James 4 (BOICB)

1 Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu? 2 Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere. 3 Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa. 4 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke. 5 Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.” 6 Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị,“Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu,ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.” 7 Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ. 8 Bịakwutenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, unu ndị mmehie, meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị obi abụọ. 9 Ruonụ ụjụ, tienụ aka nʼobi nʼọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru ụjụ werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ. 10 Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu. 11 Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nʼihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, maọbụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. Mgbe unu na-ekpe iwu ahụ ikpe, unu adịghị edebe ya kama unu bụ ndị na-ekpe ya ikpe. 12 Ọ bụ naanị otu onye o nye iwu. Ọ bụkwa naanị otu onye ikpe dị. Ọ bụ naanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọbụla nʼiyi. Ma gị, onye ka ị na-eche na ị bụ iji na-ekpe nwanna gị ikpe? 13 Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa maọbụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, maọbụ obodo dị otu a, ịzụ ahịa na ire ahịa, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.” 14 Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo. 15 Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị ga-adị ndụ, mee nke a maọbụ nke ọzọ.” 16 Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi na ịkpa nganga. Ụdị ịnya isi a bụ ihe ọjọọ. 17 Ya mere, mmadụ ọbụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie.

In Other Versions

James 4 in the ANGEFD

James 4 in the ANTPNG2D

James 4 in the AS21

James 4 in the BAGH

James 4 in the BBPNG

James 4 in the BBT1E

James 4 in the BDS

James 4 in the BEV

James 4 in the BHAD

James 4 in the BIB

James 4 in the BLPT

James 4 in the BNT

James 4 in the BNTABOOT

James 4 in the BNTLV

James 4 in the BOATCB

James 4 in the BOATCB2

James 4 in the BOBCV

James 4 in the BOCNT

James 4 in the BOECS

James 4 in the BOGWICC

James 4 in the BOHCB

James 4 in the BOHCV

James 4 in the BOHLNT

James 4 in the BOHNTLTAL

James 4 in the BOILNTAP

James 4 in the BOITCV

James 4 in the BOKCV

James 4 in the BOKCV2

James 4 in the BOKHWOG

James 4 in the BOKSSV

James 4 in the BOLCB

James 4 in the BOLCB2

James 4 in the BOMCV

James 4 in the BONAV

James 4 in the BONCB

James 4 in the BONLT

James 4 in the BONUT2

James 4 in the BOPLNT

James 4 in the BOSCB

James 4 in the BOSNC

James 4 in the BOTLNT

James 4 in the BOVCB

James 4 in the BOYCB

James 4 in the BPBB

James 4 in the BPH

James 4 in the BSB

James 4 in the CCB

James 4 in the CUV

James 4 in the CUVS

James 4 in the DBT

James 4 in the DGDNT

James 4 in the DHNT

James 4 in the DNT

James 4 in the ELBE

James 4 in the EMTV

James 4 in the ESV

James 4 in the FBV

James 4 in the FEB

James 4 in the GGMNT

James 4 in the GNT

James 4 in the HARY

James 4 in the HNT

James 4 in the IRVA

James 4 in the IRVB

James 4 in the IRVG

James 4 in the IRVH

James 4 in the IRVK

James 4 in the IRVM

James 4 in the IRVM2

James 4 in the IRVO

James 4 in the IRVP

James 4 in the IRVT

James 4 in the IRVT2

James 4 in the IRVU

James 4 in the ISVN

James 4 in the JSNT

James 4 in the KAPI

James 4 in the KBT1ETNIK

James 4 in the KBV

James 4 in the KJV

James 4 in the KNFD

James 4 in the LBA

James 4 in the LBLA

James 4 in the LNT

James 4 in the LSV

James 4 in the MAAL

James 4 in the MBV

James 4 in the MBV2

James 4 in the MHNT

James 4 in the MKNFD

James 4 in the MNG

James 4 in the MNT

James 4 in the MNT2

James 4 in the MRS1T

James 4 in the NAA

James 4 in the NASB

James 4 in the NBLA

James 4 in the NBS

James 4 in the NBVTP

James 4 in the NET2

James 4 in the NIV11

James 4 in the NNT

James 4 in the NNT2

James 4 in the NNT3

James 4 in the PDDPT

James 4 in the PFNT

James 4 in the RMNT

James 4 in the SBIAS

James 4 in the SBIBS

James 4 in the SBIBS2

James 4 in the SBICS

James 4 in the SBIDS

James 4 in the SBIGS

James 4 in the SBIHS

James 4 in the SBIIS

James 4 in the SBIIS2

James 4 in the SBIIS3

James 4 in the SBIKS

James 4 in the SBIKS2

James 4 in the SBIMS

James 4 in the SBIOS

James 4 in the SBIPS

James 4 in the SBISS

James 4 in the SBITS

James 4 in the SBITS2

James 4 in the SBITS3

James 4 in the SBITS4

James 4 in the SBIUS

James 4 in the SBIVS

James 4 in the SBT

James 4 in the SBT1E

James 4 in the SCHL

James 4 in the SNT

James 4 in the SUSU

James 4 in the SUSU2

James 4 in the SYNO

James 4 in the TBIAOTANT

James 4 in the TBT1E

James 4 in the TBT1E2

James 4 in the TFTIP

James 4 in the TFTU

James 4 in the TGNTATF3T

James 4 in the THAI

James 4 in the TNFD

James 4 in the TNT

James 4 in the TNTIK

James 4 in the TNTIL

James 4 in the TNTIN

James 4 in the TNTIP

James 4 in the TNTIZ

James 4 in the TOMA

James 4 in the TTENT

James 4 in the UBG

James 4 in the UGV

James 4 in the UGV2

James 4 in the UGV3

James 4 in the VBL

James 4 in the VDCC

James 4 in the YALU

James 4 in the YAPE

James 4 in the YBVTP

James 4 in the ZBP