Genesis 33 (BOICB)

1 Jekọb lepụrụ anya nʼihu, hụ Ịsọ ka ọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ ndị so ya. Nʼihi ya, o kesara ụmụntakịrị ndị ahụ, nʼetiti Lịa, na Rechel na ndị odibo nwanyị ya abụọ. 2 O mere ka ndị odibo nwanyị ya abụọ ahụ na ụmụ ha buru ụzọ, Lịa na ụmụ ya esoro nʼazụ, ebe Rechel na Josef nọ nʼazụ azụ. 3 Ma ya onwe ya buru ụzọ na-aga nʼihu ha niile, na-akpọ isiala nye Ịsọ ugboro asaa, tutu ruo mgbe ọ bịarutere nwanne ya nwoke nso. 4 Ma Ịsọ gbaara ọsọ bịakwute ya, makụọ ya, jikụọ ya aka nʼolu, sutu ya ọnụ. Ha abụọ kwara akwa. 5 Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?”Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.” 6 Mgbe ahụ, ndị odibo nwanyị abụọ na ụmụ ha rutere nso, kpọọ isiala. 7 Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala. 8 Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?”Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.” 9 Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.” 10 Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m. 11 Biko nara onyinye ndị ahụ e wetaara gị, nʼihi na Chineke emelara m amara. Enwekwara m ihe ga-ezuru m.” Jekọb kwagidere ya, ọ naara onyinye ndị ahụ. 12 Mgbe ahụ, Ịsọ sịrị, “Bilienụ ka anyị malite ije ịlaghachi. Aga m esonyere unu.” 13 Ma Jekọb sịrị ya, “Onyenwe m, ị maara na ụmụntakịrị ndị a adịghị ike, aga m ejikwa nwayọọ chịa ụmụ atụrụ ndị a na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha nʼike nʼime otu ụbọchị, ụmụ anụmanụ ndị a niile ga-anwụ. 14 Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.” 15 Ịsọ sịrị, “Ọ bụrụ otu a, ka m hapụrụ gị ụfọdụ ndị a mụ na ha so.”Ma Jekọb sịrị, “Nʼihi gịnị kwanụ? Ka m hụta naanị ihuọma nʼanya onyenwe m.” 16 Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ. 17 Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt. 18 Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ. 19 Ọ zụrụ ala ebe o mara ụlọ ikwu ya nʼaka ụmụ Hamọ, nna Shekem, ọ kwụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha maka ala ahụ. 20 Nʼebe ahụ, o wuru ebe ịchụ aja, kpọọ aha ya El Elohe Izrel.

In Other Versions

Genesis 33 in the ANGEFD

Genesis 33 in the ANTPNG2D

Genesis 33 in the AS21

Genesis 33 in the BAGH

Genesis 33 in the BBPNG

Genesis 33 in the BBT1E

Genesis 33 in the BDS

Genesis 33 in the BEV

Genesis 33 in the BHAD

Genesis 33 in the BIB

Genesis 33 in the BLPT

Genesis 33 in the BNT

Genesis 33 in the BNTABOOT

Genesis 33 in the BNTLV

Genesis 33 in the BOATCB

Genesis 33 in the BOATCB2

Genesis 33 in the BOBCV

Genesis 33 in the BOCNT

Genesis 33 in the BOECS

Genesis 33 in the BOGWICC

Genesis 33 in the BOHCB

Genesis 33 in the BOHCV

Genesis 33 in the BOHLNT

Genesis 33 in the BOHNTLTAL

Genesis 33 in the BOILNTAP

Genesis 33 in the BOITCV

Genesis 33 in the BOKCV

Genesis 33 in the BOKCV2

Genesis 33 in the BOKHWOG

Genesis 33 in the BOKSSV

Genesis 33 in the BOLCB

Genesis 33 in the BOLCB2

Genesis 33 in the BOMCV

Genesis 33 in the BONAV

Genesis 33 in the BONCB

Genesis 33 in the BONLT

Genesis 33 in the BONUT2

Genesis 33 in the BOPLNT

Genesis 33 in the BOSCB

Genesis 33 in the BOSNC

Genesis 33 in the BOTLNT

Genesis 33 in the BOVCB

Genesis 33 in the BOYCB

Genesis 33 in the BPBB

Genesis 33 in the BPH

Genesis 33 in the BSB

Genesis 33 in the CCB

Genesis 33 in the CUV

Genesis 33 in the CUVS

Genesis 33 in the DBT

Genesis 33 in the DGDNT

Genesis 33 in the DHNT

Genesis 33 in the DNT

Genesis 33 in the ELBE

Genesis 33 in the EMTV

Genesis 33 in the ESV

Genesis 33 in the FBV

Genesis 33 in the FEB

Genesis 33 in the GGMNT

Genesis 33 in the GNT

Genesis 33 in the HARY

Genesis 33 in the HNT

Genesis 33 in the IRVA

Genesis 33 in the IRVB

Genesis 33 in the IRVG

Genesis 33 in the IRVH

Genesis 33 in the IRVK

Genesis 33 in the IRVM

Genesis 33 in the IRVM2

Genesis 33 in the IRVO

Genesis 33 in the IRVP

Genesis 33 in the IRVT

Genesis 33 in the IRVT2

Genesis 33 in the IRVU

Genesis 33 in the ISVN

Genesis 33 in the JSNT

Genesis 33 in the KAPI

Genesis 33 in the KBT1ETNIK

Genesis 33 in the KBV

Genesis 33 in the KJV

Genesis 33 in the KNFD

Genesis 33 in the LBA

Genesis 33 in the LBLA

Genesis 33 in the LNT

Genesis 33 in the LSV

Genesis 33 in the MAAL

Genesis 33 in the MBV

Genesis 33 in the MBV2

Genesis 33 in the MHNT

Genesis 33 in the MKNFD

Genesis 33 in the MNG

Genesis 33 in the MNT

Genesis 33 in the MNT2

Genesis 33 in the MRS1T

Genesis 33 in the NAA

Genesis 33 in the NASB

Genesis 33 in the NBLA

Genesis 33 in the NBS

Genesis 33 in the NBVTP

Genesis 33 in the NET2

Genesis 33 in the NIV11

Genesis 33 in the NNT

Genesis 33 in the NNT2

Genesis 33 in the NNT3

Genesis 33 in the PDDPT

Genesis 33 in the PFNT

Genesis 33 in the RMNT

Genesis 33 in the SBIAS

Genesis 33 in the SBIBS

Genesis 33 in the SBIBS2

Genesis 33 in the SBICS

Genesis 33 in the SBIDS

Genesis 33 in the SBIGS

Genesis 33 in the SBIHS

Genesis 33 in the SBIIS

Genesis 33 in the SBIIS2

Genesis 33 in the SBIIS3

Genesis 33 in the SBIKS

Genesis 33 in the SBIKS2

Genesis 33 in the SBIMS

Genesis 33 in the SBIOS

Genesis 33 in the SBIPS

Genesis 33 in the SBISS

Genesis 33 in the SBITS

Genesis 33 in the SBITS2

Genesis 33 in the SBITS3

Genesis 33 in the SBITS4

Genesis 33 in the SBIUS

Genesis 33 in the SBIVS

Genesis 33 in the SBT

Genesis 33 in the SBT1E

Genesis 33 in the SCHL

Genesis 33 in the SNT

Genesis 33 in the SUSU

Genesis 33 in the SUSU2

Genesis 33 in the SYNO

Genesis 33 in the TBIAOTANT

Genesis 33 in the TBT1E

Genesis 33 in the TBT1E2

Genesis 33 in the TFTIP

Genesis 33 in the TFTU

Genesis 33 in the TGNTATF3T

Genesis 33 in the THAI

Genesis 33 in the TNFD

Genesis 33 in the TNT

Genesis 33 in the TNTIK

Genesis 33 in the TNTIL

Genesis 33 in the TNTIN

Genesis 33 in the TNTIP

Genesis 33 in the TNTIZ

Genesis 33 in the TOMA

Genesis 33 in the TTENT

Genesis 33 in the UBG

Genesis 33 in the UGV

Genesis 33 in the UGV2

Genesis 33 in the UGV3

Genesis 33 in the VBL

Genesis 33 in the VDCC

Genesis 33 in the YALU

Genesis 33 in the YAPE

Genesis 33 in the YBVTP

Genesis 33 in the ZBP