Haggai 2 (BOICB)

1 nʼụbọchị nke iri abụọ na otu, nʼọnwa nke asaa, okwu ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ onye amụma Hegai bịakwa na-asị: 2 “Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị: 3 ‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a. 4 Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka ONYENWE ANYỊ kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka ONYENWE ANYỊ kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 5 ‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’ 6 “Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ. 7 Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 8 ‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. 9 ‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.” 10 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu ONYENWE ANYỊ bịakwutere onye amụma, bụ Hegai. 11 “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu. 12 Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’ ”Ndị nchụaja zara sị: “Mba!” 13 Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?”Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.” 14 Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “ ‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. 15 “ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke ONYENWE ANYỊ. 16 Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta. 17 Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 18 ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, site nʼụbọchị taa bụ iri ụbọchị anọ nke ọnwa itoolu, chenụ echiche banyere ụbọchị a bụ ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. Chezienụ echiche banyere ya. 19 Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a.“ ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’ ” 20 Okwu ONYENWE ANYỊ bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị, 21 “Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa. 22 Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya. 23 “ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”

In Other Versions

Haggai 2 in the ANGEFD

Haggai 2 in the ANTPNG2D

Haggai 2 in the AS21

Haggai 2 in the BAGH

Haggai 2 in the BBPNG

Haggai 2 in the BBT1E

Haggai 2 in the BDS

Haggai 2 in the BEV

Haggai 2 in the BHAD

Haggai 2 in the BIB

Haggai 2 in the BLPT

Haggai 2 in the BNT

Haggai 2 in the BNTABOOT

Haggai 2 in the BNTLV

Haggai 2 in the BOATCB

Haggai 2 in the BOATCB2

Haggai 2 in the BOBCV

Haggai 2 in the BOCNT

Haggai 2 in the BOECS

Haggai 2 in the BOGWICC

Haggai 2 in the BOHCB

Haggai 2 in the BOHCV

Haggai 2 in the BOHLNT

Haggai 2 in the BOHNTLTAL

Haggai 2 in the BOILNTAP

Haggai 2 in the BOITCV

Haggai 2 in the BOKCV

Haggai 2 in the BOKCV2

Haggai 2 in the BOKHWOG

Haggai 2 in the BOKSSV

Haggai 2 in the BOLCB

Haggai 2 in the BOLCB2

Haggai 2 in the BOMCV

Haggai 2 in the BONAV

Haggai 2 in the BONCB

Haggai 2 in the BONLT

Haggai 2 in the BONUT2

Haggai 2 in the BOPLNT

Haggai 2 in the BOSCB

Haggai 2 in the BOSNC

Haggai 2 in the BOTLNT

Haggai 2 in the BOVCB

Haggai 2 in the BOYCB

Haggai 2 in the BPBB

Haggai 2 in the BPH

Haggai 2 in the BSB

Haggai 2 in the CCB

Haggai 2 in the CUV

Haggai 2 in the CUVS

Haggai 2 in the DBT

Haggai 2 in the DGDNT

Haggai 2 in the DHNT

Haggai 2 in the DNT

Haggai 2 in the ELBE

Haggai 2 in the EMTV

Haggai 2 in the ESV

Haggai 2 in the FBV

Haggai 2 in the FEB

Haggai 2 in the GGMNT

Haggai 2 in the GNT

Haggai 2 in the HARY

Haggai 2 in the HNT

Haggai 2 in the IRVA

Haggai 2 in the IRVB

Haggai 2 in the IRVG

Haggai 2 in the IRVH

Haggai 2 in the IRVK

Haggai 2 in the IRVM

Haggai 2 in the IRVM2

Haggai 2 in the IRVO

Haggai 2 in the IRVP

Haggai 2 in the IRVT

Haggai 2 in the IRVT2

Haggai 2 in the IRVU

Haggai 2 in the ISVN

Haggai 2 in the JSNT

Haggai 2 in the KAPI

Haggai 2 in the KBT1ETNIK

Haggai 2 in the KBV

Haggai 2 in the KJV

Haggai 2 in the KNFD

Haggai 2 in the LBA

Haggai 2 in the LBLA

Haggai 2 in the LNT

Haggai 2 in the LSV

Haggai 2 in the MAAL

Haggai 2 in the MBV

Haggai 2 in the MBV2

Haggai 2 in the MHNT

Haggai 2 in the MKNFD

Haggai 2 in the MNG

Haggai 2 in the MNT

Haggai 2 in the MNT2

Haggai 2 in the MRS1T

Haggai 2 in the NAA

Haggai 2 in the NASB

Haggai 2 in the NBLA

Haggai 2 in the NBS

Haggai 2 in the NBVTP

Haggai 2 in the NET2

Haggai 2 in the NIV11

Haggai 2 in the NNT

Haggai 2 in the NNT2

Haggai 2 in the NNT3

Haggai 2 in the PDDPT

Haggai 2 in the PFNT

Haggai 2 in the RMNT

Haggai 2 in the SBIAS

Haggai 2 in the SBIBS

Haggai 2 in the SBIBS2

Haggai 2 in the SBICS

Haggai 2 in the SBIDS

Haggai 2 in the SBIGS

Haggai 2 in the SBIHS

Haggai 2 in the SBIIS

Haggai 2 in the SBIIS2

Haggai 2 in the SBIIS3

Haggai 2 in the SBIKS

Haggai 2 in the SBIKS2

Haggai 2 in the SBIMS

Haggai 2 in the SBIOS

Haggai 2 in the SBIPS

Haggai 2 in the SBISS

Haggai 2 in the SBITS

Haggai 2 in the SBITS2

Haggai 2 in the SBITS3

Haggai 2 in the SBITS4

Haggai 2 in the SBIUS

Haggai 2 in the SBIVS

Haggai 2 in the SBT

Haggai 2 in the SBT1E

Haggai 2 in the SCHL

Haggai 2 in the SNT

Haggai 2 in the SUSU

Haggai 2 in the SUSU2

Haggai 2 in the SYNO

Haggai 2 in the TBIAOTANT

Haggai 2 in the TBT1E

Haggai 2 in the TBT1E2

Haggai 2 in the TFTIP

Haggai 2 in the TFTU

Haggai 2 in the TGNTATF3T

Haggai 2 in the THAI

Haggai 2 in the TNFD

Haggai 2 in the TNT

Haggai 2 in the TNTIK

Haggai 2 in the TNTIL

Haggai 2 in the TNTIN

Haggai 2 in the TNTIP

Haggai 2 in the TNTIZ

Haggai 2 in the TOMA

Haggai 2 in the TTENT

Haggai 2 in the UBG

Haggai 2 in the UGV

Haggai 2 in the UGV2

Haggai 2 in the UGV3

Haggai 2 in the VBL

Haggai 2 in the VDCC

Haggai 2 in the YALU

Haggai 2 in the YAPE

Haggai 2 in the YBVTP

Haggai 2 in the ZBP