James 5 (BOICB)

1 Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. 2 Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu. 3 Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a. 4 Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 5 Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya. 6 Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu. 7 Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. 8 Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. 9 Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ. 10 Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị. 11 Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko. 12 Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma. 13 Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto. 14 Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 15 Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya. 16 Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire. 17 Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii. 18 Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri. 19 Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ, 20 chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.

In Other Versions

James 5 in the ANGEFD

James 5 in the ANTPNG2D

James 5 in the AS21

James 5 in the BAGH

James 5 in the BBPNG

James 5 in the BBT1E

James 5 in the BDS

James 5 in the BEV

James 5 in the BHAD

James 5 in the BIB

James 5 in the BLPT

James 5 in the BNT

James 5 in the BNTABOOT

James 5 in the BNTLV

James 5 in the BOATCB

James 5 in the BOATCB2

James 5 in the BOBCV

James 5 in the BOCNT

James 5 in the BOECS

James 5 in the BOGWICC

James 5 in the BOHCB

James 5 in the BOHCV

James 5 in the BOHLNT

James 5 in the BOHNTLTAL

James 5 in the BOILNTAP

James 5 in the BOITCV

James 5 in the BOKCV

James 5 in the BOKCV2

James 5 in the BOKHWOG

James 5 in the BOKSSV

James 5 in the BOLCB

James 5 in the BOLCB2

James 5 in the BOMCV

James 5 in the BONAV

James 5 in the BONCB

James 5 in the BONLT

James 5 in the BONUT2

James 5 in the BOPLNT

James 5 in the BOSCB

James 5 in the BOSNC

James 5 in the BOTLNT

James 5 in the BOVCB

James 5 in the BOYCB

James 5 in the BPBB

James 5 in the BPH

James 5 in the BSB

James 5 in the CCB

James 5 in the CUV

James 5 in the CUVS

James 5 in the DBT

James 5 in the DGDNT

James 5 in the DHNT

James 5 in the DNT

James 5 in the ELBE

James 5 in the EMTV

James 5 in the ESV

James 5 in the FBV

James 5 in the FEB

James 5 in the GGMNT

James 5 in the GNT

James 5 in the HARY

James 5 in the HNT

James 5 in the IRVA

James 5 in the IRVB

James 5 in the IRVG

James 5 in the IRVH

James 5 in the IRVK

James 5 in the IRVM

James 5 in the IRVM2

James 5 in the IRVO

James 5 in the IRVP

James 5 in the IRVT

James 5 in the IRVT2

James 5 in the IRVU

James 5 in the ISVN

James 5 in the JSNT

James 5 in the KAPI

James 5 in the KBT1ETNIK

James 5 in the KBV

James 5 in the KJV

James 5 in the KNFD

James 5 in the LBA

James 5 in the LBLA

James 5 in the LNT

James 5 in the LSV

James 5 in the MAAL

James 5 in the MBV

James 5 in the MBV2

James 5 in the MHNT

James 5 in the MKNFD

James 5 in the MNG

James 5 in the MNT

James 5 in the MNT2

James 5 in the MRS1T

James 5 in the NAA

James 5 in the NASB

James 5 in the NBLA

James 5 in the NBS

James 5 in the NBVTP

James 5 in the NET2

James 5 in the NIV11

James 5 in the NNT

James 5 in the NNT2

James 5 in the NNT3

James 5 in the PDDPT

James 5 in the PFNT

James 5 in the RMNT

James 5 in the SBIAS

James 5 in the SBIBS

James 5 in the SBIBS2

James 5 in the SBICS

James 5 in the SBIDS

James 5 in the SBIGS

James 5 in the SBIHS

James 5 in the SBIIS

James 5 in the SBIIS2

James 5 in the SBIIS3

James 5 in the SBIKS

James 5 in the SBIKS2

James 5 in the SBIMS

James 5 in the SBIOS

James 5 in the SBIPS

James 5 in the SBISS

James 5 in the SBITS

James 5 in the SBITS2

James 5 in the SBITS3

James 5 in the SBITS4

James 5 in the SBIUS

James 5 in the SBIVS

James 5 in the SBT

James 5 in the SBT1E

James 5 in the SCHL

James 5 in the SNT

James 5 in the SUSU

James 5 in the SUSU2

James 5 in the SYNO

James 5 in the TBIAOTANT

James 5 in the TBT1E

James 5 in the TBT1E2

James 5 in the TFTIP

James 5 in the TFTU

James 5 in the TGNTATF3T

James 5 in the THAI

James 5 in the TNFD

James 5 in the TNT

James 5 in the TNTIK

James 5 in the TNTIL

James 5 in the TNTIN

James 5 in the TNTIP

James 5 in the TNTIZ

James 5 in the TOMA

James 5 in the TTENT

James 5 in the UBG

James 5 in the UGV

James 5 in the UGV2

James 5 in the UGV3

James 5 in the VBL

James 5 in the VDCC

James 5 in the YALU

James 5 in the YAPE

James 5 in the YBVTP

James 5 in the ZBP