Genesis 21 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. ONYENWE ANYỊ meere Sera ihe o kwere na nkwa. 2 Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa. 3 Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik. 4 Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu. 5 Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke. 6 Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.” 7 O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.” 8 Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri. 9 Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo, 10 ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.” 11 Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi. 12 Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha. 13 Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.” 14 Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba. 15 Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa. 16 Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa. 17 Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina. 18 Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.” 19 Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ. 20 Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma. 21 Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt. 22 Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme. 23 Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.” 24 Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.” 25 Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi. 26 Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.” 27 Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta. 28 Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche, 29 Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?” 30 Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.” 31 Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi. 32 Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia. 33 Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha ONYENWE ANYỊ, Chineke ebighị ebi. 34 Ebraham bigidere nʼala ndị Filistia ogologo oge.

In Other Versions

Genesis 21 in the ANGEFD

Genesis 21 in the ANTPNG2D

Genesis 21 in the AS21

Genesis 21 in the BAGH

Genesis 21 in the BBPNG

Genesis 21 in the BBT1E

Genesis 21 in the BDS

Genesis 21 in the BEV

Genesis 21 in the BHAD

Genesis 21 in the BIB

Genesis 21 in the BLPT

Genesis 21 in the BNT

Genesis 21 in the BNTABOOT

Genesis 21 in the BNTLV

Genesis 21 in the BOATCB

Genesis 21 in the BOATCB2

Genesis 21 in the BOBCV

Genesis 21 in the BOCNT

Genesis 21 in the BOECS

Genesis 21 in the BOGWICC

Genesis 21 in the BOHCB

Genesis 21 in the BOHCV

Genesis 21 in the BOHLNT

Genesis 21 in the BOHNTLTAL

Genesis 21 in the BOILNTAP

Genesis 21 in the BOITCV

Genesis 21 in the BOKCV

Genesis 21 in the BOKCV2

Genesis 21 in the BOKHWOG

Genesis 21 in the BOKSSV

Genesis 21 in the BOLCB

Genesis 21 in the BOLCB2

Genesis 21 in the BOMCV

Genesis 21 in the BONAV

Genesis 21 in the BONCB

Genesis 21 in the BONLT

Genesis 21 in the BONUT2

Genesis 21 in the BOPLNT

Genesis 21 in the BOSCB

Genesis 21 in the BOSNC

Genesis 21 in the BOTLNT

Genesis 21 in the BOVCB

Genesis 21 in the BOYCB

Genesis 21 in the BPBB

Genesis 21 in the BPH

Genesis 21 in the BSB

Genesis 21 in the CCB

Genesis 21 in the CUV

Genesis 21 in the CUVS

Genesis 21 in the DBT

Genesis 21 in the DGDNT

Genesis 21 in the DHNT

Genesis 21 in the DNT

Genesis 21 in the ELBE

Genesis 21 in the EMTV

Genesis 21 in the ESV

Genesis 21 in the FBV

Genesis 21 in the FEB

Genesis 21 in the GGMNT

Genesis 21 in the GNT

Genesis 21 in the HARY

Genesis 21 in the HNT

Genesis 21 in the IRVA

Genesis 21 in the IRVB

Genesis 21 in the IRVG

Genesis 21 in the IRVH

Genesis 21 in the IRVK

Genesis 21 in the IRVM

Genesis 21 in the IRVM2

Genesis 21 in the IRVO

Genesis 21 in the IRVP

Genesis 21 in the IRVT

Genesis 21 in the IRVT2

Genesis 21 in the IRVU

Genesis 21 in the ISVN

Genesis 21 in the JSNT

Genesis 21 in the KAPI

Genesis 21 in the KBT1ETNIK

Genesis 21 in the KBV

Genesis 21 in the KJV

Genesis 21 in the KNFD

Genesis 21 in the LBA

Genesis 21 in the LBLA

Genesis 21 in the LNT

Genesis 21 in the LSV

Genesis 21 in the MAAL

Genesis 21 in the MBV

Genesis 21 in the MBV2

Genesis 21 in the MHNT

Genesis 21 in the MKNFD

Genesis 21 in the MNG

Genesis 21 in the MNT

Genesis 21 in the MNT2

Genesis 21 in the MRS1T

Genesis 21 in the NAA

Genesis 21 in the NASB

Genesis 21 in the NBLA

Genesis 21 in the NBS

Genesis 21 in the NBVTP

Genesis 21 in the NET2

Genesis 21 in the NIV11

Genesis 21 in the NNT

Genesis 21 in the NNT2

Genesis 21 in the NNT3

Genesis 21 in the PDDPT

Genesis 21 in the PFNT

Genesis 21 in the RMNT

Genesis 21 in the SBIAS

Genesis 21 in the SBIBS

Genesis 21 in the SBIBS2

Genesis 21 in the SBICS

Genesis 21 in the SBIDS

Genesis 21 in the SBIGS

Genesis 21 in the SBIHS

Genesis 21 in the SBIIS

Genesis 21 in the SBIIS2

Genesis 21 in the SBIIS3

Genesis 21 in the SBIKS

Genesis 21 in the SBIKS2

Genesis 21 in the SBIMS

Genesis 21 in the SBIOS

Genesis 21 in the SBIPS

Genesis 21 in the SBISS

Genesis 21 in the SBITS

Genesis 21 in the SBITS2

Genesis 21 in the SBITS3

Genesis 21 in the SBITS4

Genesis 21 in the SBIUS

Genesis 21 in the SBIVS

Genesis 21 in the SBT

Genesis 21 in the SBT1E

Genesis 21 in the SCHL

Genesis 21 in the SNT

Genesis 21 in the SUSU

Genesis 21 in the SUSU2

Genesis 21 in the SYNO

Genesis 21 in the TBIAOTANT

Genesis 21 in the TBT1E

Genesis 21 in the TBT1E2

Genesis 21 in the TFTIP

Genesis 21 in the TFTU

Genesis 21 in the TGNTATF3T

Genesis 21 in the THAI

Genesis 21 in the TNFD

Genesis 21 in the TNT

Genesis 21 in the TNTIK

Genesis 21 in the TNTIL

Genesis 21 in the TNTIN

Genesis 21 in the TNTIP

Genesis 21 in the TNTIZ

Genesis 21 in the TOMA

Genesis 21 in the TTENT

Genesis 21 in the UBG

Genesis 21 in the UGV

Genesis 21 in the UGV2

Genesis 21 in the UGV3

Genesis 21 in the VBL

Genesis 21 in the VDCC

Genesis 21 in the YALU

Genesis 21 in the YAPE

Genesis 21 in the YBVTP

Genesis 21 in the ZBP