James 3 (BOICB)

1 Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, nʼihi na unu maara na anyị bụ ndị ozizi ka a ga-ekpe ikpe nʼọnọdụ sikarịrị ike. 2 Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka. 3 Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ. 4 Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ. 5 Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Tulee otu oke ọhịa si dị ukwuu, bụ nke icheku ọkụ dịkarịsịrị nta na-eme ka o nwuru ọkụ. 6 Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ. 7 Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na nnụnụ, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri; 8 ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ. 9 Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya. 10 Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi. 11 Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta? 12 Ụmụnna m, osisi fiig ọ pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu ọ pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ. 13 Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala. 14 Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nʼihe ilu na ekworo na ịchọ naanị ihe nke onwe unu, mgbe ahụ, unu ekwesighị ịnya isi sị otu a na-agọnarị eziokwu. 15 Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nʼeluigwe bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa. Ọ bụghị nke mmụọ nsọ. Ọ bụ nke mmụọ ọjọọ. 16 Nʼihi nʼebe ọbụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka ọgbaaghara na omume ọjọọ niile dị. 17 Ma amamihe na-esite nʼeluigwe abịa bụrụ ụzọ dị ọcha, emesịa, ọ hụrụ udo nʼanya, ọ na-eme obiọma, o jupụtara nʼebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịghịkwa nʼime ya. 18 Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ ezi omume.

In Other Versions

James 3 in the ANGEFD

James 3 in the ANTPNG2D

James 3 in the AS21

James 3 in the BAGH

James 3 in the BBPNG

James 3 in the BBT1E

James 3 in the BDS

James 3 in the BEV

James 3 in the BHAD

James 3 in the BIB

James 3 in the BLPT

James 3 in the BNT

James 3 in the BNTABOOT

James 3 in the BNTLV

James 3 in the BOATCB

James 3 in the BOATCB2

James 3 in the BOBCV

James 3 in the BOCNT

James 3 in the BOECS

James 3 in the BOGWICC

James 3 in the BOHCB

James 3 in the BOHCV

James 3 in the BOHLNT

James 3 in the BOHNTLTAL

James 3 in the BOILNTAP

James 3 in the BOITCV

James 3 in the BOKCV

James 3 in the BOKCV2

James 3 in the BOKHWOG

James 3 in the BOKSSV

James 3 in the BOLCB

James 3 in the BOLCB2

James 3 in the BOMCV

James 3 in the BONAV

James 3 in the BONCB

James 3 in the BONLT

James 3 in the BONUT2

James 3 in the BOPLNT

James 3 in the BOSCB

James 3 in the BOSNC

James 3 in the BOTLNT

James 3 in the BOVCB

James 3 in the BOYCB

James 3 in the BPBB

James 3 in the BPH

James 3 in the BSB

James 3 in the CCB

James 3 in the CUV

James 3 in the CUVS

James 3 in the DBT

James 3 in the DGDNT

James 3 in the DHNT

James 3 in the DNT

James 3 in the ELBE

James 3 in the EMTV

James 3 in the ESV

James 3 in the FBV

James 3 in the FEB

James 3 in the GGMNT

James 3 in the GNT

James 3 in the HARY

James 3 in the HNT

James 3 in the IRVA

James 3 in the IRVB

James 3 in the IRVG

James 3 in the IRVH

James 3 in the IRVK

James 3 in the IRVM

James 3 in the IRVM2

James 3 in the IRVO

James 3 in the IRVP

James 3 in the IRVT

James 3 in the IRVT2

James 3 in the IRVU

James 3 in the ISVN

James 3 in the JSNT

James 3 in the KAPI

James 3 in the KBT1ETNIK

James 3 in the KBV

James 3 in the KJV

James 3 in the KNFD

James 3 in the LBA

James 3 in the LBLA

James 3 in the LNT

James 3 in the LSV

James 3 in the MAAL

James 3 in the MBV

James 3 in the MBV2

James 3 in the MHNT

James 3 in the MKNFD

James 3 in the MNG

James 3 in the MNT

James 3 in the MNT2

James 3 in the MRS1T

James 3 in the NAA

James 3 in the NASB

James 3 in the NBLA

James 3 in the NBS

James 3 in the NBVTP

James 3 in the NET2

James 3 in the NIV11

James 3 in the NNT

James 3 in the NNT2

James 3 in the NNT3

James 3 in the PDDPT

James 3 in the PFNT

James 3 in the RMNT

James 3 in the SBIAS

James 3 in the SBIBS

James 3 in the SBIBS2

James 3 in the SBICS

James 3 in the SBIDS

James 3 in the SBIGS

James 3 in the SBIHS

James 3 in the SBIIS

James 3 in the SBIIS2

James 3 in the SBIIS3

James 3 in the SBIKS

James 3 in the SBIKS2

James 3 in the SBIMS

James 3 in the SBIOS

James 3 in the SBIPS

James 3 in the SBISS

James 3 in the SBITS

James 3 in the SBITS2

James 3 in the SBITS3

James 3 in the SBITS4

James 3 in the SBIUS

James 3 in the SBIVS

James 3 in the SBT

James 3 in the SBT1E

James 3 in the SCHL

James 3 in the SNT

James 3 in the SUSU

James 3 in the SUSU2

James 3 in the SYNO

James 3 in the TBIAOTANT

James 3 in the TBT1E

James 3 in the TBT1E2

James 3 in the TFTIP

James 3 in the TFTU

James 3 in the TGNTATF3T

James 3 in the THAI

James 3 in the TNFD

James 3 in the TNT

James 3 in the TNTIK

James 3 in the TNTIL

James 3 in the TNTIN

James 3 in the TNTIP

James 3 in the TNTIZ

James 3 in the TOMA

James 3 in the TTENT

James 3 in the UBG

James 3 in the UGV

James 3 in the UGV2

James 3 in the UGV3

James 3 in the VBL

James 3 in the VDCC

James 3 in the YALU

James 3 in the YAPE

James 3 in the YBVTP

James 3 in the ZBP