Ezekiel 29 (BOICB)
1 Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile. 3 Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị:“ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt,gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi.Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl,ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.” 4 Ma aga m etinye nko nʼagba gị,mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị.Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile,mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị. 5 Aga m ahapụ gịna azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara,ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi,a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu,nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nrinye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile. 6 Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. “ ‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ. 7 Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha. 8 “ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị. 9 Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.” 10 Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush. 11 Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị. 12 Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. 13 “ ‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara. 14 Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ. 15 Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ. 16 Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ.’ ” 17 Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 18 “Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa. 19 Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya. 20 Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.” 21 “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.”
In Other Versions
Ezekiel 29 in the ANGEFD
Ezekiel 29 in the ANTPNG2D
Ezekiel 29 in the AS21
Ezekiel 29 in the BAGH
Ezekiel 29 in the BBPNG
Ezekiel 29 in the BBT1E
Ezekiel 29 in the BDS
Ezekiel 29 in the BEV
Ezekiel 29 in the BHAD
Ezekiel 29 in the BIB
Ezekiel 29 in the BLPT
Ezekiel 29 in the BNT
Ezekiel 29 in the BNTABOOT
Ezekiel 29 in the BNTLV
Ezekiel 29 in the BOATCB
Ezekiel 29 in the BOATCB2
Ezekiel 29 in the BOBCV
Ezekiel 29 in the BOCNT
Ezekiel 29 in the BOECS
Ezekiel 29 in the BOGWICC
Ezekiel 29 in the BOHCB
Ezekiel 29 in the BOHCV
Ezekiel 29 in the BOHLNT
Ezekiel 29 in the BOHNTLTAL
Ezekiel 29 in the BOILNTAP
Ezekiel 29 in the BOITCV
Ezekiel 29 in the BOKCV
Ezekiel 29 in the BOKCV2
Ezekiel 29 in the BOKHWOG
Ezekiel 29 in the BOKSSV
Ezekiel 29 in the BOLCB
Ezekiel 29 in the BOLCB2
Ezekiel 29 in the BOMCV
Ezekiel 29 in the BONAV
Ezekiel 29 in the BONCB
Ezekiel 29 in the BONLT
Ezekiel 29 in the BONUT2
Ezekiel 29 in the BOPLNT
Ezekiel 29 in the BOSCB
Ezekiel 29 in the BOSNC
Ezekiel 29 in the BOTLNT
Ezekiel 29 in the BOVCB
Ezekiel 29 in the BOYCB
Ezekiel 29 in the BPBB
Ezekiel 29 in the BPH
Ezekiel 29 in the BSB
Ezekiel 29 in the CCB
Ezekiel 29 in the CUV
Ezekiel 29 in the CUVS
Ezekiel 29 in the DBT
Ezekiel 29 in the DGDNT
Ezekiel 29 in the DHNT
Ezekiel 29 in the DNT
Ezekiel 29 in the ELBE
Ezekiel 29 in the EMTV
Ezekiel 29 in the ESV
Ezekiel 29 in the FBV
Ezekiel 29 in the FEB
Ezekiel 29 in the GGMNT
Ezekiel 29 in the GNT
Ezekiel 29 in the HARY
Ezekiel 29 in the HNT
Ezekiel 29 in the IRVA
Ezekiel 29 in the IRVB
Ezekiel 29 in the IRVG
Ezekiel 29 in the IRVH
Ezekiel 29 in the IRVK
Ezekiel 29 in the IRVM
Ezekiel 29 in the IRVM2
Ezekiel 29 in the IRVO
Ezekiel 29 in the IRVP
Ezekiel 29 in the IRVT
Ezekiel 29 in the IRVT2
Ezekiel 29 in the IRVU
Ezekiel 29 in the ISVN
Ezekiel 29 in the JSNT
Ezekiel 29 in the KAPI
Ezekiel 29 in the KBT1ETNIK
Ezekiel 29 in the KBV
Ezekiel 29 in the KJV
Ezekiel 29 in the KNFD
Ezekiel 29 in the LBA
Ezekiel 29 in the LBLA
Ezekiel 29 in the LNT
Ezekiel 29 in the LSV
Ezekiel 29 in the MAAL
Ezekiel 29 in the MBV
Ezekiel 29 in the MBV2
Ezekiel 29 in the MHNT
Ezekiel 29 in the MKNFD
Ezekiel 29 in the MNG
Ezekiel 29 in the MNT
Ezekiel 29 in the MNT2
Ezekiel 29 in the MRS1T
Ezekiel 29 in the NAA
Ezekiel 29 in the NASB
Ezekiel 29 in the NBLA
Ezekiel 29 in the NBS
Ezekiel 29 in the NBVTP
Ezekiel 29 in the NET2
Ezekiel 29 in the NIV11
Ezekiel 29 in the NNT
Ezekiel 29 in the NNT2
Ezekiel 29 in the NNT3
Ezekiel 29 in the PDDPT
Ezekiel 29 in the PFNT
Ezekiel 29 in the RMNT
Ezekiel 29 in the SBIAS
Ezekiel 29 in the SBIBS
Ezekiel 29 in the SBIBS2
Ezekiel 29 in the SBICS
Ezekiel 29 in the SBIDS
Ezekiel 29 in the SBIGS
Ezekiel 29 in the SBIHS
Ezekiel 29 in the SBIIS
Ezekiel 29 in the SBIIS2
Ezekiel 29 in the SBIIS3
Ezekiel 29 in the SBIKS
Ezekiel 29 in the SBIKS2
Ezekiel 29 in the SBIMS
Ezekiel 29 in the SBIOS
Ezekiel 29 in the SBIPS
Ezekiel 29 in the SBISS
Ezekiel 29 in the SBITS
Ezekiel 29 in the SBITS2
Ezekiel 29 in the SBITS3
Ezekiel 29 in the SBITS4
Ezekiel 29 in the SBIUS
Ezekiel 29 in the SBIVS
Ezekiel 29 in the SBT
Ezekiel 29 in the SBT1E
Ezekiel 29 in the SCHL
Ezekiel 29 in the SNT
Ezekiel 29 in the SUSU
Ezekiel 29 in the SUSU2
Ezekiel 29 in the SYNO
Ezekiel 29 in the TBIAOTANT
Ezekiel 29 in the TBT1E
Ezekiel 29 in the TBT1E2
Ezekiel 29 in the TFTIP
Ezekiel 29 in the TFTU
Ezekiel 29 in the TGNTATF3T
Ezekiel 29 in the THAI
Ezekiel 29 in the TNFD
Ezekiel 29 in the TNT
Ezekiel 29 in the TNTIK
Ezekiel 29 in the TNTIL
Ezekiel 29 in the TNTIN
Ezekiel 29 in the TNTIP
Ezekiel 29 in the TNTIZ
Ezekiel 29 in the TOMA
Ezekiel 29 in the TTENT
Ezekiel 29 in the UBG
Ezekiel 29 in the UGV
Ezekiel 29 in the UGV2
Ezekiel 29 in the UGV3
Ezekiel 29 in the VBL
Ezekiel 29 in the VDCC
Ezekiel 29 in the YALU
Ezekiel 29 in the YAPE
Ezekiel 29 in the YBVTP
Ezekiel 29 in the ZBP