Jeremiah 21 (BOICB)
1 Ndị a bụ okwu ONYENWE ANYỊ, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia, 2 sị, “Jụtara anyị ase site nʼaka ONYENWE ANYỊ, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya.” 3 Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya, 4 ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a. 5 Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu. 6 Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha. 7 Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’ 8 “Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ. 9 Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya. 10 Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’ 11 “Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ. 12 Unu ụlọ Devid, otu a ka ONYENWE ANYỊ sịrị,“ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile;napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha.Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a.Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu,dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu,ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị. 13 Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem,gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a,onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha?Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?” 14 Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị,otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile,nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’ ”
In Other Versions
Jeremiah 21 in the ANGEFD
Jeremiah 21 in the ANTPNG2D
Jeremiah 21 in the AS21
Jeremiah 21 in the BAGH
Jeremiah 21 in the BBPNG
Jeremiah 21 in the BBT1E
Jeremiah 21 in the BDS
Jeremiah 21 in the BEV
Jeremiah 21 in the BHAD
Jeremiah 21 in the BIB
Jeremiah 21 in the BLPT
Jeremiah 21 in the BNT
Jeremiah 21 in the BNTABOOT
Jeremiah 21 in the BNTLV
Jeremiah 21 in the BOATCB
Jeremiah 21 in the BOATCB2
Jeremiah 21 in the BOBCV
Jeremiah 21 in the BOCNT
Jeremiah 21 in the BOECS
Jeremiah 21 in the BOGWICC
Jeremiah 21 in the BOHCB
Jeremiah 21 in the BOHCV
Jeremiah 21 in the BOHLNT
Jeremiah 21 in the BOHNTLTAL
Jeremiah 21 in the BOILNTAP
Jeremiah 21 in the BOITCV
Jeremiah 21 in the BOKCV
Jeremiah 21 in the BOKCV2
Jeremiah 21 in the BOKHWOG
Jeremiah 21 in the BOKSSV
Jeremiah 21 in the BOLCB
Jeremiah 21 in the BOLCB2
Jeremiah 21 in the BOMCV
Jeremiah 21 in the BONAV
Jeremiah 21 in the BONCB
Jeremiah 21 in the BONLT
Jeremiah 21 in the BONUT2
Jeremiah 21 in the BOPLNT
Jeremiah 21 in the BOSCB
Jeremiah 21 in the BOSNC
Jeremiah 21 in the BOTLNT
Jeremiah 21 in the BOVCB
Jeremiah 21 in the BOYCB
Jeremiah 21 in the BPBB
Jeremiah 21 in the BPH
Jeremiah 21 in the BSB
Jeremiah 21 in the CCB
Jeremiah 21 in the CUV
Jeremiah 21 in the CUVS
Jeremiah 21 in the DBT
Jeremiah 21 in the DGDNT
Jeremiah 21 in the DHNT
Jeremiah 21 in the DNT
Jeremiah 21 in the ELBE
Jeremiah 21 in the EMTV
Jeremiah 21 in the ESV
Jeremiah 21 in the FBV
Jeremiah 21 in the FEB
Jeremiah 21 in the GGMNT
Jeremiah 21 in the GNT
Jeremiah 21 in the HARY
Jeremiah 21 in the HNT
Jeremiah 21 in the IRVA
Jeremiah 21 in the IRVB
Jeremiah 21 in the IRVG
Jeremiah 21 in the IRVH
Jeremiah 21 in the IRVK
Jeremiah 21 in the IRVM
Jeremiah 21 in the IRVM2
Jeremiah 21 in the IRVO
Jeremiah 21 in the IRVP
Jeremiah 21 in the IRVT
Jeremiah 21 in the IRVT2
Jeremiah 21 in the IRVU
Jeremiah 21 in the ISVN
Jeremiah 21 in the JSNT
Jeremiah 21 in the KAPI
Jeremiah 21 in the KBT1ETNIK
Jeremiah 21 in the KBV
Jeremiah 21 in the KJV
Jeremiah 21 in the KNFD
Jeremiah 21 in the LBA
Jeremiah 21 in the LBLA
Jeremiah 21 in the LNT
Jeremiah 21 in the LSV
Jeremiah 21 in the MAAL
Jeremiah 21 in the MBV
Jeremiah 21 in the MBV2
Jeremiah 21 in the MHNT
Jeremiah 21 in the MKNFD
Jeremiah 21 in the MNG
Jeremiah 21 in the MNT
Jeremiah 21 in the MNT2
Jeremiah 21 in the MRS1T
Jeremiah 21 in the NAA
Jeremiah 21 in the NASB
Jeremiah 21 in the NBLA
Jeremiah 21 in the NBS
Jeremiah 21 in the NBVTP
Jeremiah 21 in the NET2
Jeremiah 21 in the NIV11
Jeremiah 21 in the NNT
Jeremiah 21 in the NNT2
Jeremiah 21 in the NNT3
Jeremiah 21 in the PDDPT
Jeremiah 21 in the PFNT
Jeremiah 21 in the RMNT
Jeremiah 21 in the SBIAS
Jeremiah 21 in the SBIBS
Jeremiah 21 in the SBIBS2
Jeremiah 21 in the SBICS
Jeremiah 21 in the SBIDS
Jeremiah 21 in the SBIGS
Jeremiah 21 in the SBIHS
Jeremiah 21 in the SBIIS
Jeremiah 21 in the SBIIS2
Jeremiah 21 in the SBIIS3
Jeremiah 21 in the SBIKS
Jeremiah 21 in the SBIKS2
Jeremiah 21 in the SBIMS
Jeremiah 21 in the SBIOS
Jeremiah 21 in the SBIPS
Jeremiah 21 in the SBISS
Jeremiah 21 in the SBITS
Jeremiah 21 in the SBITS2
Jeremiah 21 in the SBITS3
Jeremiah 21 in the SBITS4
Jeremiah 21 in the SBIUS
Jeremiah 21 in the SBIVS
Jeremiah 21 in the SBT
Jeremiah 21 in the SBT1E
Jeremiah 21 in the SCHL
Jeremiah 21 in the SNT
Jeremiah 21 in the SUSU
Jeremiah 21 in the SUSU2
Jeremiah 21 in the SYNO
Jeremiah 21 in the TBIAOTANT
Jeremiah 21 in the TBT1E
Jeremiah 21 in the TBT1E2
Jeremiah 21 in the TFTIP
Jeremiah 21 in the TFTU
Jeremiah 21 in the TGNTATF3T
Jeremiah 21 in the THAI
Jeremiah 21 in the TNFD
Jeremiah 21 in the TNT
Jeremiah 21 in the TNTIK
Jeremiah 21 in the TNTIL
Jeremiah 21 in the TNTIN
Jeremiah 21 in the TNTIP
Jeremiah 21 in the TNTIZ
Jeremiah 21 in the TOMA
Jeremiah 21 in the TTENT
Jeremiah 21 in the UBG
Jeremiah 21 in the UGV
Jeremiah 21 in the UGV2
Jeremiah 21 in the UGV3
Jeremiah 21 in the VBL
Jeremiah 21 in the VDCC
Jeremiah 21 in the YALU
Jeremiah 21 in the YAPE
Jeremiah 21 in the YBVTP
Jeremiah 21 in the ZBP