Genesis 40 (BOICB)

1 Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt. 2 Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri. 3 O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef. 4 Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha.Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị. 5 Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya. 6 Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ. 7 Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi Fero ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?” 8 Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.”Josef sịrị ha, “Ọ bụghị Chineke nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.” 9 Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ Josef nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m. 10 Osisi vaịnị a nwere alaka atọ. Mgbe m nọ na-ele anya, osisi vaịnị ahụ mara ifuru, mịpụta mkpụrụ nʼụyọkọ nʼụyọkọ, ha chakwaa. 11 Ebe ọ bụ nʼiko Fero dị m nʼaka, a ghọọrọ m mkpụrụ vaịnị ndị a, pịpụta mmiri ha pịnye nʼime iko mmanya Fero, bunye ya ka ọ ṅụọ.” 12 Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ. 13 Nʼime abalị atọ Fero ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa Fero iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya. 14 Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m Fero ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m. 15 Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.” 16 Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi. 17 Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.” 18 Josef zara sị ya, “Lee ihe nrọ gị pụtara. Nkata atọ ahụ bụ abalị atọ. 19 Nʼime abalị atọ ka Fero ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.” 20 Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri. 21 O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara Fero iko ya dịka o si eme na mbụ. 22 Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka Josef si kọwaa nrọ ha. 23 Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị Josef. O chefuru ya.

In Other Versions

Genesis 40 in the ANGEFD

Genesis 40 in the ANTPNG2D

Genesis 40 in the AS21

Genesis 40 in the BAGH

Genesis 40 in the BBPNG

Genesis 40 in the BBT1E

Genesis 40 in the BDS

Genesis 40 in the BEV

Genesis 40 in the BHAD

Genesis 40 in the BIB

Genesis 40 in the BLPT

Genesis 40 in the BNT

Genesis 40 in the BNTABOOT

Genesis 40 in the BNTLV

Genesis 40 in the BOATCB

Genesis 40 in the BOATCB2

Genesis 40 in the BOBCV

Genesis 40 in the BOCNT

Genesis 40 in the BOECS

Genesis 40 in the BOGWICC

Genesis 40 in the BOHCB

Genesis 40 in the BOHCV

Genesis 40 in the BOHLNT

Genesis 40 in the BOHNTLTAL

Genesis 40 in the BOILNTAP

Genesis 40 in the BOITCV

Genesis 40 in the BOKCV

Genesis 40 in the BOKCV2

Genesis 40 in the BOKHWOG

Genesis 40 in the BOKSSV

Genesis 40 in the BOLCB

Genesis 40 in the BOLCB2

Genesis 40 in the BOMCV

Genesis 40 in the BONAV

Genesis 40 in the BONCB

Genesis 40 in the BONLT

Genesis 40 in the BONUT2

Genesis 40 in the BOPLNT

Genesis 40 in the BOSCB

Genesis 40 in the BOSNC

Genesis 40 in the BOTLNT

Genesis 40 in the BOVCB

Genesis 40 in the BOYCB

Genesis 40 in the BPBB

Genesis 40 in the BPH

Genesis 40 in the BSB

Genesis 40 in the CCB

Genesis 40 in the CUV

Genesis 40 in the CUVS

Genesis 40 in the DBT

Genesis 40 in the DGDNT

Genesis 40 in the DHNT

Genesis 40 in the DNT

Genesis 40 in the ELBE

Genesis 40 in the EMTV

Genesis 40 in the ESV

Genesis 40 in the FBV

Genesis 40 in the FEB

Genesis 40 in the GGMNT

Genesis 40 in the GNT

Genesis 40 in the HARY

Genesis 40 in the HNT

Genesis 40 in the IRVA

Genesis 40 in the IRVB

Genesis 40 in the IRVG

Genesis 40 in the IRVH

Genesis 40 in the IRVK

Genesis 40 in the IRVM

Genesis 40 in the IRVM2

Genesis 40 in the IRVO

Genesis 40 in the IRVP

Genesis 40 in the IRVT

Genesis 40 in the IRVT2

Genesis 40 in the IRVU

Genesis 40 in the ISVN

Genesis 40 in the JSNT

Genesis 40 in the KAPI

Genesis 40 in the KBT1ETNIK

Genesis 40 in the KBV

Genesis 40 in the KJV

Genesis 40 in the KNFD

Genesis 40 in the LBA

Genesis 40 in the LBLA

Genesis 40 in the LNT

Genesis 40 in the LSV

Genesis 40 in the MAAL

Genesis 40 in the MBV

Genesis 40 in the MBV2

Genesis 40 in the MHNT

Genesis 40 in the MKNFD

Genesis 40 in the MNG

Genesis 40 in the MNT

Genesis 40 in the MNT2

Genesis 40 in the MRS1T

Genesis 40 in the NAA

Genesis 40 in the NASB

Genesis 40 in the NBLA

Genesis 40 in the NBS

Genesis 40 in the NBVTP

Genesis 40 in the NET2

Genesis 40 in the NIV11

Genesis 40 in the NNT

Genesis 40 in the NNT2

Genesis 40 in the NNT3

Genesis 40 in the PDDPT

Genesis 40 in the PFNT

Genesis 40 in the RMNT

Genesis 40 in the SBIAS

Genesis 40 in the SBIBS

Genesis 40 in the SBIBS2

Genesis 40 in the SBICS

Genesis 40 in the SBIDS

Genesis 40 in the SBIGS

Genesis 40 in the SBIHS

Genesis 40 in the SBIIS

Genesis 40 in the SBIIS2

Genesis 40 in the SBIIS3

Genesis 40 in the SBIKS

Genesis 40 in the SBIKS2

Genesis 40 in the SBIMS

Genesis 40 in the SBIOS

Genesis 40 in the SBIPS

Genesis 40 in the SBISS

Genesis 40 in the SBITS

Genesis 40 in the SBITS2

Genesis 40 in the SBITS3

Genesis 40 in the SBITS4

Genesis 40 in the SBIUS

Genesis 40 in the SBIVS

Genesis 40 in the SBT

Genesis 40 in the SBT1E

Genesis 40 in the SCHL

Genesis 40 in the SNT

Genesis 40 in the SUSU

Genesis 40 in the SUSU2

Genesis 40 in the SYNO

Genesis 40 in the TBIAOTANT

Genesis 40 in the TBT1E

Genesis 40 in the TBT1E2

Genesis 40 in the TFTIP

Genesis 40 in the TFTU

Genesis 40 in the TGNTATF3T

Genesis 40 in the THAI

Genesis 40 in the TNFD

Genesis 40 in the TNT

Genesis 40 in the TNTIK

Genesis 40 in the TNTIL

Genesis 40 in the TNTIN

Genesis 40 in the TNTIP

Genesis 40 in the TNTIZ

Genesis 40 in the TOMA

Genesis 40 in the TTENT

Genesis 40 in the UBG

Genesis 40 in the UGV

Genesis 40 in the UGV2

Genesis 40 in the UGV3

Genesis 40 in the VBL

Genesis 40 in the VDCC

Genesis 40 in the YALU

Genesis 40 in the YAPE

Genesis 40 in the YBVTP

Genesis 40 in the ZBP