Ezekiel 33 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị gị okwu sị ha, ‘Mgbe m wetara mma agha imegide mba ọbụla, ma ndị ala ahụ ahọpụta otu onye nʼetiti ha mee ya ka ọ ghọrọ ha onye nche, 3 onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa, 4 ọ bụrụkwa na onye ọbụla anụ opi ike ahụ ma jụ ịnabatara onwe ya ịdọ aka na ntị ahụ, mma agha ahụ gbuo ya, ọbara ya ga-adịkwasị ya nʼisi. 5 Nʼihi na ha nụrụ ụda opi nke ịdọ aka na ntị ahụ ma ha geghị ntị. Ọ bụ ha wetaara onwe ha ịla nʼiyi. A sị na ha gere ntị ha gaara azọpụta ndụ ha. 6 Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’ 7 “Nwa nke mmadụ, emeela m gị ka ị bụrụ onye nche nye ụlọ Izrel. Nʼihi ya, gee ntị nʼihe m na-ekwu, ka ị dọọrọ m ha aka na ntị. 8 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha. 9 Ma ọ bụrụ na ị dọọ onye ajọ omume aka na ntị ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, ma o meghị nke a, ha ga-anwụ nʼihi mmehie ha, ma ndụ gị onwe gị ka ị zọpụtara. 10 “Nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka unu na-ekwu, “Njehie niile anyị na mmehie niile anyị adịla arọ nʼahụ anyị. Ọ bụkwa nʼime ya ka anyị na-ata ahụ. Olee otu anyị ga-esi dị ndụ?” ’ 11 Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’ 12 “Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’ 13 Ọ bụrụ na m asị onye ezi omume, na ọ ghaghị ịdị ndụ, ma onye dị otu a atụkwasị obi nʼezi omume ya mee ajọ ihe, ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Ha ga-anwụ nʼihi ajọ ihe ha mere. 14 Ma ọ bụrụ na m asị onye ajọ omume, ‘Ị ghaghị ịnwụ,’ ma onye ahụ esite na mmehie ya chigharịa, mee ihe ziri ezi na nke dị mma, 15 ọ bụrụ na o nyeghachi ihe ebe ọ naara nʼaka ndị ọ gbazinyere ego, kwụghachi ihe niile o zuuru nʼohi, gbasoo ụkpụrụ ahụ niile bụ nke na-enye ndụ, gharakwa ime ajọ omume; onye dị otu a aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 16 Ọ dịghị mmehie niile nke onye ahụ mere nke a ga-echeta megide ya. Nʼihi na o meela ihe ziri ezi na nke dịkwa mma, ọ gaghị ịdị ndụ. 17 “Ma ndị gị na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma ọ bụ ụzọ ha bụ nke na-ezighị ezi. 18 Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya. 19 Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a. 20 Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.” 21 O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.” 22 Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka ONYENWE ANYỊ ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ. 23 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 24 “Nwa nke mmadụ, ndị ahụ bi nʼebe dakpọsịrị adakpọsị nʼala Izrel na-asị, ‘Ebraham bụ otu nwoke, ma o nwetachara ala a niile! Ma anyị dị ukwuu, nʼihi enyela anyị ala dịka ihe nweta anyị.’ 25 Ya mere, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ebe ọ bụ na unu na-eri anụ nke ọbara dị nʼime ya, na-elekwasịkwa arụsị unu anya, na-awụsikwa ọbara, o kwesiri ka unu nweta ala a? 26 Unu na-atụkwasị obi unu na mma agha unu, unu na-eme ihe arụ dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu na-emerụ nwunye onye agbataobi ya. Ọ bụkwa ala nke a ka unu ga-enweta?’ 27 “Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa. 28 Aga m eme ka ala unu ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Nganga ya, na ike ya ga-agwụsị. Obodo niile dị nʼugwu Izrel ga-aghọ ebe e tikpọrọ etikpọ, mmadụ agakwaghị esite nʼebe ahụ gafee ọzọ. 29 Ha ga-amakwa na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe m mesiri ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi ihe arụ niile nke ha mere.’ 30 “Ma gị onwe gị, nwa nke mmadụ, ndị ala gị na-ekwu banyere gị nʼakụkụ mgbidi ha na nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. Ha na-asịrịta onwe ha, ‘Bịanụ ka anyị gaa nụrụ ozi sitere nʼọnụ ONYENWE ANYỊ.’ 31 Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta. 32 Nʼanya ha, ị dịka onye ji ezigbo olu na-ekwe ukwe ịhụnanya, dịka onye nwere olu ụtọ, nke na-abụ abụ dị ụtọ, na onye maara ka e si eti ịgba. Ha na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha ejighị ya kpọrọ ihe ọbụla. 33 “Ma mgbe nke a bịara na mmezu, nʼihi ọ ghaghị ịbịa, ha ga-amata na onye amụma anọtụla nʼetiti ha.”

In Other Versions

Ezekiel 33 in the ANGEFD

Ezekiel 33 in the ANTPNG2D

Ezekiel 33 in the AS21

Ezekiel 33 in the BAGH

Ezekiel 33 in the BBPNG

Ezekiel 33 in the BBT1E

Ezekiel 33 in the BDS

Ezekiel 33 in the BEV

Ezekiel 33 in the BHAD

Ezekiel 33 in the BIB

Ezekiel 33 in the BLPT

Ezekiel 33 in the BNT

Ezekiel 33 in the BNTABOOT

Ezekiel 33 in the BNTLV

Ezekiel 33 in the BOATCB

Ezekiel 33 in the BOATCB2

Ezekiel 33 in the BOBCV

Ezekiel 33 in the BOCNT

Ezekiel 33 in the BOECS

Ezekiel 33 in the BOGWICC

Ezekiel 33 in the BOHCB

Ezekiel 33 in the BOHCV

Ezekiel 33 in the BOHLNT

Ezekiel 33 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 33 in the BOILNTAP

Ezekiel 33 in the BOITCV

Ezekiel 33 in the BOKCV

Ezekiel 33 in the BOKCV2

Ezekiel 33 in the BOKHWOG

Ezekiel 33 in the BOKSSV

Ezekiel 33 in the BOLCB

Ezekiel 33 in the BOLCB2

Ezekiel 33 in the BOMCV

Ezekiel 33 in the BONAV

Ezekiel 33 in the BONCB

Ezekiel 33 in the BONLT

Ezekiel 33 in the BONUT2

Ezekiel 33 in the BOPLNT

Ezekiel 33 in the BOSCB

Ezekiel 33 in the BOSNC

Ezekiel 33 in the BOTLNT

Ezekiel 33 in the BOVCB

Ezekiel 33 in the BOYCB

Ezekiel 33 in the BPBB

Ezekiel 33 in the BPH

Ezekiel 33 in the BSB

Ezekiel 33 in the CCB

Ezekiel 33 in the CUV

Ezekiel 33 in the CUVS

Ezekiel 33 in the DBT

Ezekiel 33 in the DGDNT

Ezekiel 33 in the DHNT

Ezekiel 33 in the DNT

Ezekiel 33 in the ELBE

Ezekiel 33 in the EMTV

Ezekiel 33 in the ESV

Ezekiel 33 in the FBV

Ezekiel 33 in the FEB

Ezekiel 33 in the GGMNT

Ezekiel 33 in the GNT

Ezekiel 33 in the HARY

Ezekiel 33 in the HNT

Ezekiel 33 in the IRVA

Ezekiel 33 in the IRVB

Ezekiel 33 in the IRVG

Ezekiel 33 in the IRVH

Ezekiel 33 in the IRVK

Ezekiel 33 in the IRVM

Ezekiel 33 in the IRVM2

Ezekiel 33 in the IRVO

Ezekiel 33 in the IRVP

Ezekiel 33 in the IRVT

Ezekiel 33 in the IRVT2

Ezekiel 33 in the IRVU

Ezekiel 33 in the ISVN

Ezekiel 33 in the JSNT

Ezekiel 33 in the KAPI

Ezekiel 33 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 33 in the KBV

Ezekiel 33 in the KJV

Ezekiel 33 in the KNFD

Ezekiel 33 in the LBA

Ezekiel 33 in the LBLA

Ezekiel 33 in the LNT

Ezekiel 33 in the LSV

Ezekiel 33 in the MAAL

Ezekiel 33 in the MBV

Ezekiel 33 in the MBV2

Ezekiel 33 in the MHNT

Ezekiel 33 in the MKNFD

Ezekiel 33 in the MNG

Ezekiel 33 in the MNT

Ezekiel 33 in the MNT2

Ezekiel 33 in the MRS1T

Ezekiel 33 in the NAA

Ezekiel 33 in the NASB

Ezekiel 33 in the NBLA

Ezekiel 33 in the NBS

Ezekiel 33 in the NBVTP

Ezekiel 33 in the NET2

Ezekiel 33 in the NIV11

Ezekiel 33 in the NNT

Ezekiel 33 in the NNT2

Ezekiel 33 in the NNT3

Ezekiel 33 in the PDDPT

Ezekiel 33 in the PFNT

Ezekiel 33 in the RMNT

Ezekiel 33 in the SBIAS

Ezekiel 33 in the SBIBS

Ezekiel 33 in the SBIBS2

Ezekiel 33 in the SBICS

Ezekiel 33 in the SBIDS

Ezekiel 33 in the SBIGS

Ezekiel 33 in the SBIHS

Ezekiel 33 in the SBIIS

Ezekiel 33 in the SBIIS2

Ezekiel 33 in the SBIIS3

Ezekiel 33 in the SBIKS

Ezekiel 33 in the SBIKS2

Ezekiel 33 in the SBIMS

Ezekiel 33 in the SBIOS

Ezekiel 33 in the SBIPS

Ezekiel 33 in the SBISS

Ezekiel 33 in the SBITS

Ezekiel 33 in the SBITS2

Ezekiel 33 in the SBITS3

Ezekiel 33 in the SBITS4

Ezekiel 33 in the SBIUS

Ezekiel 33 in the SBIVS

Ezekiel 33 in the SBT

Ezekiel 33 in the SBT1E

Ezekiel 33 in the SCHL

Ezekiel 33 in the SNT

Ezekiel 33 in the SUSU

Ezekiel 33 in the SUSU2

Ezekiel 33 in the SYNO

Ezekiel 33 in the TBIAOTANT

Ezekiel 33 in the TBT1E

Ezekiel 33 in the TBT1E2

Ezekiel 33 in the TFTIP

Ezekiel 33 in the TFTU

Ezekiel 33 in the TGNTATF3T

Ezekiel 33 in the THAI

Ezekiel 33 in the TNFD

Ezekiel 33 in the TNT

Ezekiel 33 in the TNTIK

Ezekiel 33 in the TNTIL

Ezekiel 33 in the TNTIN

Ezekiel 33 in the TNTIP

Ezekiel 33 in the TNTIZ

Ezekiel 33 in the TOMA

Ezekiel 33 in the TTENT

Ezekiel 33 in the UBG

Ezekiel 33 in the UGV

Ezekiel 33 in the UGV2

Ezekiel 33 in the UGV3

Ezekiel 33 in the VBL

Ezekiel 33 in the VDCC

Ezekiel 33 in the YALU

Ezekiel 33 in the YAPE

Ezekiel 33 in the YBVTP

Ezekiel 33 in the ZBP