Genesis 45 (BOICB)

1 Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ. 2 O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara. 3 Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya. 4 Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt. 5 Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a. 6 Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi. 7 Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu. 8 “Ya mere, ọ bụghị unu zitere m nʼebe a, kama ọ bụ Chineke. Ya onwe ya emeela ka m ghọọrọ Fero nna, na onyeisi ezinaụlọ ya niile, na onye na-achị ala Ijipt niile. 9 Ugbu a, meenụ ngwa lakwuru nna m, sị ya, ‘Ihe ndị a ka Josef nwa gị nwoke kwuru, Chineke emeela m onye na-achị Ijipt niile. Egbula oge ịbịakwute m. 10 Ị ga-ebi nʼala Goshen, ka i nwee ike ịnọ m nso, gị na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na igwe ewu na atụrụ gị, na igwe ehi gị, na ihe niile i nwere. 11 Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’ 12 “Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a. 13 Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.” 14 Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa. 15 Emesịa, o suturu ụmụnne ya niile ọnụ, bekwasịkwa ha akwa. Nʼikpeazụ, ụmụnne ya kpanyeere ya ụka. 16 Mgbe akụkọ a ruru ụlọ Fero na ụmụnne Josef bịara, ọ tọrọ Fero na ndịisi ozi niile ya ụtọ. 17 Fero gwara Josef sị ya, “Gwa ụmụnne gị, ka ha mee ihe otu a, ha bokwasị ịnyịnya ibu unu ibu laghachikwa nʼala Kenan. 18 Ha ruo, ha kpọta nna gị, na ezinaụlọ ha, ka ha lọghachikwute m nʼala Ijipt. Nʼihi na aga m enye ha ala kachasị mma nʼIjipt. Ha onwe ha ga-erikwa uru ala ahụ. 19 “Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu. 20 Unu esogbula onwe unu banyere ngwa ụlọ unu, nʼihi na ihe niile dị mma nʼala Ijipt bụ nke unu.’ ” 21 Ya mere ụmụ Izrel mere ihe ndị a. Josef nyere ha ụgbọala dịka Fero nyere nʼiwu. O nyekwara ha nri ha ga-eri nʼụzọ. 22 O nyere onye ọ bụla nʼime ha uwe mgbanwe ọhụrụ, ma o nyere Benjamin narị shekel ọlaọcha atọ, na uwe mgbanwe ise. 23 O zipụụrụ nna ya ihe ndị a: ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ihe mara mma niile si nʼala Ijipt, na nne ịnyịnya ibu iri ndị e bokwasịrị ọka na achịcha, na ihe ndị ọzọ dị iche iche, nʼihi ije ya. 24 O zipụrụ ụmụnne ya. Ma oge ha na-achọ ịhapụ ya, ọ gwara ha sị, “Unu esekwala okwu nʼụzọ.” 25 Mgbe ahụ, ha hapụrụ ala Ijipt mechaa rute ala Kenan, bịakwute Jekọb nna ha. 26 Ha gwara ya sị, “Josef ka nọ ndụ. Nʼezie, ọ bụ ya na-achị ala Ijipt niile.” Ma o siiri Jekọb ike ịnabata akụkọ a. O kwenyeghị na ọ bụ eziokwu. 27 Ma mgbe ha gwasịrị ya ihe niile Josef gwara ha, mgbe ọ hụkwara ụgbọala niile Josef zitere ka e jiri bute ya, mmụọ nna ha Jekọb lọghachiri. 28 Mgbe ahụ Izrel kwuru sị, “Ekwetala m! Josef nwa m ka dị ndụ. Aga m aga hụ ya anya tupu m nwụọ.”

In Other Versions

Genesis 45 in the ANGEFD

Genesis 45 in the ANTPNG2D

Genesis 45 in the AS21

Genesis 45 in the BAGH

Genesis 45 in the BBPNG

Genesis 45 in the BBT1E

Genesis 45 in the BDS

Genesis 45 in the BEV

Genesis 45 in the BHAD

Genesis 45 in the BIB

Genesis 45 in the BLPT

Genesis 45 in the BNT

Genesis 45 in the BNTABOOT

Genesis 45 in the BNTLV

Genesis 45 in the BOATCB

Genesis 45 in the BOATCB2

Genesis 45 in the BOBCV

Genesis 45 in the BOCNT

Genesis 45 in the BOECS

Genesis 45 in the BOGWICC

Genesis 45 in the BOHCB

Genesis 45 in the BOHCV

Genesis 45 in the BOHLNT

Genesis 45 in the BOHNTLTAL

Genesis 45 in the BOILNTAP

Genesis 45 in the BOITCV

Genesis 45 in the BOKCV

Genesis 45 in the BOKCV2

Genesis 45 in the BOKHWOG

Genesis 45 in the BOKSSV

Genesis 45 in the BOLCB

Genesis 45 in the BOLCB2

Genesis 45 in the BOMCV

Genesis 45 in the BONAV

Genesis 45 in the BONCB

Genesis 45 in the BONLT

Genesis 45 in the BONUT2

Genesis 45 in the BOPLNT

Genesis 45 in the BOSCB

Genesis 45 in the BOSNC

Genesis 45 in the BOTLNT

Genesis 45 in the BOVCB

Genesis 45 in the BOYCB

Genesis 45 in the BPBB

Genesis 45 in the BPH

Genesis 45 in the BSB

Genesis 45 in the CCB

Genesis 45 in the CUV

Genesis 45 in the CUVS

Genesis 45 in the DBT

Genesis 45 in the DGDNT

Genesis 45 in the DHNT

Genesis 45 in the DNT

Genesis 45 in the ELBE

Genesis 45 in the EMTV

Genesis 45 in the ESV

Genesis 45 in the FBV

Genesis 45 in the FEB

Genesis 45 in the GGMNT

Genesis 45 in the GNT

Genesis 45 in the HARY

Genesis 45 in the HNT

Genesis 45 in the IRVA

Genesis 45 in the IRVB

Genesis 45 in the IRVG

Genesis 45 in the IRVH

Genesis 45 in the IRVK

Genesis 45 in the IRVM

Genesis 45 in the IRVM2

Genesis 45 in the IRVO

Genesis 45 in the IRVP

Genesis 45 in the IRVT

Genesis 45 in the IRVT2

Genesis 45 in the IRVU

Genesis 45 in the ISVN

Genesis 45 in the JSNT

Genesis 45 in the KAPI

Genesis 45 in the KBT1ETNIK

Genesis 45 in the KBV

Genesis 45 in the KJV

Genesis 45 in the KNFD

Genesis 45 in the LBA

Genesis 45 in the LBLA

Genesis 45 in the LNT

Genesis 45 in the LSV

Genesis 45 in the MAAL

Genesis 45 in the MBV

Genesis 45 in the MBV2

Genesis 45 in the MHNT

Genesis 45 in the MKNFD

Genesis 45 in the MNG

Genesis 45 in the MNT

Genesis 45 in the MNT2

Genesis 45 in the MRS1T

Genesis 45 in the NAA

Genesis 45 in the NASB

Genesis 45 in the NBLA

Genesis 45 in the NBS

Genesis 45 in the NBVTP

Genesis 45 in the NET2

Genesis 45 in the NIV11

Genesis 45 in the NNT

Genesis 45 in the NNT2

Genesis 45 in the NNT3

Genesis 45 in the PDDPT

Genesis 45 in the PFNT

Genesis 45 in the RMNT

Genesis 45 in the SBIAS

Genesis 45 in the SBIBS

Genesis 45 in the SBIBS2

Genesis 45 in the SBICS

Genesis 45 in the SBIDS

Genesis 45 in the SBIGS

Genesis 45 in the SBIHS

Genesis 45 in the SBIIS

Genesis 45 in the SBIIS2

Genesis 45 in the SBIIS3

Genesis 45 in the SBIKS

Genesis 45 in the SBIKS2

Genesis 45 in the SBIMS

Genesis 45 in the SBIOS

Genesis 45 in the SBIPS

Genesis 45 in the SBISS

Genesis 45 in the SBITS

Genesis 45 in the SBITS2

Genesis 45 in the SBITS3

Genesis 45 in the SBITS4

Genesis 45 in the SBIUS

Genesis 45 in the SBIVS

Genesis 45 in the SBT

Genesis 45 in the SBT1E

Genesis 45 in the SCHL

Genesis 45 in the SNT

Genesis 45 in the SUSU

Genesis 45 in the SUSU2

Genesis 45 in the SYNO

Genesis 45 in the TBIAOTANT

Genesis 45 in the TBT1E

Genesis 45 in the TBT1E2

Genesis 45 in the TFTIP

Genesis 45 in the TFTU

Genesis 45 in the TGNTATF3T

Genesis 45 in the THAI

Genesis 45 in the TNFD

Genesis 45 in the TNT

Genesis 45 in the TNTIK

Genesis 45 in the TNTIL

Genesis 45 in the TNTIN

Genesis 45 in the TNTIP

Genesis 45 in the TNTIZ

Genesis 45 in the TOMA

Genesis 45 in the TTENT

Genesis 45 in the UBG

Genesis 45 in the UGV

Genesis 45 in the UGV2

Genesis 45 in the UGV3

Genesis 45 in the VBL

Genesis 45 in the VDCC

Genesis 45 in the YALU

Genesis 45 in the YAPE

Genesis 45 in the YBVTP

Genesis 45 in the ZBP