Isaiah 41 (BOICB)

1 Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu!Ka mba niile gbanwee ike ha.Ka ha pụta kwuo okwu.Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe. 2 “Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa,onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi?O weere mba niile nyefee ya nʼaka,meriekwa ndị eze nʼihu ya.O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu,jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị. 3 Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ. 4 Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya,na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite?Ọ bụ mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ, onye dị siterị na mbido ihe niile,onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.” 5 Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu;ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji.Ha zukọtara bịa nso. 6 Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,“Nwee obi ike.” 7 Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume.Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ,na-agba onye na-akụ osiama ume.Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.”Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda. 8 “Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m,Jekọb, onye m họpụtara,gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m. 9 Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu,gwa unu na ohu m ka unu bụ,nʼihi na ahọpụtala m unu,agakwaghị m ahapụ unu. 10 Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu. 11 “Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere,ihere ga-emekwa ha.Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu,bụrụ ndị lara nʼiyi. 12 Unu ga-ele anya ha, chọọ ha,ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ.Ndị a na-ebuso unu aghaga-abụ naanị ihe efu. 13 Nʼihi na mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị,onye na-ejidesi aka nri gị ikebụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu;aga m enyere gị aka.’ 14 Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb,unu Izrel dị nta, atụla egwu,nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara,Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel. 15 “Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọkanke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze.Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha,meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka. 16 Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo,oke ikuku ga-ekposasị ha.Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYỊ,nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel. 17 “Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa,mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụmgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri,mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ga-aza ha.Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ. 18 Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha.Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile.Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara,meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta. 19 Aga m akụ nʼọzara,osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv.M ga-eji osisi junipa,na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu, 20 ka ndị mmadụ hụ, matakwa,tuleekwa uche ma ghọta,na ọ bụ aka ONYENWE ANYỊ mere nke a,na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya. 21 “Wepụtanụ mkpesa unu,”ka ONYENWE ANYỊ sịrị,“Doo okwu unu nʼusoro,”ka Eze nke Jekọb na-asịkwa. 22 “Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị,ihe gaje ime.Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara,ka anyị nwee ike tulee hamatakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha.Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa, 23 gwa anyị ihe ọdịnihu ji,ka anyị mara na unu bụ chi.Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ,nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu. 24 Ma unu dị nta karịa ihe efu.Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru.Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ. 25 “Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa.Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ.Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ,ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ. 26 O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara,maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’?O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a,o nweghịkwa onye mere ka amata ya,o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla. 27 Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma. 28 Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ.O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ;o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha. 29 Lee, ha niile bụ ụgha!Ọrụ ha niile pụtara ihe efu,arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.

In Other Versions

Isaiah 41 in the ANGEFD

Isaiah 41 in the ANTPNG2D

Isaiah 41 in the AS21

Isaiah 41 in the BAGH

Isaiah 41 in the BBPNG

Isaiah 41 in the BBT1E

Isaiah 41 in the BDS

Isaiah 41 in the BEV

Isaiah 41 in the BHAD

Isaiah 41 in the BIB

Isaiah 41 in the BLPT

Isaiah 41 in the BNT

Isaiah 41 in the BNTABOOT

Isaiah 41 in the BNTLV

Isaiah 41 in the BOATCB

Isaiah 41 in the BOATCB2

Isaiah 41 in the BOBCV

Isaiah 41 in the BOCNT

Isaiah 41 in the BOECS

Isaiah 41 in the BOGWICC

Isaiah 41 in the BOHCB

Isaiah 41 in the BOHCV

Isaiah 41 in the BOHLNT

Isaiah 41 in the BOHNTLTAL

Isaiah 41 in the BOILNTAP

Isaiah 41 in the BOITCV

Isaiah 41 in the BOKCV

Isaiah 41 in the BOKCV2

Isaiah 41 in the BOKHWOG

Isaiah 41 in the BOKSSV

Isaiah 41 in the BOLCB

Isaiah 41 in the BOLCB2

Isaiah 41 in the BOMCV

Isaiah 41 in the BONAV

Isaiah 41 in the BONCB

Isaiah 41 in the BONLT

Isaiah 41 in the BONUT2

Isaiah 41 in the BOPLNT

Isaiah 41 in the BOSCB

Isaiah 41 in the BOSNC

Isaiah 41 in the BOTLNT

Isaiah 41 in the BOVCB

Isaiah 41 in the BOYCB

Isaiah 41 in the BPBB

Isaiah 41 in the BPH

Isaiah 41 in the BSB

Isaiah 41 in the CCB

Isaiah 41 in the CUV

Isaiah 41 in the CUVS

Isaiah 41 in the DBT

Isaiah 41 in the DGDNT

Isaiah 41 in the DHNT

Isaiah 41 in the DNT

Isaiah 41 in the ELBE

Isaiah 41 in the EMTV

Isaiah 41 in the ESV

Isaiah 41 in the FBV

Isaiah 41 in the FEB

Isaiah 41 in the GGMNT

Isaiah 41 in the GNT

Isaiah 41 in the HARY

Isaiah 41 in the HNT

Isaiah 41 in the IRVA

Isaiah 41 in the IRVB

Isaiah 41 in the IRVG

Isaiah 41 in the IRVH

Isaiah 41 in the IRVK

Isaiah 41 in the IRVM

Isaiah 41 in the IRVM2

Isaiah 41 in the IRVO

Isaiah 41 in the IRVP

Isaiah 41 in the IRVT

Isaiah 41 in the IRVT2

Isaiah 41 in the IRVU

Isaiah 41 in the ISVN

Isaiah 41 in the JSNT

Isaiah 41 in the KAPI

Isaiah 41 in the KBT1ETNIK

Isaiah 41 in the KBV

Isaiah 41 in the KJV

Isaiah 41 in the KNFD

Isaiah 41 in the LBA

Isaiah 41 in the LBLA

Isaiah 41 in the LNT

Isaiah 41 in the LSV

Isaiah 41 in the MAAL

Isaiah 41 in the MBV

Isaiah 41 in the MBV2

Isaiah 41 in the MHNT

Isaiah 41 in the MKNFD

Isaiah 41 in the MNG

Isaiah 41 in the MNT

Isaiah 41 in the MNT2

Isaiah 41 in the MRS1T

Isaiah 41 in the NAA

Isaiah 41 in the NASB

Isaiah 41 in the NBLA

Isaiah 41 in the NBS

Isaiah 41 in the NBVTP

Isaiah 41 in the NET2

Isaiah 41 in the NIV11

Isaiah 41 in the NNT

Isaiah 41 in the NNT2

Isaiah 41 in the NNT3

Isaiah 41 in the PDDPT

Isaiah 41 in the PFNT

Isaiah 41 in the RMNT

Isaiah 41 in the SBIAS

Isaiah 41 in the SBIBS

Isaiah 41 in the SBIBS2

Isaiah 41 in the SBICS

Isaiah 41 in the SBIDS

Isaiah 41 in the SBIGS

Isaiah 41 in the SBIHS

Isaiah 41 in the SBIIS

Isaiah 41 in the SBIIS2

Isaiah 41 in the SBIIS3

Isaiah 41 in the SBIKS

Isaiah 41 in the SBIKS2

Isaiah 41 in the SBIMS

Isaiah 41 in the SBIOS

Isaiah 41 in the SBIPS

Isaiah 41 in the SBISS

Isaiah 41 in the SBITS

Isaiah 41 in the SBITS2

Isaiah 41 in the SBITS3

Isaiah 41 in the SBITS4

Isaiah 41 in the SBIUS

Isaiah 41 in the SBIVS

Isaiah 41 in the SBT

Isaiah 41 in the SBT1E

Isaiah 41 in the SCHL

Isaiah 41 in the SNT

Isaiah 41 in the SUSU

Isaiah 41 in the SUSU2

Isaiah 41 in the SYNO

Isaiah 41 in the TBIAOTANT

Isaiah 41 in the TBT1E

Isaiah 41 in the TBT1E2

Isaiah 41 in the TFTIP

Isaiah 41 in the TFTU

Isaiah 41 in the TGNTATF3T

Isaiah 41 in the THAI

Isaiah 41 in the TNFD

Isaiah 41 in the TNT

Isaiah 41 in the TNTIK

Isaiah 41 in the TNTIL

Isaiah 41 in the TNTIN

Isaiah 41 in the TNTIP

Isaiah 41 in the TNTIZ

Isaiah 41 in the TOMA

Isaiah 41 in the TTENT

Isaiah 41 in the UBG

Isaiah 41 in the UGV

Isaiah 41 in the UGV2

Isaiah 41 in the UGV3

Isaiah 41 in the VBL

Isaiah 41 in the VDCC

Isaiah 41 in the YALU

Isaiah 41 in the YAPE

Isaiah 41 in the YBVTP

Isaiah 41 in the ZBP