Genesis 39 (BOICB)

1 A kpọọrọ Josef gaa nʼala Ijipt. Pọtifa, bụ nwoke Ijipt, otu nʼime ndịisi na-ejere Fero ozi, na onyeisi ndị agha na-eche nche zụụrụ ya site nʼaka ndị Ishmel, bụ ndị duuru ya gaa nʼebe ahụ. 2 ONYENWE ANYỊ nọnyeere Josef, nke mere na ihe gaara ya nke ọma nʼụlọ nna ya ukwu onye Ijipt. 3 Nna ya ukwu hụrụ na ONYENWE ANYỊ nọnyeere Josef, hụkwa na ONYENWE ANYỊ na-eme ka ihe niile o mere gaara ya nke ọma. 4 Josef hụtara amara nʼihu ya, ghọọ onyeozi nke aka ya. Pọtifa mere ya onye na-elekọta ezinaụlọ ya. Nyefee ya ihe niile o nwere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ha. 5 Site nʼoge a, o mere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere, ONYENWE ANYỊ gọziri ezinaụlọ onye Ijipt ahụ nʼihi Josef. Ngọzị ONYENWE ANYỊ dịkwasịrị nʼihe niile Pọtifa nwere, ma ihe o nwere nʼụlọ ma ndị o nwere nʼubi ya. 6 Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri.Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya. 7 Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.” 8 Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya. 9 O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.” 10 Ọ bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya. 11 Otu ụbọchị, Josef batara nʼime ụlọ ịrụ ọrụ ya. O nweghị ndị ọzọ na-eje ozi nọ nʼime ụlọ nʼụbọchị ahụ. 12 Nwunye Pọtifa jidere Josef nʼuwe mwụda ya, rịọọ ya sị ya, “Bịa ka anyị dinaa.” Ma Josef si nʼime ụlọ ahụ gbapụ, hapụ uwe mwụda ya nʼaka nwunye Pọtifa. 13 Mgbe nwanyị a hụrụ na Josef agbapụla, hapụ uwe ya, 14 ọ kpọrọ ndị na-eje ozi nʼezinaụlọ ya sị ha, “Lee, onye Hibru a di m kpọbatara nʼụlọ a chọrọ iji anyị gwurie egwu. Ọ bịakwutere m nʼime ụlọ chọọ ka mụ na ya dinaa. E tiri m mkpu nʼolu ike. 15 Mgbe ọ nụrụ ka m welitere olu m tie mkpu enyemaka m tiri, o sitere nʼime ụlọ a gbapụ, ma hapụrụ m uwe ya.” 16 Nwanyị a debere uwe ahụ nʼakụkụ ya ruo mgbe nna ya ukwu lọtara nʼụlọ. 17 Mgbe ahụ, ọ gwara di ya okwu ndị a sị, “Onye ohu Hibru a ị kpọbataara anyị bakwutere m iji m gwurie egwu. 18 Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.” 19 Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ. 20 Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt.Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ, 21 ONYENWE ANYỊ nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ. 22 Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. 23 Onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ enyeghịkwa onwe ya nsogbu maka ihe ọbụla. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ nọnyeere Josef, mee ka ihe ọbụla ọ na-eme gaa nke ọma.

In Other Versions

Genesis 39 in the ANGEFD

Genesis 39 in the ANTPNG2D

Genesis 39 in the AS21

Genesis 39 in the BAGH

Genesis 39 in the BBPNG

Genesis 39 in the BBT1E

Genesis 39 in the BDS

Genesis 39 in the BEV

Genesis 39 in the BHAD

Genesis 39 in the BIB

Genesis 39 in the BLPT

Genesis 39 in the BNT

Genesis 39 in the BNTABOOT

Genesis 39 in the BNTLV

Genesis 39 in the BOATCB

Genesis 39 in the BOATCB2

Genesis 39 in the BOBCV

Genesis 39 in the BOCNT

Genesis 39 in the BOECS

Genesis 39 in the BOGWICC

Genesis 39 in the BOHCB

Genesis 39 in the BOHCV

Genesis 39 in the BOHLNT

Genesis 39 in the BOHNTLTAL

Genesis 39 in the BOILNTAP

Genesis 39 in the BOITCV

Genesis 39 in the BOKCV

Genesis 39 in the BOKCV2

Genesis 39 in the BOKHWOG

Genesis 39 in the BOKSSV

Genesis 39 in the BOLCB

Genesis 39 in the BOLCB2

Genesis 39 in the BOMCV

Genesis 39 in the BONAV

Genesis 39 in the BONCB

Genesis 39 in the BONLT

Genesis 39 in the BONUT2

Genesis 39 in the BOPLNT

Genesis 39 in the BOSCB

Genesis 39 in the BOSNC

Genesis 39 in the BOTLNT

Genesis 39 in the BOVCB

Genesis 39 in the BOYCB

Genesis 39 in the BPBB

Genesis 39 in the BPH

Genesis 39 in the BSB

Genesis 39 in the CCB

Genesis 39 in the CUV

Genesis 39 in the CUVS

Genesis 39 in the DBT

Genesis 39 in the DGDNT

Genesis 39 in the DHNT

Genesis 39 in the DNT

Genesis 39 in the ELBE

Genesis 39 in the EMTV

Genesis 39 in the ESV

Genesis 39 in the FBV

Genesis 39 in the FEB

Genesis 39 in the GGMNT

Genesis 39 in the GNT

Genesis 39 in the HARY

Genesis 39 in the HNT

Genesis 39 in the IRVA

Genesis 39 in the IRVB

Genesis 39 in the IRVG

Genesis 39 in the IRVH

Genesis 39 in the IRVK

Genesis 39 in the IRVM

Genesis 39 in the IRVM2

Genesis 39 in the IRVO

Genesis 39 in the IRVP

Genesis 39 in the IRVT

Genesis 39 in the IRVT2

Genesis 39 in the IRVU

Genesis 39 in the ISVN

Genesis 39 in the JSNT

Genesis 39 in the KAPI

Genesis 39 in the KBT1ETNIK

Genesis 39 in the KBV

Genesis 39 in the KJV

Genesis 39 in the KNFD

Genesis 39 in the LBA

Genesis 39 in the LBLA

Genesis 39 in the LNT

Genesis 39 in the LSV

Genesis 39 in the MAAL

Genesis 39 in the MBV

Genesis 39 in the MBV2

Genesis 39 in the MHNT

Genesis 39 in the MKNFD

Genesis 39 in the MNG

Genesis 39 in the MNT

Genesis 39 in the MNT2

Genesis 39 in the MRS1T

Genesis 39 in the NAA

Genesis 39 in the NASB

Genesis 39 in the NBLA

Genesis 39 in the NBS

Genesis 39 in the NBVTP

Genesis 39 in the NET2

Genesis 39 in the NIV11

Genesis 39 in the NNT

Genesis 39 in the NNT2

Genesis 39 in the NNT3

Genesis 39 in the PDDPT

Genesis 39 in the PFNT

Genesis 39 in the RMNT

Genesis 39 in the SBIAS

Genesis 39 in the SBIBS

Genesis 39 in the SBIBS2

Genesis 39 in the SBICS

Genesis 39 in the SBIDS

Genesis 39 in the SBIGS

Genesis 39 in the SBIHS

Genesis 39 in the SBIIS

Genesis 39 in the SBIIS2

Genesis 39 in the SBIIS3

Genesis 39 in the SBIKS

Genesis 39 in the SBIKS2

Genesis 39 in the SBIMS

Genesis 39 in the SBIOS

Genesis 39 in the SBIPS

Genesis 39 in the SBISS

Genesis 39 in the SBITS

Genesis 39 in the SBITS2

Genesis 39 in the SBITS3

Genesis 39 in the SBITS4

Genesis 39 in the SBIUS

Genesis 39 in the SBIVS

Genesis 39 in the SBT

Genesis 39 in the SBT1E

Genesis 39 in the SCHL

Genesis 39 in the SNT

Genesis 39 in the SUSU

Genesis 39 in the SUSU2

Genesis 39 in the SYNO

Genesis 39 in the TBIAOTANT

Genesis 39 in the TBT1E

Genesis 39 in the TBT1E2

Genesis 39 in the TFTIP

Genesis 39 in the TFTU

Genesis 39 in the TGNTATF3T

Genesis 39 in the THAI

Genesis 39 in the TNFD

Genesis 39 in the TNT

Genesis 39 in the TNTIK

Genesis 39 in the TNTIL

Genesis 39 in the TNTIN

Genesis 39 in the TNTIP

Genesis 39 in the TNTIZ

Genesis 39 in the TOMA

Genesis 39 in the TTENT

Genesis 39 in the UBG

Genesis 39 in the UGV

Genesis 39 in the UGV2

Genesis 39 in the UGV3

Genesis 39 in the VBL

Genesis 39 in the VDCC

Genesis 39 in the YALU

Genesis 39 in the YAPE

Genesis 39 in the YBVTP

Genesis 39 in the ZBP