Genesis 18 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie. 2 O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala. 3 Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị. 4 Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a. 5 Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.”Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.” 6 Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.” 7 Mgbe ahụ, Ebraham gbagara nʼigwe ehi ya, họpụta otu nwa ehi na-akaghị aka nke ahụ ya dị mma, nye ya otu ohu ya onye mere ngwangwa gbuo ya, dozie ya maka oriri. 8 Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri. 9 Ha jụrụ ya sị, “Ebee ka Sera nwunye gị nọ?”Ọ zara sị, “Ọ nọ nʼime ụlọ ikwu.” 10 Ọ sịrị ya, “Nʼezie, mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a nʼafọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.”Sera guzo nʼime ụlọ ikwu ahụ nke dị nʼazụ Ebraham na-ege ntị nʼihe ha na-ekwu. 11 Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa. 12 Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?” 13 ONYENWE ANYỊ jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’ 14 Ọ dị ihe nyịrị ONYENWE ANYỊ ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” 15 Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.”Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.” 16 Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm, Ebraham dupụkwara ha. 17 Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ONYENWE ANYỊ tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime? 18 Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya. 19 Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ ONYENWE ANYỊ site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka ONYENWE ANYỊ mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.” 20 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke. 21 Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.” 22 Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ. 23 Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume? 24 Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya? 25 Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?” 26 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.” 27 Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ. 28 Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” ONYENWE ANYỊ zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.” 29 Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” ONYENWE ANYỊ zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.” 30 Mgbe ahụ ọ sịrị, “Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?” ONYENWE ANYỊ zaghachiri sị ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya.” 31 O kwuru sị, “Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?” ONYENWE ANYỊ zara sị, “Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya.” 32 Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, “Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?” ONYENWE ANYỊ zara sị, “Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya.” 33 Mgbe ONYENWE ANYỊ gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.

In Other Versions

Genesis 18 in the ANGEFD

Genesis 18 in the ANTPNG2D

Genesis 18 in the AS21

Genesis 18 in the BAGH

Genesis 18 in the BBPNG

Genesis 18 in the BBT1E

Genesis 18 in the BDS

Genesis 18 in the BEV

Genesis 18 in the BHAD

Genesis 18 in the BIB

Genesis 18 in the BLPT

Genesis 18 in the BNT

Genesis 18 in the BNTABOOT

Genesis 18 in the BNTLV

Genesis 18 in the BOATCB

Genesis 18 in the BOATCB2

Genesis 18 in the BOBCV

Genesis 18 in the BOCNT

Genesis 18 in the BOECS

Genesis 18 in the BOGWICC

Genesis 18 in the BOHCB

Genesis 18 in the BOHCV

Genesis 18 in the BOHLNT

Genesis 18 in the BOHNTLTAL

Genesis 18 in the BOILNTAP

Genesis 18 in the BOITCV

Genesis 18 in the BOKCV

Genesis 18 in the BOKCV2

Genesis 18 in the BOKHWOG

Genesis 18 in the BOKSSV

Genesis 18 in the BOLCB

Genesis 18 in the BOLCB2

Genesis 18 in the BOMCV

Genesis 18 in the BONAV

Genesis 18 in the BONCB

Genesis 18 in the BONLT

Genesis 18 in the BONUT2

Genesis 18 in the BOPLNT

Genesis 18 in the BOSCB

Genesis 18 in the BOSNC

Genesis 18 in the BOTLNT

Genesis 18 in the BOVCB

Genesis 18 in the BOYCB

Genesis 18 in the BPBB

Genesis 18 in the BPH

Genesis 18 in the BSB

Genesis 18 in the CCB

Genesis 18 in the CUV

Genesis 18 in the CUVS

Genesis 18 in the DBT

Genesis 18 in the DGDNT

Genesis 18 in the DHNT

Genesis 18 in the DNT

Genesis 18 in the ELBE

Genesis 18 in the EMTV

Genesis 18 in the ESV

Genesis 18 in the FBV

Genesis 18 in the FEB

Genesis 18 in the GGMNT

Genesis 18 in the GNT

Genesis 18 in the HARY

Genesis 18 in the HNT

Genesis 18 in the IRVA

Genesis 18 in the IRVB

Genesis 18 in the IRVG

Genesis 18 in the IRVH

Genesis 18 in the IRVK

Genesis 18 in the IRVM

Genesis 18 in the IRVM2

Genesis 18 in the IRVO

Genesis 18 in the IRVP

Genesis 18 in the IRVT

Genesis 18 in the IRVT2

Genesis 18 in the IRVU

Genesis 18 in the ISVN

Genesis 18 in the JSNT

Genesis 18 in the KAPI

Genesis 18 in the KBT1ETNIK

Genesis 18 in the KBV

Genesis 18 in the KJV

Genesis 18 in the KNFD

Genesis 18 in the LBA

Genesis 18 in the LBLA

Genesis 18 in the LNT

Genesis 18 in the LSV

Genesis 18 in the MAAL

Genesis 18 in the MBV

Genesis 18 in the MBV2

Genesis 18 in the MHNT

Genesis 18 in the MKNFD

Genesis 18 in the MNG

Genesis 18 in the MNT

Genesis 18 in the MNT2

Genesis 18 in the MRS1T

Genesis 18 in the NAA

Genesis 18 in the NASB

Genesis 18 in the NBLA

Genesis 18 in the NBS

Genesis 18 in the NBVTP

Genesis 18 in the NET2

Genesis 18 in the NIV11

Genesis 18 in the NNT

Genesis 18 in the NNT2

Genesis 18 in the NNT3

Genesis 18 in the PDDPT

Genesis 18 in the PFNT

Genesis 18 in the RMNT

Genesis 18 in the SBIAS

Genesis 18 in the SBIBS

Genesis 18 in the SBIBS2

Genesis 18 in the SBICS

Genesis 18 in the SBIDS

Genesis 18 in the SBIGS

Genesis 18 in the SBIHS

Genesis 18 in the SBIIS

Genesis 18 in the SBIIS2

Genesis 18 in the SBIIS3

Genesis 18 in the SBIKS

Genesis 18 in the SBIKS2

Genesis 18 in the SBIMS

Genesis 18 in the SBIOS

Genesis 18 in the SBIPS

Genesis 18 in the SBISS

Genesis 18 in the SBITS

Genesis 18 in the SBITS2

Genesis 18 in the SBITS3

Genesis 18 in the SBITS4

Genesis 18 in the SBIUS

Genesis 18 in the SBIVS

Genesis 18 in the SBT

Genesis 18 in the SBT1E

Genesis 18 in the SCHL

Genesis 18 in the SNT

Genesis 18 in the SUSU

Genesis 18 in the SUSU2

Genesis 18 in the SYNO

Genesis 18 in the TBIAOTANT

Genesis 18 in the TBT1E

Genesis 18 in the TBT1E2

Genesis 18 in the TFTIP

Genesis 18 in the TFTU

Genesis 18 in the TGNTATF3T

Genesis 18 in the THAI

Genesis 18 in the TNFD

Genesis 18 in the TNT

Genesis 18 in the TNTIK

Genesis 18 in the TNTIL

Genesis 18 in the TNTIN

Genesis 18 in the TNTIP

Genesis 18 in the TNTIZ

Genesis 18 in the TOMA

Genesis 18 in the TTENT

Genesis 18 in the UBG

Genesis 18 in the UGV

Genesis 18 in the UGV2

Genesis 18 in the UGV3

Genesis 18 in the VBL

Genesis 18 in the VDCC

Genesis 18 in the YALU

Genesis 18 in the YAPE

Genesis 18 in the YBVTP

Genesis 18 in the ZBP