Galatians 2 (BOICB)
1 Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee. 2 Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu. 3 Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik. 4 Ndị ahụ na-abụghị ndị kwere ekwe nʼezie e zobatara na nzukọ inyochapụta otu anyị si nwere onwe anyị nʼime Kraịst Jisọs, ka ha nwee ike mee anyị ndị ohu. 5 Ma o nweghị oge anyị ji gee ntị nʼihe ha kwuru, nʼihi na anyị chọrọ ichedo eziokwu ahụ dị nʼoziọma ka a ghara ịgwa ya ihe ọbụla nʼetiti unu. 6 Banyere ndị a na-ewe ka ndị dị ndu dị mkpa, ihe ọbụla ọnọdụ ha bụ ewetaghị mgbanwe ọbụla nʼebe m nọ, nʼihi na Chineke adịghị ele mmadụ anya nʼihu. Ndị ahụ atụkwasịghị ihe ọbụla nʼoziọma m na-ezisa. 7 Ma nʼaka nke ọzọ, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izisa oziọma nʼetiti ndị e bighị ugwu, dịka e nyere Pita izisa oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu. 8 Nʼihi na Chineke onye si nʼaka Pita na-arụ ọrụ onyeozi oziọma nʼetiti ndị e biri ugwu, sikwa nʼime m na-arụ ọrụ onyeozi izisara ndị mba ọzọ oziọma. 9 Mgbe Jemis, Sefas na Jọn ndị a maara dị ka ide ji ụlọ nʼetiti ndị ndu ahụ niile nara m na Banabas aka nnwekọ, nabatakwa amara e nyere m. Ha gbara anyị ume, sị anyị gaa nʼihu nʼọrụ anyị, ikwusa oziọma nʼetiti ndị mba ọzọ, ka ha onwe ha kwa gaa nʼihu ịrụ ọrụ nke ha nʼetiti ndị e biri ugwu. 10 Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime. 11 Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe. 12 Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya. 13 Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya. 14 Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?” 15 Anyị onwe anyị bụ ndị Juu site nʼọmụmụ a mụrụ anyị, anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ ndị mmehie, 16 ma anyị maara na a dịghị agụ mmadụ ọbụla dị ka onye ezi omume site nʼọrụ nke iwu kama ọ bụ naanị site nʼokwukwe na Jisọs Kraịst. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst ka a gụọ anyị na ndị ezi omume, site nʼokwukwe anyị kwere na Kraịst, ọ bụghị nʼihi na anyị rụrụ ọrụ nke iwu. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla a ga-agụnye ka onye ezi omume nʼihi na ọ rụrụ ọrụ nke iwu. 17 Ma ọ bụrụ, na mgbe anyị na-achọ ka a gụọ anyị dị ka ndị ezi omume nʼime Kraịst, anyị onwe anyị a bụrụ ndị achọpụtara dịka ndị mmehie. Nke a, ọ pụtara na Kraịst na-akwado mmehie? Mba! 18 Kama, ọ bụrụ na m ewugharịa ihe ndị ahụ m buru ụzọ mebie, ana m egosi na m bụ onye na-emebi iwu. 19 Nʼihi na-esitere m nʼaka iwu nwụọ nʼebe iwu dị, ka m nwee ike dị ndụ nʼebe Chineke nọ. Akpọgidela mụ na Kraịst nʼobe. 20 Ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nʼime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a nʼanụ ahụ m bụ nke m na-adị nʼihi okwukwe m nwere nʼime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nʼanya, ma werekwa onwe ya nye nʼihi m. 21 Anaghị m akpọ amara Chineke ihe na-enweghị isi. Nʼihi na a sị na a pụrụ ịgụ mmadụ dị ka onye ezi omume site nʼidebe iwu, mgbe ahụ ọnwụ Kraịst nwụrụ abaghị uru.
In Other Versions
Galatians 2 in the ANGEFD
Galatians 2 in the ANTPNG2D
Galatians 2 in the AS21
Galatians 2 in the BAGH
Galatians 2 in the BBPNG
Galatians 2 in the BBT1E
Galatians 2 in the BDS
Galatians 2 in the BEV
Galatians 2 in the BHAD
Galatians 2 in the BIB
Galatians 2 in the BLPT
Galatians 2 in the BNT
Galatians 2 in the BNTABOOT
Galatians 2 in the BNTLV
Galatians 2 in the BOATCB
Galatians 2 in the BOATCB2
Galatians 2 in the BOBCV
Galatians 2 in the BOCNT
Galatians 2 in the BOECS
Galatians 2 in the BOGWICC
Galatians 2 in the BOHCB
Galatians 2 in the BOHCV
Galatians 2 in the BOHLNT
Galatians 2 in the BOHNTLTAL
Galatians 2 in the BOILNTAP
Galatians 2 in the BOITCV
Galatians 2 in the BOKCV
Galatians 2 in the BOKCV2
Galatians 2 in the BOKHWOG
Galatians 2 in the BOKSSV
Galatians 2 in the BOLCB
Galatians 2 in the BOLCB2
Galatians 2 in the BOMCV
Galatians 2 in the BONAV
Galatians 2 in the BONCB
Galatians 2 in the BONLT
Galatians 2 in the BONUT2
Galatians 2 in the BOPLNT
Galatians 2 in the BOSCB
Galatians 2 in the BOSNC
Galatians 2 in the BOTLNT
Galatians 2 in the BOVCB
Galatians 2 in the BOYCB
Galatians 2 in the BPBB
Galatians 2 in the BPH
Galatians 2 in the BSB
Galatians 2 in the CCB
Galatians 2 in the CUV
Galatians 2 in the CUVS
Galatians 2 in the DBT
Galatians 2 in the DGDNT
Galatians 2 in the DHNT
Galatians 2 in the DNT
Galatians 2 in the ELBE
Galatians 2 in the EMTV
Galatians 2 in the ESV
Galatians 2 in the FBV
Galatians 2 in the FEB
Galatians 2 in the GGMNT
Galatians 2 in the GNT
Galatians 2 in the HARY
Galatians 2 in the HNT
Galatians 2 in the IRVA
Galatians 2 in the IRVB
Galatians 2 in the IRVG
Galatians 2 in the IRVH
Galatians 2 in the IRVK
Galatians 2 in the IRVM
Galatians 2 in the IRVM2
Galatians 2 in the IRVO
Galatians 2 in the IRVP
Galatians 2 in the IRVT
Galatians 2 in the IRVT2
Galatians 2 in the IRVU
Galatians 2 in the ISVN
Galatians 2 in the JSNT
Galatians 2 in the KAPI
Galatians 2 in the KBT1ETNIK
Galatians 2 in the KBV
Galatians 2 in the KJV
Galatians 2 in the KNFD
Galatians 2 in the LBA
Galatians 2 in the LBLA
Galatians 2 in the LNT
Galatians 2 in the LSV
Galatians 2 in the MAAL
Galatians 2 in the MBV
Galatians 2 in the MBV2
Galatians 2 in the MHNT
Galatians 2 in the MKNFD
Galatians 2 in the MNG
Galatians 2 in the MNT
Galatians 2 in the MNT2
Galatians 2 in the MRS1T
Galatians 2 in the NAA
Galatians 2 in the NASB
Galatians 2 in the NBLA
Galatians 2 in the NBS
Galatians 2 in the NBVTP
Galatians 2 in the NET2
Galatians 2 in the NIV11
Galatians 2 in the NNT
Galatians 2 in the NNT2
Galatians 2 in the NNT3
Galatians 2 in the PDDPT
Galatians 2 in the PFNT
Galatians 2 in the RMNT
Galatians 2 in the SBIAS
Galatians 2 in the SBIBS
Galatians 2 in the SBIBS2
Galatians 2 in the SBICS
Galatians 2 in the SBIDS
Galatians 2 in the SBIGS
Galatians 2 in the SBIHS
Galatians 2 in the SBIIS
Galatians 2 in the SBIIS2
Galatians 2 in the SBIIS3
Galatians 2 in the SBIKS
Galatians 2 in the SBIKS2
Galatians 2 in the SBIMS
Galatians 2 in the SBIOS
Galatians 2 in the SBIPS
Galatians 2 in the SBISS
Galatians 2 in the SBITS
Galatians 2 in the SBITS2
Galatians 2 in the SBITS3
Galatians 2 in the SBITS4
Galatians 2 in the SBIUS
Galatians 2 in the SBIVS
Galatians 2 in the SBT
Galatians 2 in the SBT1E
Galatians 2 in the SCHL
Galatians 2 in the SNT
Galatians 2 in the SUSU
Galatians 2 in the SUSU2
Galatians 2 in the SYNO
Galatians 2 in the TBIAOTANT
Galatians 2 in the TBT1E
Galatians 2 in the TBT1E2
Galatians 2 in the TFTIP
Galatians 2 in the TFTU
Galatians 2 in the TGNTATF3T
Galatians 2 in the THAI
Galatians 2 in the TNFD
Galatians 2 in the TNT
Galatians 2 in the TNTIK
Galatians 2 in the TNTIL
Galatians 2 in the TNTIN
Galatians 2 in the TNTIP
Galatians 2 in the TNTIZ
Galatians 2 in the TOMA
Galatians 2 in the TTENT
Galatians 2 in the UBG
Galatians 2 in the UGV
Galatians 2 in the UGV2
Galatians 2 in the UGV3
Galatians 2 in the VBL
Galatians 2 in the VDCC
Galatians 2 in the YALU
Galatians 2 in the YAPE
Galatians 2 in the YBVTP
Galatians 2 in the ZBP