John 8 (BOICB)

1 Ma Jisọs rigooro nʼUgwu Oliv. 2 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ọ bịara ọzọ nʼụlọnsọ ukwuu ebe ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya. Ọ nọdụrụ ala malite ikuziri ha ihe. 3 Ndị ozizi iwu na ndị Farisii dọkpụtara otu nwanyị ha jidere nʼịkwa iko. Ha mere ka o guzo nʼihu igwe mmadụ ahụ niile. 4 Ha sịrị ya, “Onye ozizi, anyị jidere nwanyị a ka ọ na-akwa iko. 5 Nʼiwu, Mosis nyere anyị ikike ka e jiri okwute tugbuo onye mere ihe dị otu a. Gịnị ka i nwere ikwu banyere nke a?” 6 Ha kwuru nke a iji nwalee ya, iji nweta ihe ha ga-eji ebo ya ebubo. Ma Jisọs hulatara ala were mkpịsịaka ya dee ihe nʼala. 7 Mgbe ha nọgidere na-ajụ ya ajụjụ, o biliri sị ha, “Onye ọbụla nʼime unu na-emebeghị mmehie ọbụla, ya buru ụzọ tụọ ya nkume.” 8 Ọzọ, o hulatakwara ala malite ide ihe ọ na-ede nʼala. 9 Mgbe ha nụrụ nke a, ha niile nʼotu nʼotu, malite nʼonye okenye ha, sitere nʼebe ahụ pụọ. Nʼikpeazụ, ọ fọdụrụ naanị Jisọs na nwanyị ahụ, ebe o guzoro nʼihu ya. 10 Jisọs guzoro ọtọ jụọ ya sị, “Nwanyị, oleekwanụ ha? Ọ dịghị onye mara gị ikpe?” 11 Ọ sịrị, “O nweghị onye ọbụla Onyenwe anyị.” Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m amakwaghị gị ikpe: Gawa, kama emehiekwala ọzọ.” 12 Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” 13 Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.” 14 Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga. 15 Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe. 16 Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m. 17 E dere nʼiwu unu sị, ‘ama mmadụ abụọ gbara bụ eziokwu.’ 18 Ana m agba ama banyere onwe m. Nna m, onye zitere m, na-agbakwa ama banyere m.” 19 Mgbe ahụ ha jụrụ ya, “Olee ebe Nna gị nọ?”Jisọs zara, “Unu amaghị m, unu amakwaghị Nna m. Ọ bụrụ na unu matara m unu ga-amatakwa onye Nna m bụ.” 20 Okwu ndị a niile ka o kwuru nʼụlọnsọ ukwu ha, mgbe ọ na-akụzi ihe na mpaghara ụlọ ahụ ebe a na-adọba onyinye. Ma ọ dịghị onye ọbụla jidere ya nʼihi na oge ya erubeghị. 21 Ọzọ ọ gwara ha, “Aga m ahapụ unu, unu ga-achọ m, ma unu ga-anwụ nʼime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nʼebe m na-aga.” 22 Nke a mere ka ndị Juu na-asị, “Ọ ga-egbu onwe ya? Ọ bụ ya mere o ji sị, ‘Ebe m na-aga unu apụghị ị bịa’?” 23 Ma ọ sịrị ha, “Unu si nʼala ma esi m nʼelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa a. 24 A sịrị m unu na unu ga-anwụ nʼime mmehie unu, naanị na unu kwenyere na mụ onwe m, bụ onye ahụ.” 25 Ha jụrụ ya, “Onye ka ị bụ?”Jisọs zara sị ha, “Abụ m onye ahụ m gwara unu na m bụ na mbụ. 26 E nwere m ọtụtụ ihe m ga-ekwu nʼikpe unu ikpe. Ma matanụ na onye ahụ zitere m bụ onye eziokwu. Nʼihi nke a, ihe niile m nụrụ site nʼọnụ ya ka m gwara ụwa.” 27 Ọ bụ ihe banyere Nna ya ka ọ na-agwa ha, ma ha aghọtaghị ya. 28 Ya mere Jisọs sịrị, “Mgbe unu weliri Nwa nke Mmadụ elu, mgbe ahụ ka unu ga-ama na mụ onwe m bụ ya. Unu ga-amatakwa na ọ dịghị ihe m na-eme nʼonwe m, kama, dị ka Nna m ziri m ka m na-ekwu ihe ndị a. 29 Onye ahụ nke zitere m na-anọnyekwara m. Ọ hapụghịkwa m mgbe ọbụla, nʼihi na ọ bụ ihe na-amasị ya ka m na-eme mgbe niile.” 30 Mgbe ọ na-ekwu ihe ndị a, ọtụtụ kwenyere na ya. 31 Jisọs gwara ndị Juu ndị kwere na ya, “Ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwu m nʼezie unu ga-abụ ndị na-eso ụzọ m. 32 Unu ga-amatakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” 33 Ha zara ya, “Anyị bụ ụmụ Ebraham, o nwebeghị oge anyị ji bụrụ ohu onye ọbụla. Olee otu i si na-asị na a ga-eme ka anyị nwere onwe anyị?” 34 Jisọs zara ha, “Nʼezie, nʼezie asị m unu, onye ọbụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie. 35 Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. 36 Ya mere, ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu nʼezie, unu ga-abụ ndị nwere onwe unu. 37 Ama m na unu bụ ụmụ ụmụ Ebraham, ma unu na-achọ igbu m nʼihi na okwu m enweghị ọnọdụ nʼime unu. 38 Ana m ekwu ihe m hụrụ nʼebe Nna m nọ, ma unu na-eme ihe unu nụrụ site nʼaka nna unu.” 39 Ha zara ya, “Ebraham bụ nna anyị.”Jisọs sịrị ha, “Ọ bụrụ na unu bụ ụmụ Ebraham, unu gara na-arụ ọrụ Ebraham rụrụ. 40 Ma unu na-achọ igbu m, bụ onye gwara unu eziokwu ahụ m nụrụ nʼebe Chineke nọ. Ebraham emeghị otu a. 41 Unu na-arụ ọrụ nna unu rụrụ.”Ha sịrị ya, “Anyị abụghị ụmụ a mụrụ site nʼịkwa iko; naanị Chineke ya onwe ya bụ otu Nna anyị nwere.” 42 Jisọs gwara ha, “Ọ bụrụ nʼezie na Chineke bụ Nna unu, unu ga-ahụ m nʼanya, nʼihi na ọ bụ Chineke zitere m. Abịaghị m site nʼike aka m. 43 Gịnị mere unu adịghị aghọta ihe m na-ekwu? Ọ bụ na unu enweghị ike ịnabata okwu m. 44 Unu bụ ụmụ nke nna unu ekwensu. Uche unu bụ imezu ihe nke nna unu na-achọ. Ọ bụ ogbu ọchụ site na mbụ. Ọ dịghị ejigide eziokwu nʼihi na eziokwu adịghị nʼime ya. Mgbe ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu dị ka ọdịdị ya sịrị dị, nʼihi na ọ bụ onye ụgha bụrụkwa nna nke ụgha. 45 Ma nʼihi na m na-ekwu eziokwu, ọ bụ ya mere unu ekwenyeghị na m. 46 O nwere onye nʼime unu pụrụ ịtụ m mmehie m nʼihu? Ọ bụrụ na m na-ekwu eziokwu, gịnị mere unu ekwenyeghị na m? 47 Onye ọbụla sitere na Chineke na-anụ ihe Chineke na-ekwu. Ihe kpatara unu adịghị anụ bụ maka unu abụghị ndị nke Chineke.” 48 Ndị Juu zara sị, “Anyị e kwughị eziokwu mgbe anyị sịrị na ị bụ onye Sameria, na mmụọ ọjọọ bikwa nʼime gị?” 49 Jisọs zaghachiri, “Mmụọ ọjọọ ọbụla adịghị nʼime m, kama ana m asọpụrụ Nna m, ma unu adịghị asọpụrụ m. 50 Anaghị m achọ otuto nke onwe m, kama ọ dị onye nke na-achọ ya. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpe. 51 Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” 52 Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. 53 Ị dị ukwuu karịa nna anyị Ebraham? Ọ nwụrụ, ma ndị amụma nwụkwara. Onye ka ị na-eche na ị bụ?” 54 Jisọs zara, “Ọ bụrụ na m etoo onwe m, otuto m bụ ihe efu, Nna m, onye unu na-asị na ọ bụ Chineke unu, bụ onye na-eto m. 55 Amaara m onye ọ bụ nʼagbanyeghị na unu amaghị ya. Aga m abụ onye ụgha ma ọ bụrụ na m ga-asị na-amaghị m onye ọ bụ. Amaara m ya na-edebekwa okwu ya. 56 Nna unu Ebraham ṅụrịrị ọṅụ mgbe o chetara na ọ ga-ahụ ụbọchị m; ọ hụrụ ya ma ṅụrịakwa ọnụ.” 57 Ndị Juu sịrị ya, “Ị gbabeghị iri afọ ise ma ị hụla Ebraham?” 58 Jisọs sịrị ha, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, tupu amụọ Ebraham, mụ onwe m nọ ya.” 59 Ya mere, ha tụtụlitere nkume ịtụ ya, ma Jisọs zoro onwe ya, sitekwa nʼụlọnsọ ukwuu ahụ pụọ.

In Other Versions

John 8 in the ANGEFD

John 8 in the ANTPNG2D

John 8 in the AS21

John 8 in the BAGH

John 8 in the BBPNG

John 8 in the BBT1E

John 8 in the BDS

John 8 in the BEV

John 8 in the BHAD

John 8 in the BIB

John 8 in the BLPT

John 8 in the BNT

John 8 in the BNTABOOT

John 8 in the BNTLV

John 8 in the BOATCB

John 8 in the BOATCB2

John 8 in the BOBCV

John 8 in the BOCNT

John 8 in the BOECS

John 8 in the BOGWICC

John 8 in the BOHCB

John 8 in the BOHCV

John 8 in the BOHLNT

John 8 in the BOHNTLTAL

John 8 in the BOILNTAP

John 8 in the BOITCV

John 8 in the BOKCV

John 8 in the BOKCV2

John 8 in the BOKHWOG

John 8 in the BOKSSV

John 8 in the BOLCB

John 8 in the BOLCB2

John 8 in the BOMCV

John 8 in the BONAV

John 8 in the BONCB

John 8 in the BONLT

John 8 in the BONUT2

John 8 in the BOPLNT

John 8 in the BOSCB

John 8 in the BOSNC

John 8 in the BOTLNT

John 8 in the BOVCB

John 8 in the BOYCB

John 8 in the BPBB

John 8 in the BPH

John 8 in the BSB

John 8 in the CCB

John 8 in the CUV

John 8 in the CUVS

John 8 in the DBT

John 8 in the DGDNT

John 8 in the DHNT

John 8 in the DNT

John 8 in the ELBE

John 8 in the EMTV

John 8 in the ESV

John 8 in the FBV

John 8 in the FEB

John 8 in the GGMNT

John 8 in the GNT

John 8 in the HARY

John 8 in the HNT

John 8 in the IRVA

John 8 in the IRVB

John 8 in the IRVG

John 8 in the IRVH

John 8 in the IRVK

John 8 in the IRVM

John 8 in the IRVM2

John 8 in the IRVO

John 8 in the IRVP

John 8 in the IRVT

John 8 in the IRVT2

John 8 in the IRVU

John 8 in the ISVN

John 8 in the JSNT

John 8 in the KAPI

John 8 in the KBT1ETNIK

John 8 in the KBV

John 8 in the KJV

John 8 in the KNFD

John 8 in the LBA

John 8 in the LBLA

John 8 in the LNT

John 8 in the LSV

John 8 in the MAAL

John 8 in the MBV

John 8 in the MBV2

John 8 in the MHNT

John 8 in the MKNFD

John 8 in the MNG

John 8 in the MNT

John 8 in the MNT2

John 8 in the MRS1T

John 8 in the NAA

John 8 in the NASB

John 8 in the NBLA

John 8 in the NBS

John 8 in the NBVTP

John 8 in the NET2

John 8 in the NIV11

John 8 in the NNT

John 8 in the NNT2

John 8 in the NNT3

John 8 in the PDDPT

John 8 in the PFNT

John 8 in the RMNT

John 8 in the SBIAS

John 8 in the SBIBS

John 8 in the SBIBS2

John 8 in the SBICS

John 8 in the SBIDS

John 8 in the SBIGS

John 8 in the SBIHS

John 8 in the SBIIS

John 8 in the SBIIS2

John 8 in the SBIIS3

John 8 in the SBIKS

John 8 in the SBIKS2

John 8 in the SBIMS

John 8 in the SBIOS

John 8 in the SBIPS

John 8 in the SBISS

John 8 in the SBITS

John 8 in the SBITS2

John 8 in the SBITS3

John 8 in the SBITS4

John 8 in the SBIUS

John 8 in the SBIVS

John 8 in the SBT

John 8 in the SBT1E

John 8 in the SCHL

John 8 in the SNT

John 8 in the SUSU

John 8 in the SUSU2

John 8 in the SYNO

John 8 in the TBIAOTANT

John 8 in the TBT1E

John 8 in the TBT1E2

John 8 in the TFTIP

John 8 in the TFTU

John 8 in the TGNTATF3T

John 8 in the THAI

John 8 in the TNFD

John 8 in the TNT

John 8 in the TNTIK

John 8 in the TNTIL

John 8 in the TNTIN

John 8 in the TNTIP

John 8 in the TNTIZ

John 8 in the TOMA

John 8 in the TTENT

John 8 in the UBG

John 8 in the UGV

John 8 in the UGV2

John 8 in the UGV3

John 8 in the VBL

John 8 in the VDCC

John 8 in the YALU

John 8 in the YAPE

John 8 in the YBVTP

John 8 in the ZBP