Ezekiel 31 (BOICB)
1 O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha,“ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu? 3 Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa,nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya.Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn,nke jupụtara nʼalaka mara mma,nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo,nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile. 4 O nwetara mmiri mere ka o buo ibu,na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo.Iyi ha niilena-asọ nʼokpuru ya.Ebe ahụ ka ha si ezipuụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri. 5 Nʼihi ya, o toro tokarịaosisi niile nʼogologo.Ngalaba ya bara ụba,alaka ya topụkwara ogologonʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta. 6 Nʼalaka ya niileka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ,nʼokpuru ndo nke alaka ya niileka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ,oke mba niile dị iche ichebikwara nʼokpuru ndo ya. 7 Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya,nʼogologo nke alaka ya nʼawasa,nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emibanʼebe mmiri dị ukwuu. 8 Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogigeerughị ya nʼọtụtụ.Ọ dịghị osisi junipa niilenwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya,osisi plenụ niileadịghịkwa ka alaka ya,ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige,nke yiri ya nʼịma mma ya 9 Emere m ya ka ọ maa mmasite nʼịba ụba nke alaka o nwere,ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIdennʼubi Chineke a gbara ogige. 10 “ ‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ, 11 Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ. 12 Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha. 13 Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri. 14 Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ. 15 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. 16 Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. 17 Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. 18 “ ‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo.“ ‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ ”
In Other Versions
Ezekiel 31 in the ANGEFD
Ezekiel 31 in the ANTPNG2D
Ezekiel 31 in the AS21
Ezekiel 31 in the BAGH
Ezekiel 31 in the BBPNG
Ezekiel 31 in the BBT1E
Ezekiel 31 in the BDS
Ezekiel 31 in the BEV
Ezekiel 31 in the BHAD
Ezekiel 31 in the BIB
Ezekiel 31 in the BLPT
Ezekiel 31 in the BNT
Ezekiel 31 in the BNTABOOT
Ezekiel 31 in the BNTLV
Ezekiel 31 in the BOATCB
Ezekiel 31 in the BOATCB2
Ezekiel 31 in the BOBCV
Ezekiel 31 in the BOCNT
Ezekiel 31 in the BOECS
Ezekiel 31 in the BOGWICC
Ezekiel 31 in the BOHCB
Ezekiel 31 in the BOHCV
Ezekiel 31 in the BOHLNT
Ezekiel 31 in the BOHNTLTAL
Ezekiel 31 in the BOILNTAP
Ezekiel 31 in the BOITCV
Ezekiel 31 in the BOKCV
Ezekiel 31 in the BOKCV2
Ezekiel 31 in the BOKHWOG
Ezekiel 31 in the BOKSSV
Ezekiel 31 in the BOLCB
Ezekiel 31 in the BOLCB2
Ezekiel 31 in the BOMCV
Ezekiel 31 in the BONAV
Ezekiel 31 in the BONCB
Ezekiel 31 in the BONLT
Ezekiel 31 in the BONUT2
Ezekiel 31 in the BOPLNT
Ezekiel 31 in the BOSCB
Ezekiel 31 in the BOSNC
Ezekiel 31 in the BOTLNT
Ezekiel 31 in the BOVCB
Ezekiel 31 in the BOYCB
Ezekiel 31 in the BPBB
Ezekiel 31 in the BPH
Ezekiel 31 in the BSB
Ezekiel 31 in the CCB
Ezekiel 31 in the CUV
Ezekiel 31 in the CUVS
Ezekiel 31 in the DBT
Ezekiel 31 in the DGDNT
Ezekiel 31 in the DHNT
Ezekiel 31 in the DNT
Ezekiel 31 in the ELBE
Ezekiel 31 in the EMTV
Ezekiel 31 in the ESV
Ezekiel 31 in the FBV
Ezekiel 31 in the FEB
Ezekiel 31 in the GGMNT
Ezekiel 31 in the GNT
Ezekiel 31 in the HARY
Ezekiel 31 in the HNT
Ezekiel 31 in the IRVA
Ezekiel 31 in the IRVB
Ezekiel 31 in the IRVG
Ezekiel 31 in the IRVH
Ezekiel 31 in the IRVK
Ezekiel 31 in the IRVM
Ezekiel 31 in the IRVM2
Ezekiel 31 in the IRVO
Ezekiel 31 in the IRVP
Ezekiel 31 in the IRVT
Ezekiel 31 in the IRVT2
Ezekiel 31 in the IRVU
Ezekiel 31 in the ISVN
Ezekiel 31 in the JSNT
Ezekiel 31 in the KAPI
Ezekiel 31 in the KBT1ETNIK
Ezekiel 31 in the KBV
Ezekiel 31 in the KJV
Ezekiel 31 in the KNFD
Ezekiel 31 in the LBA
Ezekiel 31 in the LBLA
Ezekiel 31 in the LNT
Ezekiel 31 in the LSV
Ezekiel 31 in the MAAL
Ezekiel 31 in the MBV
Ezekiel 31 in the MBV2
Ezekiel 31 in the MHNT
Ezekiel 31 in the MKNFD
Ezekiel 31 in the MNG
Ezekiel 31 in the MNT
Ezekiel 31 in the MNT2
Ezekiel 31 in the MRS1T
Ezekiel 31 in the NAA
Ezekiel 31 in the NASB
Ezekiel 31 in the NBLA
Ezekiel 31 in the NBS
Ezekiel 31 in the NBVTP
Ezekiel 31 in the NET2
Ezekiel 31 in the NIV11
Ezekiel 31 in the NNT
Ezekiel 31 in the NNT2
Ezekiel 31 in the NNT3
Ezekiel 31 in the PDDPT
Ezekiel 31 in the PFNT
Ezekiel 31 in the RMNT
Ezekiel 31 in the SBIAS
Ezekiel 31 in the SBIBS
Ezekiel 31 in the SBIBS2
Ezekiel 31 in the SBICS
Ezekiel 31 in the SBIDS
Ezekiel 31 in the SBIGS
Ezekiel 31 in the SBIHS
Ezekiel 31 in the SBIIS
Ezekiel 31 in the SBIIS2
Ezekiel 31 in the SBIIS3
Ezekiel 31 in the SBIKS
Ezekiel 31 in the SBIKS2
Ezekiel 31 in the SBIMS
Ezekiel 31 in the SBIOS
Ezekiel 31 in the SBIPS
Ezekiel 31 in the SBISS
Ezekiel 31 in the SBITS
Ezekiel 31 in the SBITS2
Ezekiel 31 in the SBITS3
Ezekiel 31 in the SBITS4
Ezekiel 31 in the SBIUS
Ezekiel 31 in the SBIVS
Ezekiel 31 in the SBT
Ezekiel 31 in the SBT1E
Ezekiel 31 in the SCHL
Ezekiel 31 in the SNT
Ezekiel 31 in the SUSU
Ezekiel 31 in the SUSU2
Ezekiel 31 in the SYNO
Ezekiel 31 in the TBIAOTANT
Ezekiel 31 in the TBT1E
Ezekiel 31 in the TBT1E2
Ezekiel 31 in the TFTIP
Ezekiel 31 in the TFTU
Ezekiel 31 in the TGNTATF3T
Ezekiel 31 in the THAI
Ezekiel 31 in the TNFD
Ezekiel 31 in the TNT
Ezekiel 31 in the TNTIK
Ezekiel 31 in the TNTIL
Ezekiel 31 in the TNTIN
Ezekiel 31 in the TNTIP
Ezekiel 31 in the TNTIZ
Ezekiel 31 in the TOMA
Ezekiel 31 in the TTENT
Ezekiel 31 in the UBG
Ezekiel 31 in the UGV
Ezekiel 31 in the UGV2
Ezekiel 31 in the UGV3
Ezekiel 31 in the VBL
Ezekiel 31 in the VDCC
Ezekiel 31 in the YALU
Ezekiel 31 in the YAPE
Ezekiel 31 in the YBVTP
Ezekiel 31 in the ZBP