Ezekiel 38 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼala Magog, bukwaa amụma megide Gog, bụ onyeisi nke Meshek na Tubal. Buo amụma megide ya, 3 sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ana m edo onwe m imegide gị, Gog, eze ukwu ndị Meshek na Tubal. 4 Aga m echigharị gị, tinye gị nko nʼagba gị abụọ, jiri ya kpụpụta gị na usuu ndị agha gị niile, na ịnyịnya gị, na ndị na-agba ịnyịnya gị na ihe agha ha, na usuu ndị agha gị niile, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ndị niile na-ejide mma agha ha. 5 Peshịa na Itiopia, na Put, ga-esonyere ha, ha niile ga-ejikwa ọta ha na okpu agha ha. 6 Goma na usuu ndị agha ya niile, na ndị agha Bet Togama ndị si nʼakụkụ ugwu, dị ebe dị anya na ọtụtụ ndị mba ọzọ ga-eso gị. 7 “ ‘Jikere! Jikere onwe gị, gị onwe gị na usuu ndị agha ahụ nọ gị gburugburu, gị Gog, bụrụkwa onyendu ha. 8 Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-akpọlite gị ibu agha. Nʼogologo oge dị nʼihu, ị ga-ebuso ala ahụ agha bụ ala ahụ na-enwetaghachi onwe ya site na mbibi nke ibu agha; ala ahụ e si na mba dị iche iche chịkọtaa ndị bi nʼime ya, mee ka ha birikwa nʼugwu niile nke Izrel ahụ naara atọgbọ nʼefu. E bulatara ha site na mba dị iche iche, ma ugbu a, ha anọrọla nʼudo. 9 Gị onwe gị, na ndị agha gị niile, na ọtụtụ ndị mba ahụ dị iche iche ndị na-eso gị, jiri ọsọ, dịka ikuku siri ike, rigoo, kpuchie ala ahụ dịka igwe ojii. 10 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị. 11 Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. 12 Aga m akwata ihe nkwata, lụtakwa ihe nlụta nʼagha. Aga m eweli aka m megide obodo ndị a niile e wugharịrị ewugharị, megidekwa ndị a niile e si na mba dị iche iche chịkọtaa, bụ ndị bara ọgaranya nʼanụ ụlọ na ngwongwo dị iche iche, ndị bikwa nʼetiti ala a.” 13 Ndị Sheba na Dedan, na ndị ahịa Tashish niile, na ụmụ ọdụm ya niile ga-ajụ gị, “Ị bịara ịkwata ihe nkwata? Ị chịkọtara usuu ndị agha gị nʼihi ịkwara ihe nlụta, na iburu ọlaọcha na ọlaedo, na ịchịrị igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha, na ịkwakọrọ ihe ha nwere nʼike?” ’ 14 “Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma sị Gog, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Nʼụbọchị ahụ mgbe ndị m bụ Izrel na-ebi nʼudo nʼala ha, ọ bụ na ị gaghị ahụta ya? 15 Ị ga-esi nʼebe obibi gị dị nʼugwu bịa, gị na ọtụtụ mba dị iche iche, ndị na-anọkwasị nʼịnyịnya. Ha ga-adị ukwuu, bụrụ ndị agha dị ike. 16 Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’ 17 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m. 18 Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 19 Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ. 20 Azụ niile dị nʼoke osimiri, na anụ ufe nke eluigwe, na anụ ọhịa, na ihe niile na-akpụ akpụ, na mmadụ niile nọ nʼelu ụwa ga-ama jijiji nʼihu m. A ga-akwatu ugwu niile, ebe niile dị mkputamkpu ga-adarukwa ala. 21 Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 22 Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ. 23 Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’

In Other Versions

Ezekiel 38 in the ANGEFD

Ezekiel 38 in the ANTPNG2D

Ezekiel 38 in the AS21

Ezekiel 38 in the BAGH

Ezekiel 38 in the BBPNG

Ezekiel 38 in the BBT1E

Ezekiel 38 in the BDS

Ezekiel 38 in the BEV

Ezekiel 38 in the BHAD

Ezekiel 38 in the BIB

Ezekiel 38 in the BLPT

Ezekiel 38 in the BNT

Ezekiel 38 in the BNTABOOT

Ezekiel 38 in the BNTLV

Ezekiel 38 in the BOATCB

Ezekiel 38 in the BOATCB2

Ezekiel 38 in the BOBCV

Ezekiel 38 in the BOCNT

Ezekiel 38 in the BOECS

Ezekiel 38 in the BOGWICC

Ezekiel 38 in the BOHCB

Ezekiel 38 in the BOHCV

Ezekiel 38 in the BOHLNT

Ezekiel 38 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 38 in the BOILNTAP

Ezekiel 38 in the BOITCV

Ezekiel 38 in the BOKCV

Ezekiel 38 in the BOKCV2

Ezekiel 38 in the BOKHWOG

Ezekiel 38 in the BOKSSV

Ezekiel 38 in the BOLCB

Ezekiel 38 in the BOLCB2

Ezekiel 38 in the BOMCV

Ezekiel 38 in the BONAV

Ezekiel 38 in the BONCB

Ezekiel 38 in the BONLT

Ezekiel 38 in the BONUT2

Ezekiel 38 in the BOPLNT

Ezekiel 38 in the BOSCB

Ezekiel 38 in the BOSNC

Ezekiel 38 in the BOTLNT

Ezekiel 38 in the BOVCB

Ezekiel 38 in the BOYCB

Ezekiel 38 in the BPBB

Ezekiel 38 in the BPH

Ezekiel 38 in the BSB

Ezekiel 38 in the CCB

Ezekiel 38 in the CUV

Ezekiel 38 in the CUVS

Ezekiel 38 in the DBT

Ezekiel 38 in the DGDNT

Ezekiel 38 in the DHNT

Ezekiel 38 in the DNT

Ezekiel 38 in the ELBE

Ezekiel 38 in the EMTV

Ezekiel 38 in the ESV

Ezekiel 38 in the FBV

Ezekiel 38 in the FEB

Ezekiel 38 in the GGMNT

Ezekiel 38 in the GNT

Ezekiel 38 in the HARY

Ezekiel 38 in the HNT

Ezekiel 38 in the IRVA

Ezekiel 38 in the IRVB

Ezekiel 38 in the IRVG

Ezekiel 38 in the IRVH

Ezekiel 38 in the IRVK

Ezekiel 38 in the IRVM

Ezekiel 38 in the IRVM2

Ezekiel 38 in the IRVO

Ezekiel 38 in the IRVP

Ezekiel 38 in the IRVT

Ezekiel 38 in the IRVT2

Ezekiel 38 in the IRVU

Ezekiel 38 in the ISVN

Ezekiel 38 in the JSNT

Ezekiel 38 in the KAPI

Ezekiel 38 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 38 in the KBV

Ezekiel 38 in the KJV

Ezekiel 38 in the KNFD

Ezekiel 38 in the LBA

Ezekiel 38 in the LBLA

Ezekiel 38 in the LNT

Ezekiel 38 in the LSV

Ezekiel 38 in the MAAL

Ezekiel 38 in the MBV

Ezekiel 38 in the MBV2

Ezekiel 38 in the MHNT

Ezekiel 38 in the MKNFD

Ezekiel 38 in the MNG

Ezekiel 38 in the MNT

Ezekiel 38 in the MNT2

Ezekiel 38 in the MRS1T

Ezekiel 38 in the NAA

Ezekiel 38 in the NASB

Ezekiel 38 in the NBLA

Ezekiel 38 in the NBS

Ezekiel 38 in the NBVTP

Ezekiel 38 in the NET2

Ezekiel 38 in the NIV11

Ezekiel 38 in the NNT

Ezekiel 38 in the NNT2

Ezekiel 38 in the NNT3

Ezekiel 38 in the PDDPT

Ezekiel 38 in the PFNT

Ezekiel 38 in the RMNT

Ezekiel 38 in the SBIAS

Ezekiel 38 in the SBIBS

Ezekiel 38 in the SBIBS2

Ezekiel 38 in the SBICS

Ezekiel 38 in the SBIDS

Ezekiel 38 in the SBIGS

Ezekiel 38 in the SBIHS

Ezekiel 38 in the SBIIS

Ezekiel 38 in the SBIIS2

Ezekiel 38 in the SBIIS3

Ezekiel 38 in the SBIKS

Ezekiel 38 in the SBIKS2

Ezekiel 38 in the SBIMS

Ezekiel 38 in the SBIOS

Ezekiel 38 in the SBIPS

Ezekiel 38 in the SBISS

Ezekiel 38 in the SBITS

Ezekiel 38 in the SBITS2

Ezekiel 38 in the SBITS3

Ezekiel 38 in the SBITS4

Ezekiel 38 in the SBIUS

Ezekiel 38 in the SBIVS

Ezekiel 38 in the SBT

Ezekiel 38 in the SBT1E

Ezekiel 38 in the SCHL

Ezekiel 38 in the SNT

Ezekiel 38 in the SUSU

Ezekiel 38 in the SUSU2

Ezekiel 38 in the SYNO

Ezekiel 38 in the TBIAOTANT

Ezekiel 38 in the TBT1E

Ezekiel 38 in the TBT1E2

Ezekiel 38 in the TFTIP

Ezekiel 38 in the TFTU

Ezekiel 38 in the TGNTATF3T

Ezekiel 38 in the THAI

Ezekiel 38 in the TNFD

Ezekiel 38 in the TNT

Ezekiel 38 in the TNTIK

Ezekiel 38 in the TNTIL

Ezekiel 38 in the TNTIN

Ezekiel 38 in the TNTIP

Ezekiel 38 in the TNTIZ

Ezekiel 38 in the TOMA

Ezekiel 38 in the TTENT

Ezekiel 38 in the UBG

Ezekiel 38 in the UGV

Ezekiel 38 in the UGV2

Ezekiel 38 in the UGV3

Ezekiel 38 in the VBL

Ezekiel 38 in the VDCC

Ezekiel 38 in the YALU

Ezekiel 38 in the YAPE

Ezekiel 38 in the YBVTP

Ezekiel 38 in the ZBP