Genesis 49 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu. 2 “Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọbnụrụ okwu nna unu Izrel. 3 “Ruben, ọkpara m ka ị bụ,ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m,onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike. 4 Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ,nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị,i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya. 5 “Simiọn na Livayị bụ ụmụnne.Mma agha ha bụ ngwa ihe ike. 6 Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha,nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha,bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche. 7 Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke.Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ JekọbKpasaa ha nʼetiti ndị Izrel. 8 “Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị.Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị.Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị. 9 Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda,i si nʼịchụ nta lọta, nwa m.Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala,dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya? 10 Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya,maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ,tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa,irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya. 11 Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị,nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya.Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya.Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị. 12 Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị.Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi. 13 “Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri.Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri.Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn. 14 “Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibuna-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ. 15 Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma,hụ otu ala ya si maa mma,ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ;were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike. 16 “Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya akadịka otu nʼime ebo Izrel. 17 Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ,dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa,nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ,si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ. 18 “O ONYENWE ANYỊ, ana m ele anya nnapụta gị. 19 “Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị,ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ. 20 “Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba,nke na-adị ndị eze mma. 21 “Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ,nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma. 22 “Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi,nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi,na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị. 23 Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha,ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị. 24 Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba,ike agwụghị ogwe aka ya,nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb,nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel, 25 nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka,nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị,site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu,ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala,ngọzị nke ara na akpanwa. 26 Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa,ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie,karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie,Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef,dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya. 27 “Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ.Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu.Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.” 28 Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya. 29 Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het. 30 Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu. 31 Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa. 32 Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.” 33 Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.

In Other Versions

Genesis 49 in the ANGEFD

Genesis 49 in the ANTPNG2D

Genesis 49 in the AS21

Genesis 49 in the BAGH

Genesis 49 in the BBPNG

Genesis 49 in the BBT1E

Genesis 49 in the BDS

Genesis 49 in the BEV

Genesis 49 in the BHAD

Genesis 49 in the BIB

Genesis 49 in the BLPT

Genesis 49 in the BNT

Genesis 49 in the BNTABOOT

Genesis 49 in the BNTLV

Genesis 49 in the BOATCB

Genesis 49 in the BOATCB2

Genesis 49 in the BOBCV

Genesis 49 in the BOCNT

Genesis 49 in the BOECS

Genesis 49 in the BOGWICC

Genesis 49 in the BOHCB

Genesis 49 in the BOHCV

Genesis 49 in the BOHLNT

Genesis 49 in the BOHNTLTAL

Genesis 49 in the BOILNTAP

Genesis 49 in the BOITCV

Genesis 49 in the BOKCV

Genesis 49 in the BOKCV2

Genesis 49 in the BOKHWOG

Genesis 49 in the BOKSSV

Genesis 49 in the BOLCB

Genesis 49 in the BOLCB2

Genesis 49 in the BOMCV

Genesis 49 in the BONAV

Genesis 49 in the BONCB

Genesis 49 in the BONLT

Genesis 49 in the BONUT2

Genesis 49 in the BOPLNT

Genesis 49 in the BOSCB

Genesis 49 in the BOSNC

Genesis 49 in the BOTLNT

Genesis 49 in the BOVCB

Genesis 49 in the BOYCB

Genesis 49 in the BPBB

Genesis 49 in the BPH

Genesis 49 in the BSB

Genesis 49 in the CCB

Genesis 49 in the CUV

Genesis 49 in the CUVS

Genesis 49 in the DBT

Genesis 49 in the DGDNT

Genesis 49 in the DHNT

Genesis 49 in the DNT

Genesis 49 in the ELBE

Genesis 49 in the EMTV

Genesis 49 in the ESV

Genesis 49 in the FBV

Genesis 49 in the FEB

Genesis 49 in the GGMNT

Genesis 49 in the GNT

Genesis 49 in the HARY

Genesis 49 in the HNT

Genesis 49 in the IRVA

Genesis 49 in the IRVB

Genesis 49 in the IRVG

Genesis 49 in the IRVH

Genesis 49 in the IRVK

Genesis 49 in the IRVM

Genesis 49 in the IRVM2

Genesis 49 in the IRVO

Genesis 49 in the IRVP

Genesis 49 in the IRVT

Genesis 49 in the IRVT2

Genesis 49 in the IRVU

Genesis 49 in the ISVN

Genesis 49 in the JSNT

Genesis 49 in the KAPI

Genesis 49 in the KBT1ETNIK

Genesis 49 in the KBV

Genesis 49 in the KJV

Genesis 49 in the KNFD

Genesis 49 in the LBA

Genesis 49 in the LBLA

Genesis 49 in the LNT

Genesis 49 in the LSV

Genesis 49 in the MAAL

Genesis 49 in the MBV

Genesis 49 in the MBV2

Genesis 49 in the MHNT

Genesis 49 in the MKNFD

Genesis 49 in the MNG

Genesis 49 in the MNT

Genesis 49 in the MNT2

Genesis 49 in the MRS1T

Genesis 49 in the NAA

Genesis 49 in the NASB

Genesis 49 in the NBLA

Genesis 49 in the NBS

Genesis 49 in the NBVTP

Genesis 49 in the NET2

Genesis 49 in the NIV11

Genesis 49 in the NNT

Genesis 49 in the NNT2

Genesis 49 in the NNT3

Genesis 49 in the PDDPT

Genesis 49 in the PFNT

Genesis 49 in the RMNT

Genesis 49 in the SBIAS

Genesis 49 in the SBIBS

Genesis 49 in the SBIBS2

Genesis 49 in the SBICS

Genesis 49 in the SBIDS

Genesis 49 in the SBIGS

Genesis 49 in the SBIHS

Genesis 49 in the SBIIS

Genesis 49 in the SBIIS2

Genesis 49 in the SBIIS3

Genesis 49 in the SBIKS

Genesis 49 in the SBIKS2

Genesis 49 in the SBIMS

Genesis 49 in the SBIOS

Genesis 49 in the SBIPS

Genesis 49 in the SBISS

Genesis 49 in the SBITS

Genesis 49 in the SBITS2

Genesis 49 in the SBITS3

Genesis 49 in the SBITS4

Genesis 49 in the SBIUS

Genesis 49 in the SBIVS

Genesis 49 in the SBT

Genesis 49 in the SBT1E

Genesis 49 in the SCHL

Genesis 49 in the SNT

Genesis 49 in the SUSU

Genesis 49 in the SUSU2

Genesis 49 in the SYNO

Genesis 49 in the TBIAOTANT

Genesis 49 in the TBT1E

Genesis 49 in the TBT1E2

Genesis 49 in the TFTIP

Genesis 49 in the TFTU

Genesis 49 in the TGNTATF3T

Genesis 49 in the THAI

Genesis 49 in the TNFD

Genesis 49 in the TNT

Genesis 49 in the TNTIK

Genesis 49 in the TNTIL

Genesis 49 in the TNTIN

Genesis 49 in the TNTIP

Genesis 49 in the TNTIZ

Genesis 49 in the TOMA

Genesis 49 in the TTENT

Genesis 49 in the UBG

Genesis 49 in the UGV

Genesis 49 in the UGV2

Genesis 49 in the UGV3

Genesis 49 in the VBL

Genesis 49 in the VDCC

Genesis 49 in the YALU

Genesis 49 in the YAPE

Genesis 49 in the YBVTP

Genesis 49 in the ZBP