezekiel 17 in the TFTU

Ezekiel 17 in the TGNTATF3T

Ezekiel 17 in the THAI

Ezekiel 17 in the TNFD

Ezekiel 17 in the TNT

Ezekiel 17 in the TNTIK

Ezekiel 17 in the TNTIL

Ezekiel 17 in the TNTIN

Ezekiel 17 in the TNTIP

Ezekiel 17 in the TNTIZ

Ezekiel 17 in the TOMA

Ezekiel 17 in the TTENT

Ezekiel 17 in the UBG

Ezekiel 17 in the UGV

Ezekiel 17 in the UGV2

Ezekiel 17 in the UGV3

Ezekiel 17 in the VBL

Ezekiel 17 in the VDCC

Ezekiel 17 in the YALU

Ezekiel 17 in the YAPE

Ezekiel 17 in the YBVTP

Ezekiel 17 in the ZBP