Ezekiel 24 (BOICB)
1 O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. 3 Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru:“ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị yakunyekwanụ mmiri nʼime ya. 4 Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya.Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya.Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya. 5 Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ,kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ,mee ya ka ọ gbọọ nke ọma,sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya. 6 “ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị,“ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya.E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya,nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya.Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu.Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a. 7 “ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya.Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya.Ọ bụghị nʼelu ala efu,ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya. 8 Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume,ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya. 9 “ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu,“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ. 10 Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,mụnyekwanụ ọkụ.Jirinụ ụda dị iche ichesizie anụ ahụ nke ọma;surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ. 11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,nchara ya ga-agwụsịkwa. 12 Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru yaemeghị ka ọ gbazee. 13 “ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke. 14 “ ‘Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.’ ” 15 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta. 17 I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.” 18 Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu. 19 Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?” 20 Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke ONYENWE ANYỊ bịakwutere m, 21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha. 22 Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri. 23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu. 24 Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ.’ 25 “Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, 26 nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere. 27 Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.”