Isaiah 8 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ siri m, “Were otu mbadamba ihe dị ukwuu, were odee nke onye ọbụla na-eji ede ihe dekwasị ya Maha-shalal-Hash-Baz. 2 Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.” 3 Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz. 4 Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.” 5 ONYENWE ANYỊ gwakwara m okwu ọzọ sị, 6 “Nʼihi na ndị a ajụlammiri Shiloa nke ji nwayọọ na-asọma na-aṅụrị ọṅụ nʼihi Rezinna nwa nwoke Remalaya, 7 ya mere, Onyenwe anyị na-aga iwetaiju mmiri nke osimiri Yufretis megide ha,bụ eze ndị Asịrịa ya na ebube ya niile.Ọ ga-erubiga oke, gafee ụzọ ya niile,ọ ga-erubiga ma tofeekwa ọnụ ya niile, 8 wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile,ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru.Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị,O Ịmanụel.” 9 Tienụ mkpu agha unu mba dị iche iche, ma a ga-etipịa unu.Geenụ ntị unu mba niile dị ebe dị anya.Kwadoonụ maka agha ma a ga-etipịa unu.Kwadoonụ maka agha ka e tipịa unu. 10 Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya.Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzonʼihi na Chineke nọnyere anyị. 11 Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị m nʼike nke aka ya dị nʼahụ, ọ dọrọ m aka na ntị ka m ghara ije ije nʼụzọ ndị nke a, na-asị: 12 “Adịnyerela hanʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị;ka ihe ha na-atụ egwuhapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu. 13 ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ.Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ.Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji. 14 Ọ ga-abụkwa ebe nsọ;nye ụlọ Izrel na Juda, ọ ga-aghọrọ hankume nke na-eme ka ndị mmadụ sọọ ngọngọ,oke nkume nke na-eme ka ha daa.Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalemigbudu na ọnya nke ha ga-adaba nʼime ya. 15 Ọtụtụ nʼime ha ga-asọ ngọngọ;ha ga-ada bụrụ ndị e tipịara.Ha ga-abụ ndị ọnya ga-ama, na ndị a ga-anwude.” 16 Kechie ihe ịgba ama nke iwu akpuchie ntụziaka Chineke nke ọma nʼetiti ndị na-eso ụzọ ya. 17 Aga m echere ONYENWE ANYỊ,onye na-ezonarị ụlọ Jekọb ihu ya ugbu a.Aga m atụkwasị obi m na ya. 18 Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị ONYENWE ANYỊ nyere m. Anyị bụ ihe ịrịbama na ihe iji cheta ihe nye ndị Izrel site na ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-ebi nʼugwu Zayọn. 19 Mgbe onye ọbụla sịrị unu, jụtanụ ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa ihe, bụ ndị na-ekwu okwu nʼolu dị nta nke mmadụ na-adịghị anụ nke ọma na ndị na-atamu atamu, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ Chineke ha ase? Ọ bụ nʼihi gịnị ka eji jụta ndị nwụrụ anwụ ase nʼihi ndị dị ndụ? 20 Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha. 21 Ndị a ga-awagharị nʼala a niile. Agụụ ga-agụ ha, ha ga-adakwa mba. Nʼọnọdụ oke agụụ nke ga-agụ ha, iwe dị ukwuu ga-ewe ha, mee ka ha lelie anya ha nʼelu, kọchaa eze ha, na Chineke ha. 22 Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ha eledata anya ha nʼala ọ bụ naanị oke nsogbu na oke ihe mgbu ka ha ga-ahụ. Ha ga-ahụkwa oke ihe egwu na ọchịchịrị. Ụzọ mgbapụ agaghị adịkwara ha nʼoge nsogbu a. A ga-achụbanye ha nʼime ọchịchịrị.

In Other Versions

Isaiah 8 in the ANGEFD

Isaiah 8 in the ANTPNG2D

Isaiah 8 in the AS21

Isaiah 8 in the BAGH

Isaiah 8 in the BBPNG

Isaiah 8 in the BBT1E

Isaiah 8 in the BDS

Isaiah 8 in the BEV

Isaiah 8 in the BHAD

Isaiah 8 in the BIB

Isaiah 8 in the BLPT

Isaiah 8 in the BNT

Isaiah 8 in the BNTABOOT

Isaiah 8 in the BNTLV

Isaiah 8 in the BOATCB

Isaiah 8 in the BOATCB2

Isaiah 8 in the BOBCV

Isaiah 8 in the BOCNT

Isaiah 8 in the BOECS

Isaiah 8 in the BOGWICC

Isaiah 8 in the BOHCB

Isaiah 8 in the BOHCV

Isaiah 8 in the BOHLNT

Isaiah 8 in the BOHNTLTAL

Isaiah 8 in the BOILNTAP

Isaiah 8 in the BOITCV

Isaiah 8 in the BOKCV

Isaiah 8 in the BOKCV2

Isaiah 8 in the BOKHWOG

Isaiah 8 in the BOKSSV

Isaiah 8 in the BOLCB

Isaiah 8 in the BOLCB2

Isaiah 8 in the BOMCV

Isaiah 8 in the BONAV

Isaiah 8 in the BONCB

Isaiah 8 in the BONLT

Isaiah 8 in the BONUT2

Isaiah 8 in the BOPLNT

Isaiah 8 in the BOSCB

Isaiah 8 in the BOSNC

Isaiah 8 in the BOTLNT

Isaiah 8 in the BOVCB

Isaiah 8 in the BOYCB

Isaiah 8 in the BPBB

Isaiah 8 in the BPH

Isaiah 8 in the BSB

Isaiah 8 in the CCB

Isaiah 8 in the CUV

Isaiah 8 in the CUVS

Isaiah 8 in the DBT

Isaiah 8 in the DGDNT

Isaiah 8 in the DHNT

Isaiah 8 in the DNT

Isaiah 8 in the ELBE

Isaiah 8 in the EMTV

Isaiah 8 in the ESV

Isaiah 8 in the FBV

Isaiah 8 in the FEB

Isaiah 8 in the GGMNT

Isaiah 8 in the GNT

Isaiah 8 in the HARY

Isaiah 8 in the HNT

Isaiah 8 in the IRVA

Isaiah 8 in the IRVB

Isaiah 8 in the IRVG

Isaiah 8 in the IRVH

Isaiah 8 in the IRVK

Isaiah 8 in the IRVM

Isaiah 8 in the IRVM2

Isaiah 8 in the IRVO

Isaiah 8 in the IRVP

Isaiah 8 in the IRVT

Isaiah 8 in the IRVT2

Isaiah 8 in the IRVU

Isaiah 8 in the ISVN

Isaiah 8 in the JSNT

Isaiah 8 in the KAPI

Isaiah 8 in the KBT1ETNIK

Isaiah 8 in the KBV

Isaiah 8 in the KJV

Isaiah 8 in the KNFD

Isaiah 8 in the LBA

Isaiah 8 in the LBLA

Isaiah 8 in the LNT

Isaiah 8 in the LSV

Isaiah 8 in the MAAL

Isaiah 8 in the MBV

Isaiah 8 in the MBV2

Isaiah 8 in the MHNT

Isaiah 8 in the MKNFD

Isaiah 8 in the MNG

Isaiah 8 in the MNT

Isaiah 8 in the MNT2

Isaiah 8 in the MRS1T

Isaiah 8 in the NAA

Isaiah 8 in the NASB

Isaiah 8 in the NBLA

Isaiah 8 in the NBS

Isaiah 8 in the NBVTP

Isaiah 8 in the NET2

Isaiah 8 in the NIV11

Isaiah 8 in the NNT

Isaiah 8 in the NNT2

Isaiah 8 in the NNT3

Isaiah 8 in the PDDPT

Isaiah 8 in the PFNT

Isaiah 8 in the RMNT

Isaiah 8 in the SBIAS

Isaiah 8 in the SBIBS

Isaiah 8 in the SBIBS2

Isaiah 8 in the SBICS

Isaiah 8 in the SBIDS

Isaiah 8 in the SBIGS

Isaiah 8 in the SBIHS

Isaiah 8 in the SBIIS

Isaiah 8 in the SBIIS2

Isaiah 8 in the SBIIS3

Isaiah 8 in the SBIKS

Isaiah 8 in the SBIKS2

Isaiah 8 in the SBIMS

Isaiah 8 in the SBIOS

Isaiah 8 in the SBIPS

Isaiah 8 in the SBISS

Isaiah 8 in the SBITS

Isaiah 8 in the SBITS2

Isaiah 8 in the SBITS3

Isaiah 8 in the SBITS4

Isaiah 8 in the SBIUS

Isaiah 8 in the SBIVS

Isaiah 8 in the SBT

Isaiah 8 in the SBT1E

Isaiah 8 in the SCHL

Isaiah 8 in the SNT

Isaiah 8 in the SUSU

Isaiah 8 in the SUSU2

Isaiah 8 in the SYNO

Isaiah 8 in the TBIAOTANT

Isaiah 8 in the TBT1E

Isaiah 8 in the TBT1E2

Isaiah 8 in the TFTIP

Isaiah 8 in the TFTU

Isaiah 8 in the TGNTATF3T

Isaiah 8 in the THAI

Isaiah 8 in the TNFD

Isaiah 8 in the TNT

Isaiah 8 in the TNTIK

Isaiah 8 in the TNTIL

Isaiah 8 in the TNTIN

Isaiah 8 in the TNTIP

Isaiah 8 in the TNTIZ

Isaiah 8 in the TOMA

Isaiah 8 in the TTENT

Isaiah 8 in the UBG

Isaiah 8 in the UGV

Isaiah 8 in the UGV2

Isaiah 8 in the UGV3

Isaiah 8 in the VBL

Isaiah 8 in the VDCC

Isaiah 8 in the YALU

Isaiah 8 in the YAPE

Isaiah 8 in the YBVTP

Isaiah 8 in the ZBP