John 15 (BOICB)
1 “Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi. 2 Ọ na-egbuda alaka ọbụla dị nʼime m nke na-adịghị amị mkpụrụ. Ma alaka ọbụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-egbucha, ka o nwee ike mịa mkpụrụ dị ọtụtụ. 3 Ugbu a, e meela ka unu dịrị ọcha nʼihi okwu m gwara unu. 4 Nọgidenụ nʼime m, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime unu. Dịka alaka ọbụla apụghị ịmị mkpụrụ nʼonwe ya ma ọ bụrụ na ọ nọgideghị nʼosisi vaịnị. Otu a, unu apụghịkwa ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị nʼime m. 5 “Mụ onwe m bụ osisi vaịnị ahụ; unu bụkwa alaka ya. Onye ọbụla na-anọgide nʼime m, nke mụ onwe m na-anọgidekwa nʼime ya, na-amị ọtụtụ mkpụrụ. Nʼihi na ewezuga m, unu enweghị ike ime ihe ọbụla. 6 Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼime m dị ka alaka e gbuturu, tụpụ ya, ọ kpọnwụọ. A ga-achịkọta ya, chịnye ya nʼọkụ, o repịa. 7 Ọ bụrụ na unu anọgide nʼime m, okwu m anọgidekwa nʼime unu, rịọọnụ ihe ọbụla unu chọrọ, a ga-emere unu ya. 8 Nke a ga-abụrụ Nna m otuto na unu mịrị ọtụtụ mkpụrụ hie nne, ọ na-egosikwa na unu bụ ndị na-eso ụzọ m. 9 “Dị ka Nna sị hụ m nʼanya, otu a ka m sị hụkwa unu nʼanya. Ya mere, nọgidenụ nʼime ịhụnanya m. 10 Unu ga-anọgide nʼịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe iwu m. Dị ka m debere iwu Nna m ma nọgidekwa nʼịhụnanya ya. 11 Agwala m unu ihe ndị a ka ọṅụ m dịrị nʼime unu ka ọṅụ unu zukwaa oke. 12 Nke a bụkwa iwu m, ka unu hụrịta onwe unu nʼanya dị ka m siri hụ unu nʼanya. 13 Ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nʼihi ndị enyi ya. 14 Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere nʼiwu. 15 Anaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nʼihi na ohu adịghị amatazu ihe niile onyenwe ya na-eme. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nʼihi na agwala m unu ihe niile m nụrụ nʼọnụ Nna m. 16 Ọ bụkwaghị unu onwe unu họọrọ m. Ọ bụ m họọrọ unu, wepụtakwa unu iche ka unu gaa mịa ọtụtụ mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgidekwa. Ya mere, Nna m ga-enye unu ihe ọbụla unu ga-arịọ nʼaha m. 17 Ihe ndị a ka m na-enye unu nʼiwu, hụrịtanụ onwe unu nʼanya. 18 “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, chetanụ na o buru ụzọ kpọọ m asị. 19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị. 20 Chetakwanụ ihe m gwara unu, ‘Ohu adịghị adị ukwuu karịa Onyenwe ya.’ Ya mere, ebe ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu. Ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21 Ee, ha ga-eme unu ihe niile ndị a nʼihi aha m, na nʼihi na ha amaghị onye ahụ zitere m. 22 Ọ bụrụ na abịaghị m, gwa ha okwu, ikpe mmehie agaraghị ama ha. Ma ugbu a, ha enweghị ngọpụ ọbụla banyere mmehie ha. 23 Onye ọbụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị. 24 A sị na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọbụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu a ha ahụzuola ọrụ ebube ndị a niile, ma ha nọgidekwara na-akpọ mụ na Nna m asị. 25 Nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ iwu ha. ‘Ha kpọrọ m asị na-enweghị ihe m mere.’ 26 “Mgbe Onye Ndụmọdụ ahụ ga-abịa, onye m ga-ezitere unu site nʼaka Nna, bụ Mmụọ eziokwu ahụ sitere na Nna pụta, ọ ga-agba ama banyere m. 27 Ma unu onwe unu aghaghị ịgba ama, nʼihi na mụ na unu anọọla site na mmalite.
In Other Versions
John 15 in the ANGEFD
John 15 in the ANTPNG2D
John 15 in the AS21
John 15 in the BAGH
John 15 in the BBPNG
John 15 in the BBT1E
John 15 in the BDS
John 15 in the BEV
John 15 in the BHAD
John 15 in the BIB
John 15 in the BLPT
John 15 in the BNT
John 15 in the BNTABOOT
John 15 in the BNTLV
John 15 in the BOATCB
John 15 in the BOATCB2
John 15 in the BOBCV
John 15 in the BOCNT
John 15 in the BOECS
John 15 in the BOGWICC
John 15 in the BOHCB
John 15 in the BOHCV
John 15 in the BOHLNT
John 15 in the BOHNTLTAL
John 15 in the BOILNTAP
John 15 in the BOITCV
John 15 in the BOKCV
John 15 in the BOKCV2
John 15 in the BOKHWOG
John 15 in the BOKSSV
John 15 in the BOLCB
John 15 in the BOLCB2
John 15 in the BOMCV
John 15 in the BONAV
John 15 in the BONCB
John 15 in the BONLT
John 15 in the BONUT2
John 15 in the BOPLNT
John 15 in the BOSCB
John 15 in the BOSNC
John 15 in the BOTLNT
John 15 in the BOVCB
John 15 in the BOYCB
John 15 in the BPBB
John 15 in the BPH
John 15 in the BSB
John 15 in the CCB
John 15 in the CUV
John 15 in the CUVS
John 15 in the DBT
John 15 in the DGDNT
John 15 in the DHNT
John 15 in the DNT
John 15 in the ELBE
John 15 in the EMTV
John 15 in the ESV
John 15 in the FBV
John 15 in the FEB
John 15 in the GGMNT
John 15 in the GNT
John 15 in the HARY
John 15 in the HNT
John 15 in the IRVA
John 15 in the IRVB
John 15 in the IRVG
John 15 in the IRVH
John 15 in the IRVK
John 15 in the IRVM
John 15 in the IRVM2
John 15 in the IRVO
John 15 in the IRVP
John 15 in the IRVT
John 15 in the IRVT2
John 15 in the IRVU
John 15 in the ISVN
John 15 in the JSNT
John 15 in the KAPI
John 15 in the KBT1ETNIK
John 15 in the KBV
John 15 in the KJV
John 15 in the KNFD
John 15 in the LBA
John 15 in the LBLA
John 15 in the LNT
John 15 in the LSV
John 15 in the MAAL
John 15 in the MBV
John 15 in the MBV2
John 15 in the MHNT
John 15 in the MKNFD
John 15 in the MNG
John 15 in the MNT
John 15 in the MNT2
John 15 in the MRS1T
John 15 in the NAA
John 15 in the NASB
John 15 in the NBLA
John 15 in the NBS
John 15 in the NBVTP
John 15 in the NET2
John 15 in the NIV11
John 15 in the NNT
John 15 in the NNT2
John 15 in the NNT3
John 15 in the PDDPT
John 15 in the PFNT
John 15 in the RMNT
John 15 in the SBIAS
John 15 in the SBIBS
John 15 in the SBIBS2
John 15 in the SBICS
John 15 in the SBIDS
John 15 in the SBIGS
John 15 in the SBIHS
John 15 in the SBIIS
John 15 in the SBIIS2
John 15 in the SBIIS3
John 15 in the SBIKS
John 15 in the SBIKS2
John 15 in the SBIMS
John 15 in the SBIOS
John 15 in the SBIPS
John 15 in the SBISS
John 15 in the SBITS
John 15 in the SBITS2
John 15 in the SBITS3
John 15 in the SBITS4
John 15 in the SBIUS
John 15 in the SBIVS
John 15 in the SBT
John 15 in the SBT1E
John 15 in the SCHL
John 15 in the SNT
John 15 in the SUSU
John 15 in the SUSU2
John 15 in the SYNO
John 15 in the TBIAOTANT
John 15 in the TBT1E
John 15 in the TBT1E2
John 15 in the TFTIP
John 15 in the TFTU
John 15 in the TGNTATF3T
John 15 in the THAI
John 15 in the TNFD
John 15 in the TNT
John 15 in the TNTIK
John 15 in the TNTIL
John 15 in the TNTIN
John 15 in the TNTIP
John 15 in the TNTIZ
John 15 in the TOMA
John 15 in the TTENT
John 15 in the UBG
John 15 in the UGV
John 15 in the UGV2
John 15 in the UGV3
John 15 in the VBL
John 15 in the VDCC
John 15 in the YALU
John 15 in the YAPE
John 15 in the YBVTP
John 15 in the ZBP