Jeremiah 18 (BOICB)

1 Nke a bụ okwu nke sị nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ bịakwute Jeremaya. 2 “Bilie, jee nʼụlọ ọkpụ ite, ebe ahụ ka m ga-anọ zie gị ozi.” 3 Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe. 4 Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya. 5 Mgbe ahụ okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, 6 Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel. 7 Mgbe ọbụla m kpọsara na a ga-akwada maọbụ bibie, maọbụ si nʼọnọdụ ya hopu mba maọbụ alaeze ọbụla, 8 ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube. 9 Ọzọ, ọ bụrụ na m akpọsaa na a ga-ewuli mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla elu, kụọkwa ya, 10 ọ bụrụ na o mee ihe jọrọ njọ nʼanya m, jụ irubere m isi, agaghị m emere ya ihe ọma ahụ m zubere imere ya. 11 “Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’ 12 Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ” 13 Nʼihi ya ka ONYENWE ANYỊ ji kwuo sị,“Jụtanụ ajụjụ nʼetiti mba niile,onye nụrụla ihe dị otu a?Ndị m, Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwokeemeela ihe jọgburu onwe ya. 14 O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaakọrọ nʼelu ugwu Lebanọn?O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi,nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ? 15 Ma ndị m echezọọla m.Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi,bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile.Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie.Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ,nke a na-ewuzighị ewuzi. 16 Ala ha ga-atọgbọrọ nʼefu.Ọ ga-aghọ ihe iju anya ruo ebighị ebi.Ndị si nʼakụkụ ya na-agafe ga-efufe isi ha,nʼihi na ihe ha ga-ahụ ga-eju ha anya. 17 Aga m achụsa ha nʼihu ndị iro hadịka ifufe na-efe site nʼọwụwa anyanwụ.Aga m agbakụta ha azụ.Ha agaghị ahụkwa ihu m anya nʼụbọchị ahụ mbibi ga-abịakwasị ha.” 18 Ha sịrị, “Bịanụ ka anyị gbaa izu megide Jeremaya, nʼihi na izi iwu agaghị esite nʼebe ndị nchụaja nọ kwụsị, maọbụ ndụmọdụ nʼebe ndị maara ihe, ma ọ bụkwanụ okwu site nʼebe ndị amụma nọ. Ya mere, bịanụ ka anyị were ire anyị buso ya agha, gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ọbụla nke ọ na-ekwu.” 19 Gee m ntị, ONYENWE ANYỊ.Nụrụ ihe ndị na-ebo m ebubo na-ekwu megide m. 20 O kwesiri iji ajọ omume kwụghachi ihe ọma?Ma lee na ha egwuolara m olulu.Chetakwa na m guzooro nʼihu gịma rịọ gị arịrịọ nʼihi ha.Arịrịọ m bụ ka ị hapụ iweso ha oke iwe. 21 Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ.Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha.Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di.Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha,ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha. 22 Mee ka e site nʼụlọ ha nụ mkpu akwa,mgbe i mere ka ndị iro ha buso ha agha na mberede.Nʼihi na ha egwuola olulu ijide m,ha esiekwarala m ọnya nzuzo ijide m nʼụkwụ. 23 Ma gị onwe gị, ONYENWE ANYỊ,maara nzube ọjọọ ha niile igbu m.Agbagharala ha ajọ omume ha;maọbụ hichapụ mmehie ha site nʼihu gị.Mee ka ụkwụ ha gbuchapụ ka ha daa nʼihu gị;mesie ha ike mgbe ị na-ewe iwe.

In Other Versions

Jeremiah 18 in the ANGEFD

Jeremiah 18 in the ANTPNG2D

Jeremiah 18 in the AS21

Jeremiah 18 in the BAGH

Jeremiah 18 in the BBPNG

Jeremiah 18 in the BBT1E

Jeremiah 18 in the BDS

Jeremiah 18 in the BEV

Jeremiah 18 in the BHAD

Jeremiah 18 in the BIB

Jeremiah 18 in the BLPT

Jeremiah 18 in the BNT

Jeremiah 18 in the BNTABOOT

Jeremiah 18 in the BNTLV

Jeremiah 18 in the BOATCB

Jeremiah 18 in the BOATCB2

Jeremiah 18 in the BOBCV

Jeremiah 18 in the BOCNT

Jeremiah 18 in the BOECS

Jeremiah 18 in the BOGWICC

Jeremiah 18 in the BOHCB

Jeremiah 18 in the BOHCV

Jeremiah 18 in the BOHLNT

Jeremiah 18 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 18 in the BOILNTAP

Jeremiah 18 in the BOITCV

Jeremiah 18 in the BOKCV

Jeremiah 18 in the BOKCV2

Jeremiah 18 in the BOKHWOG

Jeremiah 18 in the BOKSSV

Jeremiah 18 in the BOLCB

Jeremiah 18 in the BOLCB2

Jeremiah 18 in the BOMCV

Jeremiah 18 in the BONAV

Jeremiah 18 in the BONCB

Jeremiah 18 in the BONLT

Jeremiah 18 in the BONUT2

Jeremiah 18 in the BOPLNT

Jeremiah 18 in the BOSCB

Jeremiah 18 in the BOSNC

Jeremiah 18 in the BOTLNT

Jeremiah 18 in the BOVCB

Jeremiah 18 in the BOYCB

Jeremiah 18 in the BPBB

Jeremiah 18 in the BPH

Jeremiah 18 in the BSB

Jeremiah 18 in the CCB

Jeremiah 18 in the CUV

Jeremiah 18 in the CUVS

Jeremiah 18 in the DBT

Jeremiah 18 in the DGDNT

Jeremiah 18 in the DHNT

Jeremiah 18 in the DNT

Jeremiah 18 in the ELBE

Jeremiah 18 in the EMTV

Jeremiah 18 in the ESV

Jeremiah 18 in the FBV

Jeremiah 18 in the FEB

Jeremiah 18 in the GGMNT

Jeremiah 18 in the GNT

Jeremiah 18 in the HARY

Jeremiah 18 in the HNT

Jeremiah 18 in the IRVA

Jeremiah 18 in the IRVB

Jeremiah 18 in the IRVG

Jeremiah 18 in the IRVH

Jeremiah 18 in the IRVK

Jeremiah 18 in the IRVM

Jeremiah 18 in the IRVM2

Jeremiah 18 in the IRVO

Jeremiah 18 in the IRVP

Jeremiah 18 in the IRVT

Jeremiah 18 in the IRVT2

Jeremiah 18 in the IRVU

Jeremiah 18 in the ISVN

Jeremiah 18 in the JSNT

Jeremiah 18 in the KAPI

Jeremiah 18 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 18 in the KBV

Jeremiah 18 in the KJV

Jeremiah 18 in the KNFD

Jeremiah 18 in the LBA

Jeremiah 18 in the LBLA

Jeremiah 18 in the LNT

Jeremiah 18 in the LSV

Jeremiah 18 in the MAAL

Jeremiah 18 in the MBV

Jeremiah 18 in the MBV2

Jeremiah 18 in the MHNT

Jeremiah 18 in the MKNFD

Jeremiah 18 in the MNG

Jeremiah 18 in the MNT

Jeremiah 18 in the MNT2

Jeremiah 18 in the MRS1T

Jeremiah 18 in the NAA

Jeremiah 18 in the NASB

Jeremiah 18 in the NBLA

Jeremiah 18 in the NBS

Jeremiah 18 in the NBVTP

Jeremiah 18 in the NET2

Jeremiah 18 in the NIV11

Jeremiah 18 in the NNT

Jeremiah 18 in the NNT2

Jeremiah 18 in the NNT3

Jeremiah 18 in the PDDPT

Jeremiah 18 in the PFNT

Jeremiah 18 in the RMNT

Jeremiah 18 in the SBIAS

Jeremiah 18 in the SBIBS

Jeremiah 18 in the SBIBS2

Jeremiah 18 in the SBICS

Jeremiah 18 in the SBIDS

Jeremiah 18 in the SBIGS

Jeremiah 18 in the SBIHS

Jeremiah 18 in the SBIIS

Jeremiah 18 in the SBIIS2

Jeremiah 18 in the SBIIS3

Jeremiah 18 in the SBIKS

Jeremiah 18 in the SBIKS2

Jeremiah 18 in the SBIMS

Jeremiah 18 in the SBIOS

Jeremiah 18 in the SBIPS

Jeremiah 18 in the SBISS

Jeremiah 18 in the SBITS

Jeremiah 18 in the SBITS2

Jeremiah 18 in the SBITS3

Jeremiah 18 in the SBITS4

Jeremiah 18 in the SBIUS

Jeremiah 18 in the SBIVS

Jeremiah 18 in the SBT

Jeremiah 18 in the SBT1E

Jeremiah 18 in the SCHL

Jeremiah 18 in the SNT

Jeremiah 18 in the SUSU

Jeremiah 18 in the SUSU2

Jeremiah 18 in the SYNO

Jeremiah 18 in the TBIAOTANT

Jeremiah 18 in the TBT1E

Jeremiah 18 in the TBT1E2

Jeremiah 18 in the TFTIP

Jeremiah 18 in the TFTU

Jeremiah 18 in the TGNTATF3T

Jeremiah 18 in the THAI

Jeremiah 18 in the TNFD

Jeremiah 18 in the TNT

Jeremiah 18 in the TNTIK

Jeremiah 18 in the TNTIL

Jeremiah 18 in the TNTIN

Jeremiah 18 in the TNTIP

Jeremiah 18 in the TNTIZ

Jeremiah 18 in the TOMA

Jeremiah 18 in the TTENT

Jeremiah 18 in the UBG

Jeremiah 18 in the UGV

Jeremiah 18 in the UGV2

Jeremiah 18 in the UGV3

Jeremiah 18 in the VBL

Jeremiah 18 in the VDCC

Jeremiah 18 in the YALU

Jeremiah 18 in the YAPE

Jeremiah 18 in the YBVTP

Jeremiah 18 in the ZBP