Ezekiel 43 (BOICB)

1 Emesịa, ọ kpọbatakwara m nʼọnụ ụzọ mbata nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. 2 Ma lee, ahụrụ m ebube Chineke nke Izrel ka o si nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-apụta. Olu ya dị ka mbigbọ nke ebili mmiri, ebube ya nwukwara nʼala ahụ niile. 3 Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja. 4 Ebube ONYENWE ANYỊ sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ. 5 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke buliri m bubata m nʼime ogige nke ime, ma ebube nke ONYENWE ANYỊ jupụtara nʼụlọnsọ ukwu ahụ. 6 Mgbe ahụ, anụrụ m olu ka o si nʼụlọnsọ ahụ na-agwa m okwu, dịka nwoke ahụ na-eguzokwa nʼakụkụ m. 7 Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ebe a bụ ebe nke ocheeze, na ebe nke ọbụ ụkwụ m abụọ ga-anọgide, ebe a ka m ga-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo mgbe ebighị ebi. Ụlọ Izrel agaghị emerụkwa aha nsọ m ọzọ, ha onwe ha maọbụ ndị eze ha, site nʼikpere arụsị niile ha na ibubata onyinye olili ozu ndị eze ha, mgbe ha nwụrụ anwụ. 8 Mgbe ha wuru mbata ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ mbata ọnụ ụzọ m, tinye ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ ọnụ ụzọ m, ọ bụkwa naanị mgbidi bụ ihe dị nʼetiti mụ na ha. Ha merụrụ aha nsọ m site nʼihe arụ niile ha mere. Ya mere m ji bibie ha nʼiwe m. 9 Ugbu a, ka ha wezuga adịghị ọcha na ife chi ndị ọzọ ha nʼihu m, bupụkwa onyinye olili ozu ndị eze ha nʼebe m nọ, mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ha ruo mgbe ebighị ebi. 10 “Nwa nke mmadụ, kọwaara ụmụ Izrel ụlọnsọ ahụ m ziri gị. Gwa ha ụdịdị ya, na ịpụ iche ya, ka ihere mee ha nʼihi mmehie ha. 11 Ọ bụrụ nʼezie na ihere emee ha nʼihi ihe ha mere, mgbe ahụ, kọwaara ha ihe niile metụtara otu a ga-esi wuo ụlọnsọ a, na ihe gbasara nkwado ya, na ihe gbasara ọnụ ụzọ ọpụpụ na mbata ya niile, ihe metụtara ebumnobi nke owuwu ya niile na usoro na iwu niile banyere ya. Depụta ihe ndị a nʼihu ha, nye ha ka ha lezie anya mezuo ihe niile metụtara usoro a ga-agbaso wuo ya. 12 “Nke a bụ iwu ụlọ banyere nsọ ukwu ahụ. Ebe niile gbara elu ugwu a gburugburu ga-abụ ebe dịkarịsịrị nsọ! Nke a bụ iwu ụlọnsọ ahụ. 13 “Nke a bụ ọtụtụ niile gbasara ebe ịchụ aja ya: Ịdị elu nke ala ya bụ iri sentimita ise na atọ; ịgba gburugburu nke ọnụ ya bụ iri sentimita abụọ na atọ; obosara ya dị iri sentimita ise na atọ. Otu a ka ebe ịchụ aja ahụ ga-aha nʼogologo. 14 Site nʼụkwụ ya nke dị nʼala ruo nʼokere ya nke etiti, ọ ga-adị otu mita nʼogologo nakwa nʼuhie; site nʼokere nke nta ruo na nke ukwu ga-adị mita abụọ nʼogologo na ọkara nʼuhie. 15 Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita abụọ, mpi anọ sikwa nʼakụkụ ya gbagoo elu, nke ọbụla nʼime ha ga-adị ọkara mita nʼogologo. 16 Ebe nsure ọkụ nke ebe ịchụ aja ahụ ga-adị mita isii nʼogologo na mita isii nʼuhie, nwee akụkụ anọ nke ha nʼotu. 17 Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.” 18 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ndị a bụ usoro metụtara iwu ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ifesa ọbara nʼelu ebe ịchụ aja mgbe e wusiri ya. 19 Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị Livayị si nʼezinaụlọ Zadọk, bụ ndị na-abịa m nso ife ofufe nʼihu m, otu oke ehi maka aja mmehie, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 20 Unu ga-ewere ụfọdụ nʼọbara ya tee na mpi anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke mbadamba nkume dị nʼelu, na gburugburu ọnụ ọnụ ya, si otu a sachaa ebe ịchụ aja ahụ, kpuchikwaara ya mmehie. 21 Mgbe ahụ, a ga-ewere nwa oke ehi e ji chụọ aja mmehie ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼebe a kwadoro nʼezi ụlọnsọ ukwu ahụ. 22 “Nʼụbọchị nke abụọ, ị ga-eji nwa mkpi na-enweghị ntụpọ chụọ aja mmehie. A ga-eme ka ebe ịchụ aja dị ọcha, dịka e ji oke ehi ahụ mee ka ọ dị ọcha. 23 Mgbe i mechara mmemme nsacha ndị a, werekwa nwa oke ehi ọzọ nke na-enweghị ntụpọ, na nwa ebule site nʼigwe anụ nke na-enweghị ntụpọ chụọ aja. 24 Were ha jee chee nʼihu ONYENWE ANYỊ, ka ndị nchụaja were nnu fesa ha dịka aja nsure ọkụ a chụrụ nye ONYENWE ANYỊ. 25 “Ụbọchị asaa, kwa ụbọchị ka ị ga-ewepụta otu mkpi, na nwa oke ehi, na nwa ebule site nʼigwe anụ ndị ahụ, chụọ aja mmehie. Ha niile ga-abụ ụmụ anụmanụ ndị na-enweghị ntụpọ. 26 Ụbọchị asaa ka ha ga na-achụ aja ikpuchi mmehie nʼihi ebe ịchụ aja, mee ka ọ dị ọcha, site otu a doo ya nsọ. 27 Ụbọchị nke asatọ, na nʼụbọchị ọbụla so ya, ndị nchụaja ga-achụ aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja, chụọkwa aja udo. Mgbe ahụ, aga m anabatakwa unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.”

In Other Versions

Ezekiel 43 in the ANGEFD

Ezekiel 43 in the ANTPNG2D

Ezekiel 43 in the AS21

Ezekiel 43 in the BAGH

Ezekiel 43 in the BBPNG

Ezekiel 43 in the BBT1E

Ezekiel 43 in the BDS

Ezekiel 43 in the BEV

Ezekiel 43 in the BHAD

Ezekiel 43 in the BIB

Ezekiel 43 in the BLPT

Ezekiel 43 in the BNT

Ezekiel 43 in the BNTABOOT

Ezekiel 43 in the BNTLV

Ezekiel 43 in the BOATCB

Ezekiel 43 in the BOATCB2

Ezekiel 43 in the BOBCV

Ezekiel 43 in the BOCNT

Ezekiel 43 in the BOECS

Ezekiel 43 in the BOGWICC

Ezekiel 43 in the BOHCB

Ezekiel 43 in the BOHCV

Ezekiel 43 in the BOHLNT

Ezekiel 43 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 43 in the BOILNTAP

Ezekiel 43 in the BOITCV

Ezekiel 43 in the BOKCV

Ezekiel 43 in the BOKCV2

Ezekiel 43 in the BOKHWOG

Ezekiel 43 in the BOKSSV

Ezekiel 43 in the BOLCB

Ezekiel 43 in the BOLCB2

Ezekiel 43 in the BOMCV

Ezekiel 43 in the BONAV

Ezekiel 43 in the BONCB

Ezekiel 43 in the BONLT

Ezekiel 43 in the BONUT2

Ezekiel 43 in the BOPLNT

Ezekiel 43 in the BOSCB

Ezekiel 43 in the BOSNC

Ezekiel 43 in the BOTLNT

Ezekiel 43 in the BOVCB

Ezekiel 43 in the BOYCB

Ezekiel 43 in the BPBB

Ezekiel 43 in the BPH

Ezekiel 43 in the BSB

Ezekiel 43 in the CCB

Ezekiel 43 in the CUV

Ezekiel 43 in the CUVS

Ezekiel 43 in the DBT

Ezekiel 43 in the DGDNT

Ezekiel 43 in the DHNT

Ezekiel 43 in the DNT

Ezekiel 43 in the ELBE

Ezekiel 43 in the EMTV

Ezekiel 43 in the ESV

Ezekiel 43 in the FBV

Ezekiel 43 in the FEB

Ezekiel 43 in the GGMNT

Ezekiel 43 in the GNT

Ezekiel 43 in the HARY

Ezekiel 43 in the HNT

Ezekiel 43 in the IRVA

Ezekiel 43 in the IRVB

Ezekiel 43 in the IRVG

Ezekiel 43 in the IRVH

Ezekiel 43 in the IRVK

Ezekiel 43 in the IRVM

Ezekiel 43 in the IRVM2

Ezekiel 43 in the IRVO

Ezekiel 43 in the IRVP

Ezekiel 43 in the IRVT

Ezekiel 43 in the IRVT2

Ezekiel 43 in the IRVU

Ezekiel 43 in the ISVN

Ezekiel 43 in the JSNT

Ezekiel 43 in the KAPI

Ezekiel 43 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 43 in the KBV

Ezekiel 43 in the KJV

Ezekiel 43 in the KNFD

Ezekiel 43 in the LBA

Ezekiel 43 in the LBLA

Ezekiel 43 in the LNT

Ezekiel 43 in the LSV

Ezekiel 43 in the MAAL

Ezekiel 43 in the MBV

Ezekiel 43 in the MBV2

Ezekiel 43 in the MHNT

Ezekiel 43 in the MKNFD

Ezekiel 43 in the MNG

Ezekiel 43 in the MNT

Ezekiel 43 in the MNT2

Ezekiel 43 in the MRS1T

Ezekiel 43 in the NAA

Ezekiel 43 in the NASB

Ezekiel 43 in the NBLA

Ezekiel 43 in the NBS

Ezekiel 43 in the NBVTP

Ezekiel 43 in the NET2

Ezekiel 43 in the NIV11

Ezekiel 43 in the NNT

Ezekiel 43 in the NNT2

Ezekiel 43 in the NNT3

Ezekiel 43 in the PDDPT

Ezekiel 43 in the PFNT

Ezekiel 43 in the RMNT

Ezekiel 43 in the SBIAS

Ezekiel 43 in the SBIBS

Ezekiel 43 in the SBIBS2

Ezekiel 43 in the SBICS

Ezekiel 43 in the SBIDS

Ezekiel 43 in the SBIGS

Ezekiel 43 in the SBIHS

Ezekiel 43 in the SBIIS

Ezekiel 43 in the SBIIS2

Ezekiel 43 in the SBIIS3

Ezekiel 43 in the SBIKS

Ezekiel 43 in the SBIKS2

Ezekiel 43 in the SBIMS

Ezekiel 43 in the SBIOS

Ezekiel 43 in the SBIPS

Ezekiel 43 in the SBISS

Ezekiel 43 in the SBITS

Ezekiel 43 in the SBITS2

Ezekiel 43 in the SBITS3

Ezekiel 43 in the SBITS4

Ezekiel 43 in the SBIUS

Ezekiel 43 in the SBIVS

Ezekiel 43 in the SBT

Ezekiel 43 in the SBT1E

Ezekiel 43 in the SCHL

Ezekiel 43 in the SNT

Ezekiel 43 in the SUSU

Ezekiel 43 in the SUSU2

Ezekiel 43 in the SYNO

Ezekiel 43 in the TBIAOTANT

Ezekiel 43 in the TBT1E

Ezekiel 43 in the TBT1E2

Ezekiel 43 in the TFTIP

Ezekiel 43 in the TFTU

Ezekiel 43 in the TGNTATF3T

Ezekiel 43 in the THAI

Ezekiel 43 in the TNFD

Ezekiel 43 in the TNT

Ezekiel 43 in the TNTIK

Ezekiel 43 in the TNTIL

Ezekiel 43 in the TNTIN

Ezekiel 43 in the TNTIP

Ezekiel 43 in the TNTIZ

Ezekiel 43 in the TOMA

Ezekiel 43 in the TTENT

Ezekiel 43 in the UBG

Ezekiel 43 in the UGV

Ezekiel 43 in the UGV2

Ezekiel 43 in the UGV3

Ezekiel 43 in the VBL

Ezekiel 43 in the VDCC

Ezekiel 43 in the YALU

Ezekiel 43 in the YAPE

Ezekiel 43 in the YBVTP

Ezekiel 43 in the ZBP