Hosea 13 (BOICB)

1 Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji,nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel.Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara. 2 Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie,ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche,nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma,ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka.Ha onwe ha na-ekwu,“Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ.Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ” 3 Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ,maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa,dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka,dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ. 4 “Ma mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ na Chineke gị,siterịị nʼala Ijipt.Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m.Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m. 5 Elekọtara m unu nʼime ọzara,nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị. 6 Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ.Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga,chefuo m. 7 Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm;maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ. 8 Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya,dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi haaga m eripịa ha dịka ọdụm,anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha. 9 “Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel,onye pụrụ inyere gị aka? 10 Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị?Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ,bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị,‘Nye m eze na ndị ọchịchị’? 11 Esitere m nʼiwe m nye gị eze,sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya. 12 Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe;a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ. 13 Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya;maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche.Mgbe oge ya zuru,ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya. 14 “Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ.Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ.Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị?Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, 15 ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile.Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke ONYENWE ANYỊ zitere,ga-esi nʼọzara fekwasị ya.Isi iyi niile ga-ata,olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa.A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile,na akụ niile o nwere. 16 Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya,nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha.A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile,tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala,jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”

In Other Versions

Hosea 13 in the ANGEFD

Hosea 13 in the ANTPNG2D

Hosea 13 in the AS21

Hosea 13 in the BAGH

Hosea 13 in the BBPNG

Hosea 13 in the BBT1E

Hosea 13 in the BDS

Hosea 13 in the BEV

Hosea 13 in the BHAD

Hosea 13 in the BIB

Hosea 13 in the BLPT

Hosea 13 in the BNT

Hosea 13 in the BNTABOOT

Hosea 13 in the BNTLV

Hosea 13 in the BOATCB

Hosea 13 in the BOATCB2

Hosea 13 in the BOBCV

Hosea 13 in the BOCNT

Hosea 13 in the BOECS

Hosea 13 in the BOGWICC

Hosea 13 in the BOHCB

Hosea 13 in the BOHCV

Hosea 13 in the BOHLNT

Hosea 13 in the BOHNTLTAL

Hosea 13 in the BOILNTAP

Hosea 13 in the BOITCV

Hosea 13 in the BOKCV

Hosea 13 in the BOKCV2

Hosea 13 in the BOKHWOG

Hosea 13 in the BOKSSV

Hosea 13 in the BOLCB

Hosea 13 in the BOLCB2

Hosea 13 in the BOMCV

Hosea 13 in the BONAV

Hosea 13 in the BONCB

Hosea 13 in the BONLT

Hosea 13 in the BONUT2

Hosea 13 in the BOPLNT

Hosea 13 in the BOSCB

Hosea 13 in the BOSNC

Hosea 13 in the BOTLNT

Hosea 13 in the BOVCB

Hosea 13 in the BOYCB

Hosea 13 in the BPBB

Hosea 13 in the BPH

Hosea 13 in the BSB

Hosea 13 in the CCB

Hosea 13 in the CUV

Hosea 13 in the CUVS

Hosea 13 in the DBT

Hosea 13 in the DGDNT

Hosea 13 in the DHNT

Hosea 13 in the DNT

Hosea 13 in the ELBE

Hosea 13 in the EMTV

Hosea 13 in the ESV

Hosea 13 in the FBV

Hosea 13 in the FEB

Hosea 13 in the GGMNT

Hosea 13 in the GNT

Hosea 13 in the HARY

Hosea 13 in the HNT

Hosea 13 in the IRVA

Hosea 13 in the IRVB

Hosea 13 in the IRVG

Hosea 13 in the IRVH

Hosea 13 in the IRVK

Hosea 13 in the IRVM

Hosea 13 in the IRVM2

Hosea 13 in the IRVO

Hosea 13 in the IRVP

Hosea 13 in the IRVT

Hosea 13 in the IRVT2

Hosea 13 in the IRVU

Hosea 13 in the ISVN

Hosea 13 in the JSNT

Hosea 13 in the KAPI

Hosea 13 in the KBT1ETNIK

Hosea 13 in the KBV

Hosea 13 in the KJV

Hosea 13 in the KNFD

Hosea 13 in the LBA

Hosea 13 in the LBLA

Hosea 13 in the LNT

Hosea 13 in the LSV

Hosea 13 in the MAAL

Hosea 13 in the MBV

Hosea 13 in the MBV2

Hosea 13 in the MHNT

Hosea 13 in the MKNFD

Hosea 13 in the MNG

Hosea 13 in the MNT

Hosea 13 in the MNT2

Hosea 13 in the MRS1T

Hosea 13 in the NAA

Hosea 13 in the NASB

Hosea 13 in the NBLA

Hosea 13 in the NBS

Hosea 13 in the NBVTP

Hosea 13 in the NET2

Hosea 13 in the NIV11

Hosea 13 in the NNT

Hosea 13 in the NNT2

Hosea 13 in the NNT3

Hosea 13 in the PDDPT

Hosea 13 in the PFNT

Hosea 13 in the RMNT

Hosea 13 in the SBIAS

Hosea 13 in the SBIBS

Hosea 13 in the SBIBS2

Hosea 13 in the SBICS

Hosea 13 in the SBIDS

Hosea 13 in the SBIGS

Hosea 13 in the SBIHS

Hosea 13 in the SBIIS

Hosea 13 in the SBIIS2

Hosea 13 in the SBIIS3

Hosea 13 in the SBIKS

Hosea 13 in the SBIKS2

Hosea 13 in the SBIMS

Hosea 13 in the SBIOS

Hosea 13 in the SBIPS

Hosea 13 in the SBISS

Hosea 13 in the SBITS

Hosea 13 in the SBITS2

Hosea 13 in the SBITS3

Hosea 13 in the SBITS4

Hosea 13 in the SBIUS

Hosea 13 in the SBIVS

Hosea 13 in the SBT

Hosea 13 in the SBT1E

Hosea 13 in the SCHL

Hosea 13 in the SNT

Hosea 13 in the SUSU

Hosea 13 in the SUSU2

Hosea 13 in the SYNO

Hosea 13 in the TBIAOTANT

Hosea 13 in the TBT1E

Hosea 13 in the TBT1E2

Hosea 13 in the TFTIP

Hosea 13 in the TFTU

Hosea 13 in the TGNTATF3T

Hosea 13 in the THAI

Hosea 13 in the TNFD

Hosea 13 in the TNT

Hosea 13 in the TNTIK

Hosea 13 in the TNTIL

Hosea 13 in the TNTIN

Hosea 13 in the TNTIP

Hosea 13 in the TNTIZ

Hosea 13 in the TOMA

Hosea 13 in the TTENT

Hosea 13 in the UBG

Hosea 13 in the UGV

Hosea 13 in the UGV2

Hosea 13 in the UGV3

Hosea 13 in the VBL

Hosea 13 in the VDCC

Hosea 13 in the YALU

Hosea 13 in the YAPE

Hosea 13 in the YBVTP

Hosea 13 in the ZBP