Jeremiah 27 (BOICB)

1 Na mmalite ọchịchị Zedekaya, nwa Josaya eze Juda, okwu ndị a si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ rute Jeremaya ntị. 2 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ gwara m, “Jiri akpụkpọ anụ dị warawara na ụfọdụ okporo igwe, meere onwe gị ụdị agbụ ahụ a na-amanye ụmụ ehi nʼolu, nyakwasị ya nʼolu gị. 3 Mgbe ahụ, zigara ndị eze Edọm, na Moab, na Amọn, na Taịa, na Saịdọn ozi site nʼọnụ ndị ozi ha bịara Jerusalem iwetara Zedekaya eze Juda ozi. 4 Zie ha ozi ha ga-ezi ndị nwe ha, sị, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, sị, “Zienụ ndị nna unu ukwu ozi a, sị, 5 Ọ bụ site nʼike aka m, na site nʼogwe aka m, nke e setịrị eseti, ka m ji mee ụwa, na mmadụ, na anụmanụ dị nʼime ya. Mụ onwe m ka ọ dịkwara ikpebi itinye ha niile nʼaka onye ọbụla m họpụtara dịka o si dị m mma. 6 Ugbu a, ana m ewere alaeze unu niile nyefee ya nʼaka onye na-ejere m ozi bụ Nebukadneza eze Babilọn; aga m emekwa ka ọ bụladị ụmụ ajọ anụ ọhịa mee ihe o nyere nʼiwu. 7 Mba niile ga-akpọ isiala nye ya; ha ga-akpọkwa isiala nye nwa ya na nwa nwa ya, tutu ruo mgbe m kpebiri na oge ha ezuola. Mgbe ahụ, aga m eme ka ọtụtụ mba na ọtụtụ ndị eze merie ya. 8 “ ‘ “Ma ọ bụrụkwa na mba maọbụ alaeze ọbụla ajụ ife Nebukadneza, bụ eze Babilọn, maọbụ jụ ijere ya ozi dịka ohu, aga m eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe, taa mba ahụ ahụhụ, tutu ruo mgbe m bibiri ya site nʼaka ya. Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 9 Ya mere, unu aṅala ndị amụma unu, na ndị na-ajụ mmụọ ase, na ndị na-akọwara unu nrọ, na ndị mmụọ ọjọọ si nʼọnụ ha ekwu okwu, na ndị mgbaasị ntị. Unu aṅala ha ntị mgbe ha na-asị unu, ‘Unu agaghị abụ ndị ohu eze Babilọn.’ 10 Nʼihi na ọ bụ naanị amụma ụgha ka ha na-eburu unu, okwu ụgha nke ga-eme ka e site nʼala unu wezuga unu, bulaa unu ala dị anya. Aga m esi nʼala unu chụsaa unu. Unu ga-alakwa nʼiyi. 11 Ma ọ bụrụ na mba ọbụla ekwere ịbụ ohu eze Babilọn, kwenyekwa ife ya ofufe, mba ahụ ka m ga-eme ka ọ nọgide nʼala nke aka ya. Ọ ga-akọ ala ahụ, birikwa nʼime ya. Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri.” ’ ” 12 Otu ozi ahụ ka m ziri Zedekaya, bụ eze Juda. Asịrị m, “Were olu gị nyefee eze Babilọn nʼaka dịka ohu, feekwa ya na ndị ya, ị ga-adịkwa ndụ. 13 Nʼihi gịnị ka gị na ndị gị ga-eji nwụọ site na mma agha, na site nʼụnwụ na ọrịa na-efe efe, dịka nke ONYENWE ANYỊ kwurula banyere mba ọbụla nke na-agaghị efe eze Babilọn? 14 Egela ntị nʼokwu ndị amụma na-agwa gị sị, ‘Unu agaghị efe eze Babilọn,’ nʼihi na ọ bụ okwu ụgha ka ha na-agwa unu. 15 ‘Ọ bụghị m zitere ha,’ otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. ‘Ha ji aha m na-ebu amụma ụgha. Nʼihi ya, aga m achụpụ unu, unu ga-alakwa nʼiyi, unu na ndị amụma ahụ na-eburu unu amụma.’ ” 16 Mgbe ahụ, agwara m ndị nchụaja na ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: Unu egela ndị amụma ahụ ntị, bụ ndị na-asị unu, ‘Na mgbe na-adịghị anya a ga-ebughachi ngwongwo ahụ e si nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ bulaa Babilọn.’ Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu. 17 Unu egela ha ntị. Feenụ eze Babilọn, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼụzọ ahụ ka unu ga-esi dịrị ndụ. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji kwenye ka obodo a ghọọ mkpọmkpọ ebe? 18 Ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ okwu ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ ndị amụma a na-apụta, ha rịọọnụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile arịrịọ ka ọ hapụ ikwe ka e bukọrọ ngwongwo fọdụrụ nʼime ụlọnsọ nakwa ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda, na nʼime Jerusalem bulaa Babilọn. 19 Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ogidi niile ndị ahụ, na Oke osimiri bronz ahụ, na ihe ndọkwasị niile, na ihe niile fọdụrụ nʼobodo a, 20 nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn na-eburughị mgbe o sitere na Juda na Jerusalem, dọkpụrụ Jehoiakin nwa Jehoiakim, bụ eze Juda, na ndị niile a na-asọpụrụ bulaa Babilọn. 21 E, ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru banyere ihe niile fọdụrụ nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, na ndị fọdụrụ nʼụlọeze Juda na nʼime Jerusalem. 22 ‘A ga-eburu ha niile bulaa ha Babilọn. Ebe ahụ ka ha ga-anọkwa tutu ruo mgbe m ga-abịa leta ha,’ ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. ‘Mgbe ahụ, aga m ebulatakwa ha, kpọghachitekwa ha nʼebe a.’ ”

In Other Versions

Jeremiah 27 in the ANGEFD

Jeremiah 27 in the ANTPNG2D

Jeremiah 27 in the AS21

Jeremiah 27 in the BAGH

Jeremiah 27 in the BBPNG

Jeremiah 27 in the BBT1E

Jeremiah 27 in the BDS

Jeremiah 27 in the BEV

Jeremiah 27 in the BHAD

Jeremiah 27 in the BIB

Jeremiah 27 in the BLPT

Jeremiah 27 in the BNT

Jeremiah 27 in the BNTABOOT

Jeremiah 27 in the BNTLV

Jeremiah 27 in the BOATCB

Jeremiah 27 in the BOATCB2

Jeremiah 27 in the BOBCV

Jeremiah 27 in the BOCNT

Jeremiah 27 in the BOECS

Jeremiah 27 in the BOGWICC

Jeremiah 27 in the BOHCB

Jeremiah 27 in the BOHCV

Jeremiah 27 in the BOHLNT

Jeremiah 27 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 27 in the BOILNTAP

Jeremiah 27 in the BOITCV

Jeremiah 27 in the BOKCV

Jeremiah 27 in the BOKCV2

Jeremiah 27 in the BOKHWOG

Jeremiah 27 in the BOKSSV

Jeremiah 27 in the BOLCB

Jeremiah 27 in the BOLCB2

Jeremiah 27 in the BOMCV

Jeremiah 27 in the BONAV

Jeremiah 27 in the BONCB

Jeremiah 27 in the BONLT

Jeremiah 27 in the BONUT2

Jeremiah 27 in the BOPLNT

Jeremiah 27 in the BOSCB

Jeremiah 27 in the BOSNC

Jeremiah 27 in the BOTLNT

Jeremiah 27 in the BOVCB

Jeremiah 27 in the BOYCB

Jeremiah 27 in the BPBB

Jeremiah 27 in the BPH

Jeremiah 27 in the BSB

Jeremiah 27 in the CCB

Jeremiah 27 in the CUV

Jeremiah 27 in the CUVS

Jeremiah 27 in the DBT

Jeremiah 27 in the DGDNT

Jeremiah 27 in the DHNT

Jeremiah 27 in the DNT

Jeremiah 27 in the ELBE

Jeremiah 27 in the EMTV

Jeremiah 27 in the ESV

Jeremiah 27 in the FBV

Jeremiah 27 in the FEB

Jeremiah 27 in the GGMNT

Jeremiah 27 in the GNT

Jeremiah 27 in the HARY

Jeremiah 27 in the HNT

Jeremiah 27 in the IRVA

Jeremiah 27 in the IRVB

Jeremiah 27 in the IRVG

Jeremiah 27 in the IRVH

Jeremiah 27 in the IRVK

Jeremiah 27 in the IRVM

Jeremiah 27 in the IRVM2

Jeremiah 27 in the IRVO

Jeremiah 27 in the IRVP

Jeremiah 27 in the IRVT

Jeremiah 27 in the IRVT2

Jeremiah 27 in the IRVU

Jeremiah 27 in the ISVN

Jeremiah 27 in the JSNT

Jeremiah 27 in the KAPI

Jeremiah 27 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 27 in the KBV

Jeremiah 27 in the KJV

Jeremiah 27 in the KNFD

Jeremiah 27 in the LBA

Jeremiah 27 in the LBLA

Jeremiah 27 in the LNT

Jeremiah 27 in the LSV

Jeremiah 27 in the MAAL

Jeremiah 27 in the MBV

Jeremiah 27 in the MBV2

Jeremiah 27 in the MHNT

Jeremiah 27 in the MKNFD

Jeremiah 27 in the MNG

Jeremiah 27 in the MNT

Jeremiah 27 in the MNT2

Jeremiah 27 in the MRS1T

Jeremiah 27 in the NAA

Jeremiah 27 in the NASB

Jeremiah 27 in the NBLA

Jeremiah 27 in the NBS

Jeremiah 27 in the NBVTP

Jeremiah 27 in the NET2

Jeremiah 27 in the NIV11

Jeremiah 27 in the NNT

Jeremiah 27 in the NNT2

Jeremiah 27 in the NNT3

Jeremiah 27 in the PDDPT

Jeremiah 27 in the PFNT

Jeremiah 27 in the RMNT

Jeremiah 27 in the SBIAS

Jeremiah 27 in the SBIBS

Jeremiah 27 in the SBIBS2

Jeremiah 27 in the SBICS

Jeremiah 27 in the SBIDS

Jeremiah 27 in the SBIGS

Jeremiah 27 in the SBIHS

Jeremiah 27 in the SBIIS

Jeremiah 27 in the SBIIS2

Jeremiah 27 in the SBIIS3

Jeremiah 27 in the SBIKS

Jeremiah 27 in the SBIKS2

Jeremiah 27 in the SBIMS

Jeremiah 27 in the SBIOS

Jeremiah 27 in the SBIPS

Jeremiah 27 in the SBISS

Jeremiah 27 in the SBITS

Jeremiah 27 in the SBITS2

Jeremiah 27 in the SBITS3

Jeremiah 27 in the SBITS4

Jeremiah 27 in the SBIUS

Jeremiah 27 in the SBIVS

Jeremiah 27 in the SBT

Jeremiah 27 in the SBT1E

Jeremiah 27 in the SCHL

Jeremiah 27 in the SNT

Jeremiah 27 in the SUSU

Jeremiah 27 in the SUSU2

Jeremiah 27 in the SYNO

Jeremiah 27 in the TBIAOTANT

Jeremiah 27 in the TBT1E

Jeremiah 27 in the TBT1E2

Jeremiah 27 in the TFTIP

Jeremiah 27 in the TFTU

Jeremiah 27 in the TGNTATF3T

Jeremiah 27 in the THAI

Jeremiah 27 in the TNFD

Jeremiah 27 in the TNT

Jeremiah 27 in the TNTIK

Jeremiah 27 in the TNTIL

Jeremiah 27 in the TNTIN

Jeremiah 27 in the TNTIP

Jeremiah 27 in the TNTIZ

Jeremiah 27 in the TOMA

Jeremiah 27 in the TTENT

Jeremiah 27 in the UBG

Jeremiah 27 in the UGV

Jeremiah 27 in the UGV2

Jeremiah 27 in the UGV3

Jeremiah 27 in the VBL

Jeremiah 27 in the VDCC

Jeremiah 27 in the YALU

Jeremiah 27 in the YAPE

Jeremiah 27 in the YBVTP

Jeremiah 27 in the ZBP