John 4 (BOICB)

1 Ugbu a, Jisọs matara na ndị Farisii anụla na ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya na-emekwa baptizim karịa Jọn. 2 Ma ọ bụkwaghị Jisọs na onwe ya na-eme baptizim kama ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya mere ha baptizim. 3 Ọ hapụrụ Judịa laghachi azụ na Galili. 4 Ma ọ ga-esite nʼetiti Sameria gafee. 5 Ya mere, ọ batara nʼotu obodo nta dị na Sameria a na-akpọ Saika, nʼakụkụ ala ahụ Jekọb nyere Josef nwa ya nwoke. 6 Olulu mmiri Jekọb dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na ike gwụrụ Jisọs nʼije ya, ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ olulu mmiri ahụ. Ọ bụ ihe dị ka oge ehihie. 7 Otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, Jisọs sịrị ya, “Nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” 8 (Ndị na-eso ụzọ ya abaala nʼime obodo ịga zụta nri.) 9 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Olee otu gị bụ onye Juu si arịọ m bụ nwanyị Sameria mmiri ka ị ṅụọ?” (Nʼihi na ndị Juu na ndị Sameria anaghị emekọrịta ihe ọbụla.) 10 Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.” 11 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a. 12 Ọ bụ na ị ka nna nna anyị Jekọb ukwuu, onye gwuuru anyị olulu mmiri a? Ya onwe ya na ụmụ ya na igwe ehi na atụrụ ya ṅụkwara mmiri sitere na ya?” 13 Jisọs zara sị, “Onye ọbụla ṅụrụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ. 14 Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” 15 Mgbe ahụ nwanyị ahụ sịrị ya, “Onyenwe anyị nye m mmiri a, ka akpịrị ghara ịkpọ m nkụ ọzọ, ka m gharakwa ịdị na-abịa ebe a ịdọrọ mmiri.” 16 Ọ gwara ya sị, “Gaa kpọta di gị ma lọghachi.” 17 Nwanyị ahụ zaghachiri ya sị, “Enweghị m dị.”Jisọs sịrị ya, “I kwuru eziokwu mgbe ị sịrị na i nweghị di. 18 I nweela di ise, ma nwoke gị na ya bi ugbu a abụghị di gị. Ihe kwuru bụ nnọọ eziokwu.” 19 Nwanyị ahụ sịrị ya “Nna anyị ukwu, ahụrụ m na ị bụ onye amụma. 20 Nna nna anyị ha fere ofufe nʼugwu a, ma unu na-ekwu nʼebe ndị mmadụ ga-eferịrị ofufe bụ naanị na Jerusalem.” 21 Jisọs sịrị ya, “Nwanyị kwere okwu m, oge na-abịa mgbe ị na-agaghị akpọ isiala nye Nna, maọbụ nʼugwu a ma ọ bụkwanụ na Jerusalem. 22 Unu na-efe ihe unu na-amaghị ma anyị na-efe ihe anyị matara, nʼihi na nzọpụta sitere nʼaka ndị Juu. 23 Ma oge na-abịa, ugbu a ọ bịala, mgbe ndị na-efe Nna ahụ nʼeziokwu ga-efe ya nʼime mmụọ na nʼeziokwu. Nʼihi na ọ bụ ndị dị otu a ka Nna chọrọ ka ha na-efe ya. 24 Chineke bụ mmụọ ndị niile na-efe ya ga-eferịrị ya nʼime mmụọ na eziokwu.” 25 Nwanyị ahụ sịrị ya, “Amaara m na Mezaya” (onye a na-akpọ Kraịst) “na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwaziri anyị ihe niile.” 26 Jisọs sịrị ya, “Mụ, onye na-agwa gị okwu, abụ m ya.” 27 Nʼoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya lọghachitara. Ọ gbagwojukwara ha anya nke ukwuu ịhụ na ya na nwanyị na-ekwurịta okwu. Ma o nweghị onye nʼime ha jụrụ nwanyị ahụ sị, “Gịnị ka ị chọrọ?” ma ọ bụkwanụ, “Gịnị kpatara gị na ya ji na-ekwurịta okwu?” 28 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ hapụrụ ite mmiri ya laghachi nʼime obodo ga gwa ndị mmadụ, 29 “Bịanụ lee otu nwoke onye gwara m ihe niile m merela. Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst ahụ?” 30 Ha sitere nʼobodo ahụ gbapụtasịa soro ụzọ ahụ, ka ha gakwuru ya. 31 Ma otu ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ ya sị, “Onye ozizi rienụ nri.” 32 Ma ọ sịrị ha, “Enwere m nri m na-eri nke unu na-amaghị maka ya.” 33 Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Ọ ga-abụ na o nwere onye butere ya nri?” 34 Jisọs sịrị ha, “Nri m bụ ime uche onye ahụ zitere m nakwa ịrụcha ọrụ ya. 35 Unu na-asị, ‘ọ fọdụghị ọnwa anọ ka ịghọ mkpụrụ nʼubi ruo?’ Ma ana m agwa unu, megheenụ anya unu lee ubi ahụ, ha achaala maka ọghụghọ. 36 Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ. 37 Ya mere okwu ahụ nke na-asị, ‘Otu onye na-agha mkpụrụ, onye ọzọ na-aghọkwa ya bụ eziokwu.’ 38 E zigara m unu ka unu gaa ghọta ihe unu na-arụghị ọrụ maka ya. Ndị ọzọ rụrụ ọrụ a, ma unu ewe uru dị nʼọrụ ha.” 39 Ọtụtụ ndị obodo Sameria kweere na ya nʼihi ama ahụ nwanyị ahụ gbara, “Ọ gwara m ihe niile m mere.” 40 Ya mere mgbe ndị Sameria bịakwutere ya, ha rịọrọ ya ka ọ nọnyetụrụ ha, ọ nọnyekwaara ha ụbọchị abụọ. 41 Ọtụtụ ndị ọzọ kwerekwara na ya nʼihi okwu ya. 42 Ha gwara nwanyị ahụ, “Ihe anyị jiri kwere ugbu a abụghị ihe i kwuru, kama ọ bụ nʼihi na anyị onwe anyị anụla olu ya, matakwa na onye a bụ Onye nzọpụta nke ụwa nʼeziokwu.” 43 Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili. 44 (Jisọs nʼonwe ya ekwuola na onye amụma anaghị enwe ugwu nʼobodo ya.) 45 Mgbe ọ bịaruru Galili, ndị Galili nabatara ya ebe ha onwe ha gara mmemme na Jerusalem, ma hụkwa ọtụtụ ọrụ ebube ọ rụrụ nʼoge mmemme ahụ. 46 Ọzọkwa, ọ bịaruru Kena nke Galili bụ ebe ahụ o mere mmiri ka ọ ghọọ mmanya. E nwekwara otu onye na-arụ ọrụ nʼụlọeze nọ nʼebe ahụ, nke ahụ na-adịghị nwa ya nwoke ike na Kapanọm. 47 Mgbe ọ nụrụ na Jisọs esitela na Judịa bịarute na Galili, o jekwuuru ya rịọ ya ka ọ bịa gwọọ nwa ya, nʼihi na ọ nọ nʼọnụ ọnwụ. 48 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na unu ahụghị ọrụ ebube na ihe ịrịbama, unu agaghị ekwe ma ọlị.” 49 Onye a na-arụ ọrụ nʼụlọeze sịrị ya, “Nna m ukwu, biko bịa tupu nwa m a nwụọ.” 50 Jisọs sịrị ya, “Laa, nwa gị nwoke ga-adị ndụ.”Nwoke ahụ kweere nʼihe Jisọs kwuru laa. 51 Mgbe ọ ka nọ nʼụzọ, ndị ohu ya zutere ya kọọrọ ya na ahụ adịla nwa ya nwoke mma. 52 Mgbe ọ jụrụ ha oge nwa ya jiri gbakee, ha sịrị ya, “Oke ahụ ọkụ ahụ kwụsịrị ya ụnyaahụ nʼelekere mbụ nke ehihie.” 53 Nwoke ahụ ghọtara na ọ bụ kpomkwem nʼoge awa ahụ Jisọs gwara ya, “Nwa gị nwoke ga-adị ndụ.” Ya mere ya na ezinaụlọ ya niile kwenyere. 54 Nke a bụ ihe ịrịbama nke abụọ Jisọs rụrụ na Galili mgbe o siri Judịa bịa.

In Other Versions

John 4 in the ANGEFD

John 4 in the ANTPNG2D

John 4 in the AS21

John 4 in the BAGH

John 4 in the BBPNG

John 4 in the BBT1E

John 4 in the BDS

John 4 in the BEV

John 4 in the BHAD

John 4 in the BIB

John 4 in the BLPT

John 4 in the BNT

John 4 in the BNTABOOT

John 4 in the BNTLV

John 4 in the BOATCB

John 4 in the BOATCB2

John 4 in the BOBCV

John 4 in the BOCNT

John 4 in the BOECS

John 4 in the BOGWICC

John 4 in the BOHCB

John 4 in the BOHCV

John 4 in the BOHLNT

John 4 in the BOHNTLTAL

John 4 in the BOILNTAP

John 4 in the BOITCV

John 4 in the BOKCV

John 4 in the BOKCV2

John 4 in the BOKHWOG

John 4 in the BOKSSV

John 4 in the BOLCB

John 4 in the BOLCB2

John 4 in the BOMCV

John 4 in the BONAV

John 4 in the BONCB

John 4 in the BONLT

John 4 in the BONUT2

John 4 in the BOPLNT

John 4 in the BOSCB

John 4 in the BOSNC

John 4 in the BOTLNT

John 4 in the BOVCB

John 4 in the BOYCB

John 4 in the BPBB

John 4 in the BPH

John 4 in the BSB

John 4 in the CCB

John 4 in the CUV

John 4 in the CUVS

John 4 in the DBT

John 4 in the DGDNT

John 4 in the DHNT

John 4 in the DNT

John 4 in the ELBE

John 4 in the EMTV

John 4 in the ESV

John 4 in the FBV

John 4 in the FEB

John 4 in the GGMNT

John 4 in the GNT

John 4 in the HARY

John 4 in the HNT

John 4 in the IRVA

John 4 in the IRVB

John 4 in the IRVG

John 4 in the IRVH

John 4 in the IRVK

John 4 in the IRVM

John 4 in the IRVM2

John 4 in the IRVO

John 4 in the IRVP

John 4 in the IRVT

John 4 in the IRVT2

John 4 in the IRVU

John 4 in the ISVN

John 4 in the JSNT

John 4 in the KAPI

John 4 in the KBT1ETNIK

John 4 in the KBV

John 4 in the KJV

John 4 in the KNFD

John 4 in the LBA

John 4 in the LBLA

John 4 in the LNT

John 4 in the LSV

John 4 in the MAAL

John 4 in the MBV

John 4 in the MBV2

John 4 in the MHNT

John 4 in the MKNFD

John 4 in the MNG

John 4 in the MNT

John 4 in the MNT2

John 4 in the MRS1T

John 4 in the NAA

John 4 in the NASB

John 4 in the NBLA

John 4 in the NBS

John 4 in the NBVTP

John 4 in the NET2

John 4 in the NIV11

John 4 in the NNT

John 4 in the NNT2

John 4 in the NNT3

John 4 in the PDDPT

John 4 in the PFNT

John 4 in the RMNT

John 4 in the SBIAS

John 4 in the SBIBS

John 4 in the SBIBS2

John 4 in the SBICS

John 4 in the SBIDS

John 4 in the SBIGS

John 4 in the SBIHS

John 4 in the SBIIS

John 4 in the SBIIS2

John 4 in the SBIIS3

John 4 in the SBIKS

John 4 in the SBIKS2

John 4 in the SBIMS

John 4 in the SBIOS

John 4 in the SBIPS

John 4 in the SBISS

John 4 in the SBITS

John 4 in the SBITS2

John 4 in the SBITS3

John 4 in the SBITS4

John 4 in the SBIUS

John 4 in the SBIVS

John 4 in the SBT

John 4 in the SBT1E

John 4 in the SCHL

John 4 in the SNT

John 4 in the SUSU

John 4 in the SUSU2

John 4 in the SYNO

John 4 in the TBIAOTANT

John 4 in the TBT1E

John 4 in the TBT1E2

John 4 in the TFTIP

John 4 in the TFTU

John 4 in the TGNTATF3T

John 4 in the THAI

John 4 in the TNFD

John 4 in the TNT

John 4 in the TNTIK

John 4 in the TNTIL

John 4 in the TNTIN

John 4 in the TNTIP

John 4 in the TNTIZ

John 4 in the TOMA

John 4 in the TTENT

John 4 in the UBG

John 4 in the UGV

John 4 in the UGV2

John 4 in the UGV3

John 4 in the VBL

John 4 in the VDCC

John 4 in the YALU

John 4 in the YAPE

John 4 in the YBVTP

John 4 in the ZBP