Genesis 1 (BOICB)

1 Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. 2 Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. 3 Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. 4 Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 5 Chineke kpọrọ ìhè ahụ Ehihie, kpọọ ọchịchịrị ahụ Abalị. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke mbụ. 6 Chineke kwukwara sị, “Ka mbara pụta nke ga-ekewapụ mmiri dị nʼelu mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼokpuru mbara ahụ” 7 Ya mere, Chineke mere mbara, kewapụ mmiri dị nʼokpuru mbara ahụ site na mmiri nke dị nʼelu mbara ahụ. O sikwa otu a dịrị. 8 Mbara ahụ ka Chineke kpọrọ mbara eluigwe. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke abụọ. 9 Chineke kwuru sị, “Ka mmiri dị nʼokpuru mbara eluigwe chịkọta onwe ha ọnụ nʼotu ebe, ka ala akọrọ pụta.” O sikwa otu a dịrị. 10 Chineke kpọrọ ala akọrọ ahụ “ala,” kpọọ mmiri ahụ chịkọtara onwe ha ọnụ “osimiri.” Chineke lere anya hụ na ha dị mma. 11 Chineke kwuru sị, “Ka ala pupụta ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ, na osisi dị nʼelu ala nke na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha dị iche iche si dị.” O sikwa otu a dịrị. 12 Ala puputara ahịhịa ndụ dị iche iche: ahịhịa na-amịpụta mkpụrụ dịka ụdịdị ha si dị, na osisi na-amịpụta mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ya, dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 13 Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke atọ. 14 Chineke kwuru sị, “Ka ìhè nke na-enye ìhè dịrị na mbara eluigwe, ikewapụ ehihie site nʼabalị. Ka ha bụrụ ihe ama igosi oge dị iche iche, ụbọchị dị iche iche, na afọ dị iche iche. 15 Ka ha bụrụ ìhè na mbara eluigwe inye ìhè nʼelu ụwa.” O si otu a dịrị. 16 Chineke mere ìhè ukwu abụọ, nke kacha ịdị ukwu ka ọ bụrụ nke ga-achị ehihie, ma nke dị nta ka ọ bụrụ nke ga-achị abalị. O mekwara kpakpando dị iche iche. 17 Chineke debere ha na mbara eluigwe inye ìhè nʼụwa, 18 ịchị ehihie na abalị na ịkpa oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 19 Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke anọ. 20 Chineke kwuru sị, “Ka mmiri jupụta nʼihe ndị na-eku ume, ka ụmụ anụ ufe fegharịkwa nʼelu ụwa, ma nʼelu mbara igwe.” 21 Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 22 Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.” 23 Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise. 24 Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị. 25 Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 26 Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.” 27 Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya,nʼoyiyi Chineke ka o kere ha,nwoke na nwanyị ka o kere ha. 28 Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.” 29 Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị. 30 Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.” 31 Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii.

In Other Versions

Genesis 1 in the ANGEFD

Genesis 1 in the ANTPNG2D

Genesis 1 in the AS21

Genesis 1 in the BAGH

Genesis 1 in the BBPNG

Genesis 1 in the BBT1E

Genesis 1 in the BDS

Genesis 1 in the BEV

Genesis 1 in the BHAD

Genesis 1 in the BIB

Genesis 1 in the BLPT

Genesis 1 in the BNT

Genesis 1 in the BNTABOOT

Genesis 1 in the BNTLV

Genesis 1 in the BOATCB

Genesis 1 in the BOATCB2

Genesis 1 in the BOBCV

Genesis 1 in the BOCNT

Genesis 1 in the BOECS

Genesis 1 in the BOGWICC

Genesis 1 in the BOHCB

Genesis 1 in the BOHCV

Genesis 1 in the BOHLNT

Genesis 1 in the BOHNTLTAL

Genesis 1 in the BOILNTAP

Genesis 1 in the BOITCV

Genesis 1 in the BOKCV

Genesis 1 in the BOKCV2

Genesis 1 in the BOKHWOG

Genesis 1 in the BOKSSV

Genesis 1 in the BOLCB

Genesis 1 in the BOLCB2

Genesis 1 in the BOMCV

Genesis 1 in the BONAV

Genesis 1 in the BONCB

Genesis 1 in the BONLT

Genesis 1 in the BONUT2

Genesis 1 in the BOPLNT

Genesis 1 in the BOSCB

Genesis 1 in the BOSNC

Genesis 1 in the BOTLNT

Genesis 1 in the BOVCB

Genesis 1 in the BOYCB

Genesis 1 in the BPBB

Genesis 1 in the BPH

Genesis 1 in the BSB

Genesis 1 in the CCB

Genesis 1 in the CUV

Genesis 1 in the CUVS

Genesis 1 in the DBT

Genesis 1 in the DGDNT

Genesis 1 in the DHNT

Genesis 1 in the DNT

Genesis 1 in the ELBE

Genesis 1 in the EMTV

Genesis 1 in the ESV

Genesis 1 in the FBV

Genesis 1 in the FEB

Genesis 1 in the GGMNT

Genesis 1 in the GNT

Genesis 1 in the HARY

Genesis 1 in the HNT

Genesis 1 in the IRVA

Genesis 1 in the IRVB

Genesis 1 in the IRVG

Genesis 1 in the IRVH

Genesis 1 in the IRVK

Genesis 1 in the IRVM

Genesis 1 in the IRVM2

Genesis 1 in the IRVO

Genesis 1 in the IRVP

Genesis 1 in the IRVT

Genesis 1 in the IRVT2

Genesis 1 in the IRVU

Genesis 1 in the ISVN

Genesis 1 in the JSNT

Genesis 1 in the KAPI

Genesis 1 in the KBT1ETNIK

Genesis 1 in the KBV

Genesis 1 in the KJV

Genesis 1 in the KNFD

Genesis 1 in the LBA

Genesis 1 in the LBLA

Genesis 1 in the LNT

Genesis 1 in the LSV

Genesis 1 in the MAAL

Genesis 1 in the MBV

Genesis 1 in the MBV2

Genesis 1 in the MHNT

Genesis 1 in the MKNFD

Genesis 1 in the MNG

Genesis 1 in the MNT

Genesis 1 in the MNT2

Genesis 1 in the MRS1T

Genesis 1 in the NAA

Genesis 1 in the NASB

Genesis 1 in the NBLA

Genesis 1 in the NBS

Genesis 1 in the NBVTP

Genesis 1 in the NET2

Genesis 1 in the NIV11

Genesis 1 in the NNT

Genesis 1 in the NNT2

Genesis 1 in the NNT3

Genesis 1 in the PDDPT

Genesis 1 in the PFNT

Genesis 1 in the RMNT

Genesis 1 in the SBIAS

Genesis 1 in the SBIBS

Genesis 1 in the SBIBS2

Genesis 1 in the SBICS

Genesis 1 in the SBIDS

Genesis 1 in the SBIGS

Genesis 1 in the SBIHS

Genesis 1 in the SBIIS

Genesis 1 in the SBIIS2

Genesis 1 in the SBIIS3

Genesis 1 in the SBIKS

Genesis 1 in the SBIKS2

Genesis 1 in the SBIMS

Genesis 1 in the SBIOS

Genesis 1 in the SBIPS

Genesis 1 in the SBISS

Genesis 1 in the SBITS

Genesis 1 in the SBITS2

Genesis 1 in the SBITS3

Genesis 1 in the SBITS4

Genesis 1 in the SBIUS

Genesis 1 in the SBIVS

Genesis 1 in the SBT

Genesis 1 in the SBT1E

Genesis 1 in the SCHL

Genesis 1 in the SNT

Genesis 1 in the SUSU

Genesis 1 in the SUSU2

Genesis 1 in the SYNO

Genesis 1 in the TBIAOTANT

Genesis 1 in the TBT1E

Genesis 1 in the TBT1E2

Genesis 1 in the TFTIP

Genesis 1 in the TFTU

Genesis 1 in the TGNTATF3T

Genesis 1 in the THAI

Genesis 1 in the TNFD

Genesis 1 in the TNT

Genesis 1 in the TNTIK

Genesis 1 in the TNTIL

Genesis 1 in the TNTIN

Genesis 1 in the TNTIP

Genesis 1 in the TNTIZ

Genesis 1 in the TOMA

Genesis 1 in the TTENT

Genesis 1 in the UBG

Genesis 1 in the UGV

Genesis 1 in the UGV2

Genesis 1 in the UGV3

Genesis 1 in the VBL

Genesis 1 in the VDCC

Genesis 1 in the YALU

Genesis 1 in the YAPE

Genesis 1 in the YBVTP

Genesis 1 in the ZBP