Galatians 4 (BOICB)

1 Isiokwu m bụ nke a, mgbe nwa bụ onye ga-eketa ihe nna ya ka dị na nwata, ọnọdụ ya akaghị mma karịa nke ohu, ọ bụ ezie na akụ ahụ niile bụ nke ya. 2 Ma ha ka nọ nʼokpuru ndị nlekọta na ndị e tinyere ya nʼaka ruo oge nna ya kwuru. 3 Otu a ka ọnọdụ anyị dị, mgbe anyị bụ ụmụntakịrị. Anyị nọ dị ka ohu nʼokpuru mmụọ nke ụwa. 4 Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu, 5 ka ọ gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara. 6 Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka ọ bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, “Abba, Nna.” 7 Ugbu a, ị bụkwaghị ohu, kama ị bụ nwa. Ebe ị bụ nwa, e meekwala ka ị bụrụ onye nketa site na Chineke. 8 Nʼoge gara aga, mgbe unu na-amaghị Chineke, unu bụ ohu nye chi niile nke na-abụghị dịka ha si pụta ụwa. 9 Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa? 10 Unu na-edebe ụbọchị ụfọdụ, na ọnwa ụfọdụ, na oge ụfọdụ, na afọ ụfọdụ. 11 Egwu na-atụ m na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti unu abụrụla ihe efu. 12 Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, meenụ onwe unu dị ka mụ onwe m, nʼihi na mụ onwe m emela onwe m ka m dị ka unu. O nweghị ihe ọjọọ ọbụla unu mere m. 13 Unu maara na ọ bụ nʼime adịghị ike nke anụ ahụ ka m ji kwusaara unu oziọma a. 14 Ọ bụ ezie, ọnọdụ m nʼoge ahụ bụ ọnwụnwa nʼebe unu nọ, unu eledaghị m anya, maọbụ jụ ige m ntị. Kama unu nabatara m, dị ka mmụọ ozi Chineke, maọbụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nʼonwe ya. 15 Ebee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere nọ? Nʼihi na m na-agba ama, na-asị na ọ bụrụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu nye m. 16 Ugbu a, aghọọla m onye iro unu, nʼihi na m na-agwa unu eziokwu? 17 Ha na-ezipụta mmasị nʼebe unu nọ, ma ọ bụghị maka ọdịmma unu. Ha chọrọ ikewapụ unu nʼebe m nọ, ka unu nwee mmasị nʼebe ha nọ. 18 Maka ebumnuche dị mma, ọ dị mma inwe mmasị mgbe niile. Ọ bụghị naanị mgbe mụ na unu nọ. 19 Ụmụntakịrị m, ndị m kwe maka ha nọdụ nʼọnọdụ ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ọzọ, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka ụdịdị Kraịst dị nʼime unu. 20 Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nọ nʼetiti unu ugbu a, nwee ike ịmata otu m ga-esi gbanwee olu okwu m, nʼihi na-amaghị m ihe m kwesiri ime nʼihi ọnọdụ unu. 21 Gwanụ m, unu ndị na-eche na ọ dị mkpa idebe iwu, unu agaghị aṅaa ntị na ihe iwu ahụ kwuru? 22 Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ na Ebraham nwere ụmụ nwoke abụọ. Otu nʼime ha bụ nwa nke ohu ya nwanyị mụrụ, nke ọzọ bụ nke nwunye ya na-abụghị ohu mụtara. 23 Nwa ahụ nke ohu nwanyị ahụ mụrụ bụ onye amụrụ site na anụ ahụ. Ma nwa ahụ nwunye ya na-abụghị ohu mụtara bụ onye a mụrụ site na nkwa. 24 Anyị ga-ewere ihe ndị a dị ka ihe ịmaatụ, nʼihi na ụmụ nwanyị abụọ ndị a nọchiri anya ọgbụgba ndụ abụọ. Otu ọgbụgba ndụ sitere nʼUgwu Saịnaị ma mụọkwa ụmụ ndị bụ ohu: nke a bụ Hega. 25 Hega bụ Ugwu Saịnaị nke dị nʼArebịa. Ọ dabara nʼọnọdụ Jerusalem nke ugbu a, nʼihi na ya na ụmụ ya nọ nʼohu. 26 Ma nwanyị nke ọzọ nọ ọnọdụ Jerusalem nke dị nʼelu, nke nwe onwe ya. Ọ bụkwa ya bụ nne anyị. 27 Nʼihi na e dere ya,“Ṅụrịa ọṅụ, gị nwanyị aga,onye na-amụtaghị nwa.Tie mkpu ọṅụ, tisiekwa mkpu akwa ikegị onye ime nwa na-emetụbeghị,nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụkarịa ụmụ nke nwanyị nwere dị.” 28 Ugbu a, ụmụnna m, unu bụ ụmụ ahụ nke e kwere na nkwa, dị ka Aịzik. 29 Nʼoge ahụ, nwa ahụ a mụrụ nʼụzọ anụ ahụ kpagburu nwa ahụ a mụrụ site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Otu a ka ọ dịkwa nʼoge a. 30 Ma gịnị ka akwụkwọ nsọ kwuru? “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya, nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị a apụghị isoro nwa nke nwanyị na-abụghị ohu kerikọta oke.” 31 Ya mere, ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nke nwanyị ohu, kama anyị bụ ụmụ nke nwanyị nwere onwe ya.

In Other Versions

Galatians 4 in the ANGEFD

Galatians 4 in the ANTPNG2D

Galatians 4 in the AS21

Galatians 4 in the BAGH

Galatians 4 in the BBPNG

Galatians 4 in the BBT1E

Galatians 4 in the BDS

Galatians 4 in the BEV

Galatians 4 in the BHAD

Galatians 4 in the BIB

Galatians 4 in the BLPT

Galatians 4 in the BNT

Galatians 4 in the BNTABOOT

Galatians 4 in the BNTLV

Galatians 4 in the BOATCB

Galatians 4 in the BOATCB2

Galatians 4 in the BOBCV

Galatians 4 in the BOCNT

Galatians 4 in the BOECS

Galatians 4 in the BOGWICC

Galatians 4 in the BOHCB

Galatians 4 in the BOHCV

Galatians 4 in the BOHLNT

Galatians 4 in the BOHNTLTAL

Galatians 4 in the BOILNTAP

Galatians 4 in the BOITCV

Galatians 4 in the BOKCV

Galatians 4 in the BOKCV2

Galatians 4 in the BOKHWOG

Galatians 4 in the BOKSSV

Galatians 4 in the BOLCB

Galatians 4 in the BOLCB2

Galatians 4 in the BOMCV

Galatians 4 in the BONAV

Galatians 4 in the BONCB

Galatians 4 in the BONLT

Galatians 4 in the BONUT2

Galatians 4 in the BOPLNT

Galatians 4 in the BOSCB

Galatians 4 in the BOSNC

Galatians 4 in the BOTLNT

Galatians 4 in the BOVCB

Galatians 4 in the BOYCB

Galatians 4 in the BPBB

Galatians 4 in the BPH

Galatians 4 in the BSB

Galatians 4 in the CCB

Galatians 4 in the CUV

Galatians 4 in the CUVS

Galatians 4 in the DBT

Galatians 4 in the DGDNT

Galatians 4 in the DHNT

Galatians 4 in the DNT

Galatians 4 in the ELBE

Galatians 4 in the EMTV

Galatians 4 in the ESV

Galatians 4 in the FBV

Galatians 4 in the FEB

Galatians 4 in the GGMNT

Galatians 4 in the GNT

Galatians 4 in the HARY

Galatians 4 in the HNT

Galatians 4 in the IRVA

Galatians 4 in the IRVB

Galatians 4 in the IRVG

Galatians 4 in the IRVH

Galatians 4 in the IRVK

Galatians 4 in the IRVM

Galatians 4 in the IRVM2

Galatians 4 in the IRVO

Galatians 4 in the IRVP

Galatians 4 in the IRVT

Galatians 4 in the IRVT2

Galatians 4 in the IRVU

Galatians 4 in the ISVN

Galatians 4 in the JSNT

Galatians 4 in the KAPI

Galatians 4 in the KBT1ETNIK

Galatians 4 in the KBV

Galatians 4 in the KJV

Galatians 4 in the KNFD

Galatians 4 in the LBA

Galatians 4 in the LBLA

Galatians 4 in the LNT

Galatians 4 in the LSV

Galatians 4 in the MAAL

Galatians 4 in the MBV

Galatians 4 in the MBV2

Galatians 4 in the MHNT

Galatians 4 in the MKNFD

Galatians 4 in the MNG

Galatians 4 in the MNT

Galatians 4 in the MNT2

Galatians 4 in the MRS1T

Galatians 4 in the NAA

Galatians 4 in the NASB

Galatians 4 in the NBLA

Galatians 4 in the NBS

Galatians 4 in the NBVTP

Galatians 4 in the NET2

Galatians 4 in the NIV11

Galatians 4 in the NNT

Galatians 4 in the NNT2

Galatians 4 in the NNT3

Galatians 4 in the PDDPT

Galatians 4 in the PFNT

Galatians 4 in the RMNT

Galatians 4 in the SBIAS

Galatians 4 in the SBIBS

Galatians 4 in the SBIBS2

Galatians 4 in the SBICS

Galatians 4 in the SBIDS

Galatians 4 in the SBIGS

Galatians 4 in the SBIHS

Galatians 4 in the SBIIS

Galatians 4 in the SBIIS2

Galatians 4 in the SBIIS3

Galatians 4 in the SBIKS

Galatians 4 in the SBIKS2

Galatians 4 in the SBIMS

Galatians 4 in the SBIOS

Galatians 4 in the SBIPS

Galatians 4 in the SBISS

Galatians 4 in the SBITS

Galatians 4 in the SBITS2

Galatians 4 in the SBITS3

Galatians 4 in the SBITS4

Galatians 4 in the SBIUS

Galatians 4 in the SBIVS

Galatians 4 in the SBT

Galatians 4 in the SBT1E

Galatians 4 in the SCHL

Galatians 4 in the SNT

Galatians 4 in the SUSU

Galatians 4 in the SUSU2

Galatians 4 in the SYNO

Galatians 4 in the TBIAOTANT

Galatians 4 in the TBT1E

Galatians 4 in the TBT1E2

Galatians 4 in the TFTIP

Galatians 4 in the TFTU

Galatians 4 in the TGNTATF3T

Galatians 4 in the THAI

Galatians 4 in the TNFD

Galatians 4 in the TNT

Galatians 4 in the TNTIK

Galatians 4 in the TNTIL

Galatians 4 in the TNTIN

Galatians 4 in the TNTIP

Galatians 4 in the TNTIZ

Galatians 4 in the TOMA

Galatians 4 in the TTENT

Galatians 4 in the UBG

Galatians 4 in the UGV

Galatians 4 in the UGV2

Galatians 4 in the UGV3

Galatians 4 in the VBL

Galatians 4 in the VDCC

Galatians 4 in the YALU

Galatians 4 in the YAPE

Galatians 4 in the YBVTP

Galatians 4 in the ZBP