Jeremiah 46 (BOICB)

1 Ndị a bụ okwu ONYENWE ANYỊ, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche. 2 Nke dịrị Ijipt: Ndị a bụ okwu dị megide usuu ndị agha Fero Neko, bụ eze Ijipt, ndị Nebukadneza eze Babilọn meriri nʼagha na Kakemish, nʼakụkụ osimiri Yufretis, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda. 3 “Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta,zọpụnụ ije maka ibu agha. 4 Kegidezienụ ịnyịnya unu,rịkwasịkwanụ nʼelu ha.Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu,ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu.Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ,yikwasịkwanụ uwe agha unu. 5 Gịnị ka anya m abụọ hụrụ?Ụjọ na-atụ ha,ha na-agbaghachikwa azụ;lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha.Ha na-agbasi ọsọ ike,na-eleghị anya nʼazụ.Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 6 “Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga,ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha.Ha na-asọ ngọngọ daa,nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis. 7 “Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl,na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị? 8 Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl,dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị.Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile.Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’ 9 Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile.Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha.Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta,na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta. 10 Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile.Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya.Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya,e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ.Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu,nke dị nso osimiri Yufretis. 11 “Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya,gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke.Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile,nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị. 12 Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị.Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị.Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya;ha abụọ na-adakwa nʼala.” 13 Okwu ndị a ka ONYENWE ANYỊ gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha. 14 “Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol.Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis.Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere,nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu. 15 Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha?Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-akwada ha. 16 Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe,ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha.Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị,ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị,ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’ 17 Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị,‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu.Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’ 18 “Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara,onye aha ya bụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile,“otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị,na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri. 19 Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ,unu ndị bi nʼIjipt,nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu.Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya. 20 “Ijipt mara mma dịka nne ehi,ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu,na-abịa imegide ya. 21 Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti hadịka ụmụ ehi gbara abụba.Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ,ha agaghị eguzo,nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha,bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ. 22 Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme,mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya.Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya,dịka ndị na-egbutu osisi. 23 Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri,“nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke.Ha dị ọtụtụ karịa igurube,a pụghịkwa ịgụta ole ha dị. 24 A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt,mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.” 25 ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi. 26 Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 27 “Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m.Adakwala mba, gị Izrel.Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri.Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri.Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla.Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ. 28 Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m,nʼihi na anọnyeere m gị,”otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.“A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niilenke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam,agaghị m ebibi gị kpamkpam.Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi.Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.”

In Other Versions

Jeremiah 46 in the ANGEFD

Jeremiah 46 in the ANTPNG2D

Jeremiah 46 in the AS21

Jeremiah 46 in the BAGH

Jeremiah 46 in the BBPNG

Jeremiah 46 in the BBT1E

Jeremiah 46 in the BDS

Jeremiah 46 in the BEV

Jeremiah 46 in the BHAD

Jeremiah 46 in the BIB

Jeremiah 46 in the BLPT

Jeremiah 46 in the BNT

Jeremiah 46 in the BNTABOOT

Jeremiah 46 in the BNTLV

Jeremiah 46 in the BOATCB

Jeremiah 46 in the BOATCB2

Jeremiah 46 in the BOBCV

Jeremiah 46 in the BOCNT

Jeremiah 46 in the BOECS

Jeremiah 46 in the BOGWICC

Jeremiah 46 in the BOHCB

Jeremiah 46 in the BOHCV

Jeremiah 46 in the BOHLNT

Jeremiah 46 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 46 in the BOILNTAP

Jeremiah 46 in the BOITCV

Jeremiah 46 in the BOKCV

Jeremiah 46 in the BOKCV2

Jeremiah 46 in the BOKHWOG

Jeremiah 46 in the BOKSSV

Jeremiah 46 in the BOLCB

Jeremiah 46 in the BOLCB2

Jeremiah 46 in the BOMCV

Jeremiah 46 in the BONAV

Jeremiah 46 in the BONCB

Jeremiah 46 in the BONLT

Jeremiah 46 in the BONUT2

Jeremiah 46 in the BOPLNT

Jeremiah 46 in the BOSCB

Jeremiah 46 in the BOSNC

Jeremiah 46 in the BOTLNT

Jeremiah 46 in the BOVCB

Jeremiah 46 in the BOYCB

Jeremiah 46 in the BPBB

Jeremiah 46 in the BPH

Jeremiah 46 in the BSB

Jeremiah 46 in the CCB

Jeremiah 46 in the CUV

Jeremiah 46 in the CUVS

Jeremiah 46 in the DBT

Jeremiah 46 in the DGDNT

Jeremiah 46 in the DHNT

Jeremiah 46 in the DNT

Jeremiah 46 in the ELBE

Jeremiah 46 in the EMTV

Jeremiah 46 in the ESV

Jeremiah 46 in the FBV

Jeremiah 46 in the FEB

Jeremiah 46 in the GGMNT

Jeremiah 46 in the GNT

Jeremiah 46 in the HARY

Jeremiah 46 in the HNT

Jeremiah 46 in the IRVA

Jeremiah 46 in the IRVB

Jeremiah 46 in the IRVG

Jeremiah 46 in the IRVH

Jeremiah 46 in the IRVK

Jeremiah 46 in the IRVM

Jeremiah 46 in the IRVM2

Jeremiah 46 in the IRVO

Jeremiah 46 in the IRVP

Jeremiah 46 in the IRVT

Jeremiah 46 in the IRVT2

Jeremiah 46 in the IRVU

Jeremiah 46 in the ISVN

Jeremiah 46 in the JSNT

Jeremiah 46 in the KAPI

Jeremiah 46 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 46 in the KBV

Jeremiah 46 in the KJV

Jeremiah 46 in the KNFD

Jeremiah 46 in the LBA

Jeremiah 46 in the LBLA

Jeremiah 46 in the LNT

Jeremiah 46 in the LSV

Jeremiah 46 in the MAAL

Jeremiah 46 in the MBV

Jeremiah 46 in the MBV2

Jeremiah 46 in the MHNT

Jeremiah 46 in the MKNFD

Jeremiah 46 in the MNG

Jeremiah 46 in the MNT

Jeremiah 46 in the MNT2

Jeremiah 46 in the MRS1T

Jeremiah 46 in the NAA

Jeremiah 46 in the NASB

Jeremiah 46 in the NBLA

Jeremiah 46 in the NBS

Jeremiah 46 in the NBVTP

Jeremiah 46 in the NET2

Jeremiah 46 in the NIV11

Jeremiah 46 in the NNT

Jeremiah 46 in the NNT2

Jeremiah 46 in the NNT3

Jeremiah 46 in the PDDPT

Jeremiah 46 in the PFNT

Jeremiah 46 in the RMNT

Jeremiah 46 in the SBIAS

Jeremiah 46 in the SBIBS

Jeremiah 46 in the SBIBS2

Jeremiah 46 in the SBICS

Jeremiah 46 in the SBIDS

Jeremiah 46 in the SBIGS

Jeremiah 46 in the SBIHS

Jeremiah 46 in the SBIIS

Jeremiah 46 in the SBIIS2

Jeremiah 46 in the SBIIS3

Jeremiah 46 in the SBIKS

Jeremiah 46 in the SBIKS2

Jeremiah 46 in the SBIMS

Jeremiah 46 in the SBIOS

Jeremiah 46 in the SBIPS

Jeremiah 46 in the SBISS

Jeremiah 46 in the SBITS

Jeremiah 46 in the SBITS2

Jeremiah 46 in the SBITS3

Jeremiah 46 in the SBITS4

Jeremiah 46 in the SBIUS

Jeremiah 46 in the SBIVS

Jeremiah 46 in the SBT

Jeremiah 46 in the SBT1E

Jeremiah 46 in the SCHL

Jeremiah 46 in the SNT

Jeremiah 46 in the SUSU

Jeremiah 46 in the SUSU2

Jeremiah 46 in the SYNO

Jeremiah 46 in the TBIAOTANT

Jeremiah 46 in the TBT1E

Jeremiah 46 in the TBT1E2

Jeremiah 46 in the TFTIP

Jeremiah 46 in the TFTU

Jeremiah 46 in the TGNTATF3T

Jeremiah 46 in the THAI

Jeremiah 46 in the TNFD

Jeremiah 46 in the TNT

Jeremiah 46 in the TNTIK

Jeremiah 46 in the TNTIL

Jeremiah 46 in the TNTIN

Jeremiah 46 in the TNTIP

Jeremiah 46 in the TNTIZ

Jeremiah 46 in the TOMA

Jeremiah 46 in the TTENT

Jeremiah 46 in the UBG

Jeremiah 46 in the UGV

Jeremiah 46 in the UGV2

Jeremiah 46 in the UGV3

Jeremiah 46 in the VBL

Jeremiah 46 in the VDCC

Jeremiah 46 in the YALU

Jeremiah 46 in the YAPE

Jeremiah 46 in the YBVTP

Jeremiah 46 in the ZBP